Ndị Uweojii Ejidela Buhari Maka Izu Ohi Ọkà n'Ekiti

Jun 19, 2021 - 21:08
 0
Ndị Uweojii Ejidela Buhari Maka Izu Ohi Ọkà n'Ekiti

Izunna Okafor dere akụkọ a


Ndị uweojii na mpaghara Itanla, dị n'Ado-Ekiti steeti nke steeti Ekiti nọrọ na nsonso a wee nwụchie otu nwoke gbara ahọ iri asatọ na isii maka izu ohi ọkà.

Nwoke ahụ aha ya bụ Maazị Buhari Musa bụkwà onye a kpụgharịrị n'ụlọikpe Majie dị n'Ado-Ekiti maka ya bụ ohi ọkà o zuru.

Dịka onye uweojii kpere nwoke ahụ n'aka ụlọikpe, bụ Johnson Okunade siri kọwaa n'ụlọikpe Majie ahụ, Maazị Buhari zuru ohi ọka ahụ n'abalị iri na atọ nke ọnwa Juunu a n'elekere asaa nke ụtụtụ na mpaghara Omisanjana nke Ado-Ekiti.

Okunade, onye ji ọkwa Inspektọ n'ọrụ uweojii gara n'ihu mee ka a mara na ya bụ nwoke gbara ahọ iri asatọ na isii zuru ọka gburu ego ruru puku naịra iri (N10,000) site n'aka Maazị Saliu Mustapha.

O kwuru na ọ bụ n'ugbo nwoke ahụ ka Buhari gara zuo ohi ọka ahụ, ma mee ka a mara na nke ahụ mègidèrè mpaghara 390 nke iwu na-ahụ maka izu ohi na steeti ahụ, bụ nke a maara dịka 'Criminal Law of Ekiti State, 2012'. 

Kaosiladị, ọ gwakwazịrị ụlọikpe ka a kàgharịa ya bụ ikpe mgbe ọzọ, ka o wee nwee ike ịkpọta ndị akaebe ya, bụ ndị ga-agbakwa àmà na Buhari zuru ohi ọka ahụ n'ezie.

N'okwu nke ya, onye ọkaiwu na-ekpechitere Buhari ọnụ ya, bụ Lai Obisesan rịọrọ ụlọikpe ka ha tọhapụ ya bụ nwoke, ma kwe nkwà na ọ ga-akpọtakwa ya oge ọzọ a ga-akàgharị ya bụ ikpe.

Na nzaghachi oge ọ nụchara mkpesa na arịrịọ niile ahụ, onye Majie nọ n'isi ikpe ahụ, bụ Ọkaikpe Adedayo Oyebanji, tọhapụzịrị Maazị Buhari ka ọ labagodi, mà kàgharịa ikpe ahụ ka ọ dịzie n'abalị asatọ nke ọnwa Julaị na-abịa abịa. Buhari kwụkwàrà ego dị puku naịra iri abụọ ma kpọtakwa onye mbe binyeere ya aka n'akwụkwọ maka ntọhapụ ya; e wee tọhapụ ya ka ọ laruo ụlọ ma chighata azụ n'abalị asatọ nke ọnwa na-abịa abịa.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484