Komishọna Mezue Azọpụtala Ndị Ara Abụọ Ọzọ n'Onitsha

Mar 6, 2021 - 15:57
 0
Komishọna Mezue Azọpụtala Ndị Ara Abụọ Ọzọ n'Onitsha
Komishọna Mezue Azọpụtala Ndị Ara Abụọ Ọzọ n'Onitsha
Komishọna Mezue Azọpụtala Ndị Ara Abụọ Ọzọ n'Onitsha

Izunna Okafor dere akụkọ a


Igbo sị na omere onye nà-èmere chi ya.

N'ịgbaso nke a, Kọmishọna na-ahụ maka ọdịmma ọhaneze na ihe metụtara ụmụaka na ụmụnwaanyị n'ime steeti Anambra, bụ Oriakụ Ndidi Mezue azọpụtakwuola mmadụ abụọ ọzọ nwere nsogbu n'ụbụrụ, ma kpọpụta ha n'okporo ụzọ ebe ha nọ.

Ndị a bụ ndị a zọpụtara na mpaghara 'Onisi Onira Garden', dị na gburugburu 'Boromeo Roundabout' dị n'Onitsha, bụ ebe ha bi n'oge mbụ wee na-emetọ ebe ahụ n'ụdị dị iche iche.

E buruzịrị ha abụọ wee gaa n'isi ụlọọrụ ahụ dị n'Awka, ebe Kọmishọna ahụ nọzịrị wee gbaa ha ajụjụọnụ, nke otu onye n'ime ha nọrọ na ya wee kwuo na aha ya bụ Obinna, onye Mbanọ nke steeti Imo; ma onye nke ọzọ apụghị ịkọwatanwu ihe ọbụla nwere isi banyere onwe ya.

Ya bụ Kọmishọna kpụchazịkwara ha isi, dozie ha ka dị ọcha, tupu e buruzie ha wee gaa n'ogige ebe a na-elekọta ndị ara na ndị ọzọ nwere nsogbu ụbụrụ dị na Nteje, n'okpuruọchịchị ime obodo Oyi. 
Kọmishọna Mezue kọwara na ọ bụ ebe ahụ ka a ga-anọzị wee lekọta ma gwọọ ha, kụziere ha ọrụ aka, ma nye ha nkwàdo tupu a hapụzie ha  ka ha laa, je bàára onwe ha úrù n'obodo ha dị iche iche.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484