Barack Obama ekwuputego usoro ohuru a ga-esi na-enwe egbe n'Amerika

Barack Obama ekwuputego usoro ohuru a ga-esi na-enwe egbe n'Amerika

Jan 17, 2013 - 05:40
Jan 20, 2021 - 05:40
 0
Barack Obama ekwuputego usoro ohuru a ga-esi na-enwe egbe n'Amerika

Onye isi ala mba Amerịka, Barack Obama, ekwuputego usoro ọhụru a ga-esi na-ahụ maka ibu egbe na mba ahụ. O teela aka ụfọdụ ndị mba ahụ na-akpọ oku ka gọọmenti ha mee ihe gbasa usoro inwe na ibu egbe.

<p">Mana ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị Rịpọblikan na-adụ azụ mgbe ọ bụna e welitere okwu a. Nke a bụ maka na ha achọghị imegide ndị otu a kpọrọ NRA, ndị na-adị enye otu Rịpọblikan ezigbote ego mgbe ọ bụna a na-azụ okwe ndọrọndọrọ ọchịchị.

N’atụmatụ usoro ọchịchị ahụ Obama gụpụtara taa, ọ chọrọ ka ndị Amerịka mee ihe ndị a na-esote:

  • Ka iwu mee ka a na-enyocha ndị mmadụ ọfụma tupu e reshi ha egbe.
  • Ka iwu mee ka ndị mmadụ ghara ina-enwezi ụdị egbe ndị ahụ a rụrụ maka ịlụ agha.   
  • Ka iwu Amerịka mee ka ndị mmadụ ghara ina-enwezi egbe nwere ike ịgbakarị mkpụrụ mgbọ 10 tupu a sụgharịa ya.   
  • Ka iwu mee ka a na-ata ndị mmadụ afụfụ ma ọ bụrụ n’aka kpata onye na-atụ mgbere ahịa egbe n’uzo na-ezighị ezi.

Ihe ndị Obama gụpụtara taa ọ chọrọ ka e mee buru ibu. Ọtụtụ ndị otu Demokrat kwenyere n’ihe Obama chọrọ ka e mee. Mana ndị Rịpọblikan na ndị otu NRA amalitegori iti mkpu megide Obama na atụmatụ ya.

Ọtụtụ ndị Amerịka malitere kwenyewe na e kwesiri ime ihe gbara ọkpụrụkpụ kemgbe otu nwoke buru egbe jee gbagbuo mmadụ 25 gụnyere ma ndị nkụzi ma ụmụ akwụkwọ n’otu ụlọ-akwụkwọ na Newtown. Tupu o mee nke a, o buru ụzọ gbagbuo mama ya n’ụlọ ebe ha bi.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.