Ndị Ebenator Arịọla Ngbataọsọ Gọọmenti Dịka Mbize Kèwàrà Okporoụzọ

May 25, 2022 - 22:54
 0
Ndị Ebenator Arịọla Ngbataọsọ Gọọmenti Dịka Mbize Kèwàrà Okporoụzọ

Izunna Okafor dere akụkọ a


Ndị obodo Ebenator dị n’okpuru ọchịchị Nnewi South nke steetivAnambra akpọọla oku ka gọọmentị gbatara ha ọsọ enyemaka ngwangwa, dịka mbize kewara otu nnukwu okporoụzọ gara n'obodo ahụ, ma bụrụkwa okporoụzọ jikọtara steeti Anambra nà steeti Imo.

Cheta na onyonyoo malitere ifegharị n'usoro nzikọrịtaozi ọgbaraọhụrụ dị icheiche na nsonso a, ma na-egosikwa mbize na óké idei mmiri mere mkpamkpa n'okporoụzọ ahụ, nke jikọtara Anambra steeti na steeti Imo site n'obodo Amichi—Osumenyi—Ebenator—Ezinifite—Amaruru/Lilu, n'ihi nnukwu oké mmiri ozuzo ahụ zoro na nsonso a.

Dịka onyoonyo ahụ siri gosi, òtù akụkụ okporoụzọ ahụ dị nso n'ebe njikọụzọ ‘Ebenator Junction’ (nke a makwaara dịka ‘Amannalu Junction’) dị n'akụkụ ụlọ obibi Ọ̀kammụ̀ta Sam Uzochukwu, bụ̀ nke idei mmiri nà mbize tiwara. Ebe ahụ kpọmkwem bụkwazị ebe otu nnukwu mbize dị n'obodo ahụ a maara dịka ‘Ibo Ebenator’ siri gbanye mgbọrọgwụ. Ya bụ mbize ka e kwuru na o sò n'ótù n'ime mbize kachasị mie ímì na steeti Anambra nà ná mpaghara ndịda-ọwụwa anyanwụ ala Nigeria gbaa gburugburu, ma bụrụkwa nke yigoro obodo ahụ nà ụmụafọ ya égwù kemgbe ọtụtụ ahọ kwuru ahọ, mà bibisiekwa ọtụtụ ndụ̀, ụlọ na akụnụba ndị mmadụ.

 Ọ bụkwa n'isi ebe ahụ ya bụ mbize malitèrè ka idei mmiri niile sitere ụfọdụ n'obodo dị icheiche gbara Ebenator agbataobi si ehubata, wee si n'ibo Ebenator ahụ, na-ehubànye na mmiri Ọfala, bụkwazị nke mere ka ya bụ idei mmiri nwee ike ikèwà okporoụzọ ahụ

N'okwu ya n'ajụjụọnụ a gbara ya banyere nke ahụ, onyeisi ọchịchị obodo Ebenator, bụ Dọkịnta Anthony Okechukwu kọwara ya bụ ajọ ọnọdụ dịka nnukwu ihe ọdachi na ihe egwu jọgburu onwe ya, ma kọwakwa mbize ahụ dịka nke na-enye obodo ahụ nsogbu kemgbe ọtụtụ afọ gara aga.

Ọ kọwapụtara ụfọdụ mbọ enyemaka onwe ha bụ ndị ọchịchị obodo gbagoro iji mee ka ọnọdụ ahụ kawanye mma, bụ nke amitàghị̀ mkpụrụ a tụrụ anya, n'ihi etu ọnọdụ ya bụ mbize siri gbata kwụrụ nàkwà etu ọ hà.

Ọ gakwara n’ihu kpọpụta ụfọdụ n’ime ihe ndị ọchịchị ya mere n’oge gara aga iji dọta uche gọọmentị n’ọnọdụ ahụ, nke gụnyere ide akwụkwọ ozi zigara aka na-achị steeti ahụ n’oge ahụ bụ Chiifu Willie Obianọ na Kọmishọna na-ahụ maka ọrụ n’oge ahụ, Injinia Marcel Ifejiofor, bụkwa nke ha enwetaghị nzaghachi ọbụla na ya, wee ruo ọchịchị ahụ pụrụ n'ọkwa.

O kwuru mmebi ahụ mbize ahụ mebiri okporoụzọ ahụ ugbua abụghị naanị nà o tinyeel ụmụafọ obodo ahụ nà ndị bi nà gburugburu ebe ahụ na nnukwu ihe izèndụ̀; kama na ya bụ ajọ ọdachi mekwazị̀rị̀ ka ọ bụrụ ihe adịghị mfe ụgbọala abụọ isi n'akụkụ ebe ahụ okporoụzọ ahụ mebiri wee gafee n'otu oge; tinyekwuoro na ọ ga-esikwa ike ọbụladị otu ụgbọala ịga n'akụkụ ebe ahụ n'ebughị ụzọ kwụsịlata, jiri nwayọọ, ma kpachapụ anya.

Dọkịnta Okechukwu kwukwàrà na eleghị anya, ọ bụrụ na idei mmiri na mbize ahụ erichasịala okpuru ụzọ ahụ na mpaghara ebe ahụ, nke mezịrị ka ọ dụọ ụmụafọ obodo ahụ, ndị bi na mpaghara ahụ, nà ndị na-agba n'okporoụzọ ahụ ọdụ ka ha zèéré maọbu kpachapụ anya etu ha si agba n'ụzọ ahụ ugbua, wee ruo mgbe a rụchara. Ọ kwupụtara mwute ya nà okporoụzọ nke ọzọ dị n'obodo ahụ ndị mmadụ kààrà isi na-aga ugbua nke a mebiri nọ̀kwà na nnukwu ajọ ọnọdụ, n'ihi na ọ dịghị mma ụkwụ, ma ya fọdụzie ịdị mma ụgbọala.

Ọ sịrị, "Ọ bụrụ na ụzọ nke ahụ dị mma, ọ gaara abụ ụzọ kachasị mma na ụzọ kachasị dị nso ndị mmadụ ga na-esi ugbua, wee ruo mgbe gọọmenti dozie nke a mebiri emebi.”

Ọ kpọkukwara gọọmenti n'ogoogo dị icheiche, ya na Kọmishọna na-ahụ maka gburugburu na steeti ahụ, bụ Injinia Felix Odimegwu (onye sitekwara na mpaghara ebe ahụ) ma rịọ ha ka ha gbatara obodo ahụ ọsọ enyemaka ngwangwa iji leba anya n'ajọ ọdachi ndị ahụ ma mee ihe banyere ha, tupu ya bụ ọnọdụ akawanye njọ.

Mbọ dị icheiche a gbara iji nweta ntụnye okwu Kọmishọna Odimegwu banyere ya bú ajọ bụ nke mara afọ n'ala, n'ihi na ọ zaghị òkù ekwentị ya.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484