A Dụọla Ndị Ntorobịa Ka Ha Tinye Aka n'Ịkwalite Ezi Nchekwa

Aug 21, 2019 - 15:01
Jan 21, 2021 - 14:02
 0
A Dụọla Ndị Ntorobịa Ka Ha Tinye Aka n'Ịkwalite Ezi Nchekwa

By Izunna Okafor, Awka, Nigeria

N'ịgbaso okwu Igbo ahụ sị na otu onye anaghị achụ ngwere mgbahige aja, a dụọla ma kpọkuo ndị ntorobịa na steeti Anambra ka ha sonye n'amụma ịkwalite ezi ọnọdụ nchekwa tọrọ àtọ na steeti ahụ.

Onyeisi ndị uwe ojii na steeti ahụ, bụ Maazị John Abang bụ ya kpọrọ òkù a n'okwu ya na mmemme hibere isi n'ịkwalite ọnọdụ nchekwa, bụ nke a chịkọbàrà site n'aka ndị òtù jikọkara ndị ntorobịa n'ala anyị bụ 'National Youth Council of Nigeria' ngalaba ya nke Anambra, ma bụrkwa nke weere ọnọdụ n'Awka bụ isi obodo steeti ahụ.

N'okwu ya n'isiokwu nke na-asị "Ọrụ Dịịrị Ndị Ntorobịa n'Ịkwalite Ezi Ọnọdụ Nchekwa Tọrọ Atọ Na Steeti Anambra', maazị Abang, nke ọ bụ osote ya, bụ maazị Adewuyi Babalọla nọchitere anya ya kọwara nchekwa dịka mmadụ ijidesi na ịgbachìbidosi ihe ya ike, pụọ na mwakpò, ma kọwaa n'eziokwu na ndị ntorobịa nwere nnọọ nnukwu ọrụ pụrụ iche na nchekwa obodo.

Ọ kpọpụtasịrị ọtụtụ ihe dị iche iche e meptagoro na ngalaba nchekwa steeti ahụ, bụ nke ọ kọwara na ọ bụ site n'ezi ọchịchị nke gọvanọ Obianọ na ezi agbambọ nke ndị ọrụ nchekwa steeti ahụ, ma kwuo n'ezie na ihe ndị ahụ agaraghị ekwe omume, ma e wezuga enyemaka na njikọ ọnụ ha na ọhanaeze. Ọ kpọkuzịrị ha bụ ndị ntorobịa ka ha sonyesie ike n'amụma nchekwa steeti ahụ site n'ịdị na-akpachapụ anya ịma ihe na-eme n'obodo ha dị iche iche, ma na-ezunyekwa ndị ọrụ nchekwa ohi ozi ọbụla ga-enyere ha aka ịnwụchikọ ndị otu nzuzo, ndị ohi, ndị ntọ, na ndị ọzọ na-eme ihe na-ebute ala adịghị mma, n'ihi na ọtụtụ n'ime ha kachara mara ndị na-etinye aka n'ihe dị otu ahụ.

Na ntụnye nke ya, onyeisi òtù ahụ na-ebu agha megide ịkpọ na ịtụ mgbere ọgwụ ike n'ala anyị, bụ ụlọ ọrụ 'National Drug Law Enforcement Agency (NDLEA)' ngalaba ya nke Anambra, bụ Maazị Sule Momodu, nke onye nọchitere anya ya bụ Maazị Chris Ajabọ mepere anya ndị ntorobịa ahụ n'ọtụtụ ihe égwù na ihe ize ndụ dị iche iche dị na mmadụ ịkpọ ma ọ bụ ịtụ mgbere ọgwụ ike, bụ nke ọ sị na o dubaala ọtụtụ mmadụ n'ịkwa àrịrị ha agaghị echezọ echezọ, na ọnọdụ ọjọọ ha agaghị esinwu na ya pụta ụwa tụ ụwa ha, ebe ọtụtụ tụfugokwàrà ndụ ha site n'ọgwụ ike; ma kpọkuzie ha ka sepu aka n'ime ihe dị otu ahụ, ma bụrụ ndị ga-eweta mgbanwe na mmepe, karịa iweta nsogbo n'obodo ha dị iche iche.

N'akụkụ nke ya, onye chịkọbara ya bụ ihe mmemme, ma bụrụkwa onyeisi òtù NYCN na steeti ahụ, bụ maaz Samuel Egwuatụ kwùrù na ebumnobi mmemme ahụ bụ iji nwògharịa echiche ndị ntorobịa n'ụzọ dị mma, iji wee si n'ụzọ dị otu ahụ wepu uche ha n'itinye aka n'ihe ndị ahụ na-eweta ala adịghị mma n'obodo, mekwa ka ha sonye n'amụma ịkwalite ezi nchekwa na steeti ahụ, ka o wee gaa n'ihu ịbụ eji ama atụ n'ala anyị, dịka ọ dị ugbu n'oge ugbu a.

Ka ọ na-ekwu na akụkọ ahụ ndị mmadụ na-akọ na e nwere nkewa n'isi ọchịchị otu ahụ na ya bụ steeti bụ asịrị enweghị isi na ọdụ; Maazị Egwuatụ, onye kwuru na ọ bụ naanị ya bụ onye ndu òtù ahụ n'Anambra, gara n'ihu kpọkuo ndị ntorobịa na-tinye aka n'ihe ọjọọ ka ha sepu ka na nke ahụ ma ga mụọrọ onwe ha ọrụ aka, ma ọ bụ sonye n'usoro atụmatụ ọrụ ugbo dị iche iche na-aga n'ihu na steeti ahụ ugbu a, iji wee baara onwe ha, obodo ha na steeti ha urù.

Mmemme ahụ dọtara ndị òtù ọrụ nchekwa dị iche-iche dị na steeti ahụ, ndị ntorobịa sitere n'okpuru ọchịchị iri abụọ na otu e nwere na steeti ahụ, ndị eze ọdịnala, tinyere ndị ọrụ gọọmenti; ma bụrụkwa nke a nọrọ na ya wee nye onyinye nkwanye ugwu nyegara ndị dị iche iche mepụtagoro ihe dara ụda n'ịkwalite ndị ntorobịa na steeti ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.