Ugo Ọlaedo Emerie Otú ha

Ugo Ọlaedo Emerie Otú ha

Apr 21, 2020 - 16:32
Jan 19, 2021 - 16:33
 0
Ugo Ọlaedo Emerie Otú ha

By Ibe Kelechukwu, Ibadan, Nigeria

Ndị Naịjirịa nọrọ n'amaegwuregwu Chamazi dị na Dar es Salaam ụbọchị Satọdee were bụrụ ndị mbụ n'otú ha na asọmpi ụmụ okorobịa n'erubeghị afọ iri na asaa nke mba Afrịka na-aga n'ihu dịka ha na ndị ọgbọ ha si mba Uganda nyere onwe ha otu ọkpụ otu ọkpụ.

Dịka ha na-eme na mbụ, ndị Naịjirịa nwetara ọtụtụ ohere ma were aka ha gbafusie ha niile n'otu n'otu, site n'aka Akinkunmi Amoo na nkeji nke iri na asaa. Nkeji atọ n'ihu, Wisdom Ubani jiri nwa ntakịrị ihe gbafuo bọọlụ agbara ya site na adọba, a gbaa.

Naijiria kara ịkwụ ụgwọ bọọlụ niile ha gbafusịrị dịka mba ahụ si ọwụwa anyanwụ Afrịka were bịa gosiri ha na ha abịaghị egwu ọnwa mana obi ruru ndị Naịjirịa ala dịka ha gbafuru bọọlụ ahụ.

Oche goolu ndị Uganda, Jack Komakech, chere bọọlụ Fawaz na Ubani ka ọ fọdụrụ nkeji abụọ ka ọkara nke mbụ gwụ. Na nkeji nke iri ise na asatọ, Andrew Kawooya gbara bọọlụ kụrụ n'ọnụ goolu Sunday Stephen site na adọba agbaa.

Ma na nkeji nke iri na asaa, ndị Uganda bụ na-esi ọnwụ imeri asọmpi ahụ nyere goolu site n'aka John Alou bụ onye ewebatara ewebata dịka oji isi manye bọọlụ ahụ n'ọnụ goolu.

Dịka nkeji abụọ gasịrị, Ubani gbafuru ọmarịcha bọọlụ ọzọ o nwetara ebe ọ fọdụrụ nanị oche goolu ka ọ kpaa were nye goolu. Mana na tupu ịgbabie anya, Ibraheem Jabaar jiri anya oji ahụ ụzọ ka egbe hụ bọọlụ ahụ Olakunle Olusegun gbara ya, were gbakpunye ya n'ọnụ goolu dịka oche goolu ndị Uganda na-amachapụta n'ike.

Nkeji ole na ole, shọọtụ Ubani bụ nke Komakech kụpụrụ dịka bọọlụ ahụ bịaziri na ngwụcha.

Mba Angola soro Naijiria bụrụ ndị si ná otu A were pụta dịka ha jiri ọkpụ anọ asatara nanị abụọ were merie mba Tanzania, ndị n'ebu ya bụ iko, ma bụrụkwa ndị jiri nkata kporo goolu iri na abụọ dịka ha emerighị otu asọmpi.

Ụbọchị Wednezdee, Naijiria na ndị nke abụọ na otu B, bụ nke a ga-amata tata n'etiti Cameroon na Senegal ma ọ bụ Guinea na Morocco, ga anwalee maka ndị ga-eru agba nke ikpe azụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.