Aka Nri Na Aka Ekpe Usoro Nzikọrịta Ozi Ọgbara Ọhụrụ (1)

May 16, 2021 - 17:02
 0
Aka Nri Na Aka Ekpe Usoro Nzikọrịta Ozi Ọgbara Ọhụrụ (1)

Usoro nzikọrịta ozi ọgbara ọhụrụ ‘Social Media’ bụzi egwu e ji n’ụwa nille taa. O mere ka mgbasaozi na-aga ọsọ ọsọ n’egbughị oge ọbụla karịa ka ọ dị na mbụ, oge ụmụ ụwa ji eze ekpe ekwere n’ihe gbasara mgbasaozi.

N’oge gboo, mgbe ezi dị n’ukwu ụkwa, ọ bụ leta ka e ji agbasa ozi. Ha kwukwara na ha nọ na-akụ waya, tinyere foonu nke na-adịghị ebe niile. Leta bụ nke gazuru ebe niile mana ọ na-ete aka tupu o ruo onye e deere ya aka.

N’oge ahụ, mmadụ dee leta, ọ na-anọ ọtụtụ izuụka maọbụ ọnwa olemole tupu o ruo onye nwe ya aka. Onye ahụ nata leta, ọ gụchaa, o dechighara onye ziteere ya leta azụ iji nye ya ụsa, nke ahụ ga-ewekwa ogologo oge. Ya bụ ọnọdụ jọgburu onwe ya, mana otu o sila dị o gbooro ndị mmadụ mkpa ole o nwere ike oge ahụ.

Mgbe ịkpọ na ekwentị pụtara, mmadụ na-esi obodo ya gaa obodo ọzọ tere aka, n’ụlọọrụ ọ dị n’aka, maka ịkpọ onye nke ya na foonu. Mgbe ụfọdụ onye ahụ na-anọcha ọtụtụ awa n’enwetaghị onye ahụ dịka ọnọdụ siri dị.

Ọ bụrụ na mmadụ nọrọ n’ọrịa maọbụ nwụọ anwụọ, a na-ezipu otu onye ka ọ gbaa ụgbọala gaa kpọọ nwa ya maọbụ onye nke ya bi na mba ọzọ tere aka, ka o mee ka onye ahụ mata na mmiri ańaala garị. Oge ụfọdụ, tupu onye gara ozi ahụ na onye ọ gara ịkpọ abata ọ bụrụ na ihe emebechaala.

Ọnọdụ ahụ bụnnọọ ọnọdụ ihe a hụrụ e were n’ihi na ọ bụ nkụ dị na mba na-eghere mba nri; mmadụ anaghị ama ihe ọ maghị.

Ya mere, ụwa si otu ahụ na-aga wee ruo n’oge ugbu a. Taa ihe dị wọrọ ogori a gbaala n’ahịa. Onye ọbụla kpazi ekwenti n’aka, ụzọ ọbụla ịchọrọ isi gbasa ozi, I soro maka na ha juru eju bara abara. Ozi ọbụla ị na-ezi mmadụ, gị na onye ahụ a na-akpa ya ozugbo ozugbo n’akpọghị onye nke atọ ka o ziruoro gị ozi. Ọnọdụ a bụ nnọọ ihe magburu onwe ya maka a na-eji ya egbo mkpa ọsọ ọsọ n’egbughị oge ọbụla.

N’ime ihe niile, Igbo kwuru okwu sị na ihe nwere uru nwekwara ọghọ m. Ya mere, ọtụtụ ndị mmadụ na-akọwa na ọghọ m so nzikọrịta ozi ọgbara ọhụrụ karịrị uru so ya ebe ụfọdụ kwuru na uru so ya ka ọghọ m.

