Onwu egbuola Hugo Chavez

Onwu egbuola Hugo Chavez

Mar 7, 2013 - 05:18
Jan 20, 2021 - 05:20
 0
Onwu egbuola Hugo Chavez
: :
playing

Onye isi ala mba Venezuela, Hugo Chavez, anwụọla. Ọ nwụrụ taa bụ Tuzdee. Ọ gbara nanị afọ 58 tupu ọnwụ egbuo ya.

Onye osote onye isi ala mba ahụ, Nicholas Maduro, kwuputere taa na Chavez nwụrụ n’ịhe dịka elekere anọ n’ọkara, nke mgbede na mba ahụ.

A mụrụ Hugo Chavez n’abalị 8 nke ọnwa Julayị afọ 1954. Nna ya bụ onye nkuzi n’otu obere obodo e nwere na Venezuela. Mama nke ukwu Chavez zụrụ ya, tupu ọ baa amị mgbe ọ dị afọ 17. N’afọ 1992, ya na ndị otu ya nwara ike ha iwere ọchịchị n’ike. Mana aka mechara kpara ya. A tụrụ ya mkpọrọ. Ka afọ abụọ gafere, ọ pụtara na mkpọrọ were malite ịso azọ ọkwa onye isi ala na 1998.

Kemgbe ọnwa ole n’ole ka Chavez nọ n’akwa ọrịa kansa. E nwere mgbe anyị nụburu na ọ malitego ịgbake n’ọrịa. Taa, ndị Venezuela na-eru uju maka onye isi ala ha nwụrụ anwụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.