CAFE: Nwunye Obianọ Enyela Mmadụ 300 Ọzụzụ n'Ọrụ Aka, Nye Ha Akụrụngwa Na Ego Nkwàdó

Jun 8, 2021 - 21:26
 0
CAFE: Nwunye Obianọ Enyela Mmadụ 300 Ọzụzụ n'Ọrụ Aka, Nye Ha Akụrụngwa Na Ego Nkwàdó

Izunna Okafor dereakụkọ a

Nwunye aka na-achị steeti Anambra, bụ Oriakụ Ebelechukwu Obianọ emekwala ihe ọzọ dara ụda, dịka o nyere mmadụ ruru narị atọ (300) n'ọnụọgụgụ ọzụzụ n'ụdị ọrụ aka dị iche iche, ma bunyesie ha akụrụngwa ha ga-eji wee malite ihe dị iche iche a kụziiri ha n'ebe ahụ.

Inye nkụzi a na inye nkwàdo a bụ nke Oriakụ Obianọ mere site n'okpuru atụmatụ ọrụ obi ebere ya, bụ 'Caring Family Enhancement Initiative (CAFE)', ma bụrụ nke e mere mmemme nhịkọta ya na nsonso a n'ogige 'Dora Akunyili Women Development Centre' dị n'Awka, bụkwa ebe a nọrọ wee kesàára ndị ahụ akụrụngwa nkwàdo ahụ.

Ka ọ na-agwa ndị ahụ ritere uru na nkwàdo ahụ okwu, Oriakụ Obianọ kwuru na ebumnobi atụmatụ ọrụ aka ahụ bụ iji gbanwèé ọnọdụ obibindụ ụmụafọ steeti ahụ, ma kọwaa na n'agbanyèghị etu ihe siri sie ike, na n'agbanyeghị etu ọnụ ahịa akụrụngwa na ihe ndị ọzọ siri gbagoo n'elu ọjị, na CAFE ka na-aga n'ihu n'atụmatụ inye ọzụzụ na nkwàdó ahụ.

O kwuru na CAFE emeela ihe ahụ ọtụtụ ugboro na ọtụtụ ahọ, ma bụrụkwa nke e sigoro na ya zụpụta imirikiti mmadụ, kwàdo ha ka ha bụrụ ndị kwụụrụ onwe ha, tinyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ òtù ọrụ obi ebere ahụ mepụtagoro kemgbe ọ malitere, ọbụladị dịka o kwere nkwa ịga n'ihu n'ezi ọrụ ahụ, na inye ndị ahụ nkwàdó na ego mmalite.

O tòrò ndị ahụ sonye n'ọzụzụ nkọzi ahụ maka ịmụtacha ihe dị iche a kụziiri ha, ma gwa ha ka ha jiri ọgụgụisi na nkà ha mụtara ebe ahụ, nà ego nkwàdó na akụrụngwa ahụ e nyere ha wee bàárá onwe ha úrù ma bụrụ ndị kwụụrụ onwe ha. O kèlèkwazịrị ndị dị iche iche nyere aka ịhụ na oge nkụzi ahụ na mmemme inye nkwàdo ahụ gara nke ọma, ọkachasị ndị nlekọta ogige ọmụmụ ọrụaka 'Chike Okoli Centre for Entrepreneurial Studies (COCES)' dị na Mahadum Nnamdi Azkiwe dị n'Awka, bụ ebe a nọrọ wee nye ndị ahụ ọzụzụ ahụ.
 
N'okwu nke ya, Kọmishọna na-ahụ maka ọdịmma ọhaneze na ihe metụtara ụmụaka na ụmụnwaanyị, bụ Oriakụ Ndidi Mezue kèlèrè Oriakụ Obianọ maka mbọ dị iche iche ọ na-agba iji kwàdo ndị mmadụ site n'okpuru atụmatụ CAFE ya, bụkwa nke ọ gara n'ihu kwuo na ọ na-eme n'eleghị anya n'azụ, ọbụladị ma ugbua oge ọchịchị di ya na-akpụdobe nso. 

Ọ dụkwazịrị ndị ahụ ọdụ ka ha tinye ihe niile ha mụtara n'ebe ahụ n'ọrụ, ma jirikwa akụrụngwa na ego nkwàdo ahụ e nyere ha wee malite ọrụaka dị iche iche ha mụrụ.

N'okwu ha n'otu n'otu, onyeisi nhazi atụmatụ CAFE, ma bụrụkwa osote odeakwụkwọ mgbasaozi Gọvanọ Willie Obianọ, bụ Maazị Emeka Ozumba; na osote onyeisi nlekọta ogige 'Chike Okoli Centre for Entrepreneurial Studies', bụ Ọkammụta Ngozi Ijeomah kpọpụtasịrị uri dị iche iche dị na ọrụaka, ọkachasị ugbua ọrụ oyibo adịghịzị, nakwa ugbua ọnọdụ ala Nigeria dịzị imi na ọnụ ka ntọọ.

He chetakwazịịrị ndị ahụ mụrụ ọrụaka ahụ na ọrụaka na-enye ego nke ukwuu ugbua ma nwekwa ọtụtụ ohere ọma jupụtara na ya, ọbụladị dịka ha dụrụ ha ọdụ ka ha kpara nkụ n'ohere ọma niile ahụ, maka na onye ji ya ruru abụọ ga-egwuru.

Ụfọdụ ndị dị iche iche sonyere n'ọzụzụ ahụ ma sorokwa nweta nkwàdo ahụ kèlèrè CAFE, Oriakụ Obianọ na COCES maka ọzụzụ ahụ, ma kwe nkwa itinye ihe niile ha mụtara n'ebe ahụ n'ọrụ.

Ọzụzụ nkụzi ọrụaka ahụ bụ nke were izuụka ise, ma bụrụkwa nke mmadụ ruru narị atọ sonyere na ya, nke gụnyere ndị ntorobịa, ụmụnwaanyị ihe na-esiri ike, ụmụnwaanyị ajadụ, ndị ikedịnobi (bụ ndị ọlụsị) na ụfọdụ ndị ọzọ sitere na mpaghara ebe dị iche iche na steeti ahụ.

A nọrọ na ya bụ ọzụzụ wee kụziere ha ọrụakadị iche iche, nke gụnyere ịkpà isi, ịkwa ákwà, imepụta mmanụ a na-ete n'ahụ na ihe e ji achọ mma, imepụta nchà, ighe ihe oghighe, ịkwọ ihe, mgbasaozi, tinyere ụfọdụ ihe ndị ọzọ. Ka nke ahụ gachara, e nyegasịkwara ha akụrụngwa ha ga-eji wee malite ihe ha mụrụ, ma nyekwa ha ego nkwàdo iji malite, bụ nke e mere site n'aka ọrụ obi ebere CAFE, na onye chọpụtaa ya, bụ Oriakụ Obianọ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484