Ada Okoro: Ụzọ nzikọrịta ozi ọgbara ọhụrụ bụ ịgba, ọ magburu onwe ya na mma. Mgbe ọbụla mmadụ chọrọ ịgbasa ozi ọ na-eme ya ozugbo. Ọ na-aga ọsọ ọsọ ma na-egbokwa mkpa n’ebe ọ dị ukwuu, Imaatụ: ọ bụrụ na mmadụ nọ n’ọrịa nke na amakwaghị ihe a ga-eme, a ga-eji ekwenti  kpọọ ndị ọ dị n’aka bụ ndị ahụike, a tụọ aro ozigbo nye onye ahụ ọgwụgwọ n’egbughị oge ọbụla.

Mana ọ bụrụ oge mbụ, I nwere ike buru mmadụ (onye ọrịa) gaa ụlọọgwụ a gwa gị na dọkịnta pụrụ apụ. Oge ụfọdụ a na-anọ ebe a na-eche dọkịnta onye ahụ anwụọ.

Ma taa, tupu e buru onye ahụ gaa ụlọọgwụ, a na-akpọ dọkịnta ọ nọrọ anọrọ nke bụ na e buru onye ahụ bata e bido ozigbo nyebe ya ọgwụgwọ. Ụzọ dị otu a na-eme ka a na-azọta ndụ. Ya mere, ana m ekwu na nzikọrịta ozi ọgbara ọhụrụ dị mma.

Chike Ike: Ihe ọbụla nwere uru nwere ọghọm. Ụzọ e si ezikọrịta ozi ugbua bara nnukwu uru ma na-egbokwa mkpa, mana o mebiela ụmụaka ugbu a. Ọtụtụ ụmụaka alaala n’iyi n’ihi ụzọ nzikọrịta ozi ọgbara ọhụrụ.

Ha na-esi na ya mụta arụrụala dị iche iche nke gụnyere izu ohi, ịkwa iko, ịsị asị tinyere aghụghọ dị iche iche. Usoro nzikọrịta ozi ọgbara ọhụrụ etinyela ụwa a na gbagharịa. Oke ịghafu ọbara, igbu ọchị were dịrị gaba bụzị ụkwa a chị n’aka. Ọtụtụ ndị mmadụ ka a larara ụwa ha n’iyi site iji usoro ahụ wekọrọ ego niile ha hapụrụ n’ọbaego n’otu ntabi anya.

Ọtụtụ ndị ntorobịa na ndị okenye ewerela ọgụgụ isi Chineke nyere ha ka ha were rụpụta ọrụ ọma n’ụwa na-akpa arụ n’usoro nzikọrịta ozi ọgbara ọhụrụ. Ha esila na ya mụta oke ọchịchọ, so ihe na-agụzi ha bụ ihe ukwu dịka ịgba ụgbọala galara oke ọnụ ahịa, ibi n’ụlọelu okpukpu iri. Ọtụtụ n’ime ha enwezighị ike ịrụ ọrụ ọbụla na ndụ.

Ha gụchara akwụkwọ ma onweghị nke chọrọ ịrụ ọrụoyibo. Ị juo ya ọ gwa gị na ya ahụghị ọrụ. Ọ bụ eziokwu na ọrụ adịghị mana onye chọrọ ịgwa onwe ya eziokwu na-ebidogodu na-arụ nke o nwetere tupu o nwetezie nke dị elu. Mana ha agaghị eme nke ahụ.

Otu nwaikorobịa ji ọnụ o ji eri ji eri ede kwuo na kama ya ga-arụ ọrụ a na-akwụ ya puku naịra iri ise (N50,000) n’ọnwa kama ya anọrọ nkịtị. Mgbe ahụ ọ nọ nkịtị, gịnị ka ọ ga na-eme? Arụrụala! Nwanne m, ụwa emebiela, usoro nzikọrịta ozi ọgbara ọhụrụ bara uru ma ụmụ ụwa emeela ka ọghọ m dị na ya karịa.

Kachi Okeke: Abụ m nwa akwụkwọ na mahadum. Usoro nzikọrịta ozi ọgbara ọhụrụ amaka, ọ bụ ya ka anyị ji eme nnwale na ule dị iche iche n’ụlọakwụkwọ. Ọ bụkwa na ya ka anyị si enweta ma na amụta ọtụtụ ihe a na-akụziri anyị. Nke bụ eziokwu bụ na ụfọdụ ndị mmadụ jizi ya akpa arụ dị iche iche, ọ kachasị ụmụikorobịa. Ụbọchị gara aga ka anyị nụrụ otu e si gbuo otu nwaanyị na-achọ ọrụ na steeti Akwa Ibom.

 Ọ bụ site na usoro nzikọrịta ozi ọgbara ọhụrụ ka o si zute nwaikorobịa ahụ kwere ya nkwa inye ya ọrụ; onye nke tụghariziri kwaa ya ike n’ike, gbuo ma likwaa ya. Nke a bụ nnọọ ihe anya mmiri. Ọ jọgburu onwe ya mana anaghị eji mgbagbu ghara ọgụ. E mee elu mee ala, usoro nzikọrịta ozi ọgbaa ọhụrụ bara nnukwu uru n’ụwa taa, nke a pụghị ịgụta ọnụ.

Ezinne Umeh: Ewo! ọ fọrọ obere ka nwanne m nwaanyị tufuo ndụ ya n’ihi enyi nwoke o metere na ‘Facebook’. Ka ya na nwoke ahụ matara n’ahụghị onwe ha anya, ha malitere kpaba n’ike n’ike wee ruo na nwoke ahụ ezitere ya ozi ka ọ bịa hụ ya na Lagos. Aka niile m dọrọ nwanne m na ntị emeghị ka ọ kwụsị ịga njem ahụ. Ya mere, mgbe ọ laghachịri n’ụlọakwụkwọ, o siri ebe ahụ gaa Lagos n’emeghị ka onye ọbụla mata.

GUO:  Uru na ọghọm dị n'usoro nzikọrịta ozi ọgbara ọhụrụ (II)

  N’ikpeazụ, o si ebe ahụ kpọọ m n’ekwenti na-ebe akwa. O kwuru na nwoke ahụ kpọrọ ya gaa n’otu ụlọ oriri na ọńụńụ. Ka ha nọchara abalị abụọ ebe ahụ na ya malitere nyobe ya enyobe.

  Nwoke gwara ya na ọ ga-eduga ya ozi na mpaghara Lagos ọzọ echi ya.

Ma ka ọ gara n’ụlọmposi na ya gụrụ ozi e ziteere ya n’ekwenti ebe a jụrụ ya ma ọ ga-akpọtazikwa nwaanyị ahụ echi dịka o kwere ha na nkwa. Na ozugbo ahụ ka ọ ji nwayọọ mịpụ n’ụlọ oriri na ọńụńụ ahụ n’ebuteghị akpa ya, n’ejighị kọbọ maọbụ afụ ọbụla. Otu a ka ọ kaara isi wee bụrụ onye nwụrụ anwụ.

Ken Igwedi: Usoro nzikọrịta ozi ọgbara ọhụrụ bụ ihe ụwa chọrọ n’oge ugbu a maka na mmadụ agaghị atọ n’isi. Ọ bụzị ya ka e ji eme ihe niile, agụmakwụkwọ, azụmahịa, tinyere ngosipụta aka ọrụ dị iche iche. Ọ bụrụ na ọ bụghị ya, ụwa agaghị anọ n’ogogo ọ nọ taa. E ji ya emepụta ma na-agbasa akọrọngwa dị iche iche.

Oge mbụ, ị chọọ ịzụta ahịa n’obodo oyibo ị gbaa ụgbọelu, kwụọ ụgwọ dị na ya, sọọsọ ka ị hụgodi ahịa ahụ tupu ikwube okwu ịzụta ya. Leenụ taa, ọ bụ site n’usoro nzikọrịta ozi ọgbara ọhụrụ ka a ga-esi gosi gị ihe dị iche iche, isitekwa na ya họrọ nke ị chọrọ, ma kwụọ ụgwọ, e zitere gị ha.

Chinwendụ Ụzọatụ dere edemede a

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484