Gọvanọ Obianọ Enyefèéla Amụmà Ego Ọrụ Ahọ 2022 n'Aka Ndị Omeiwu Anambra

Oct 22, 2021 - 22:31
 0
Gọvanọ Obianọ Enyefèéla Amụmà Ego Ọrụ Ahọ 2022 n'Aka Ndị Omeiwu Anambra

Izunna Okafor dere akụkọ a

Aka na-achị steeti Anambra Gọvanọ Willie Obianọ enyefèéla amụmà ego ọrụ ahọ na-abịa abịa, bụ ahọ 2022 n'aka ndị ụlọ omeiwu steeti ahụ maka inyòchà, ilebà ya anya na ime ihe ndị ọzọ e kwesiri ime iji nabàta ma bìnye aka na ya.

Nke a bụ n'ịgbasò mkpebi ahụ Gọvanọ Obianọ mere na amụma ego ọrụ steeti ahụ ga na-aga n'usòrò ọnwa Jenụwarị ruo ọnwa Disemba, n'abụghị n'agbàtà etitì otu ahọ na ibè ya.

Ya bụ amụmà ego ọrụ bụ nke dị otu narị ijeri naịra na iri anọ na otu, na ụma nde naịra iri iteghete na asaa (N141.97b); ma bụrụkwa nke pasenti iri isii na asaa n'ime ya bụ maka ọrụ mmepe, ebe pasenti iri atọ na atọ n'ime ya bụ maka ịkwụ ụgwọ na ihe ndị ọzọ a na-eme na mgbe na mgbe. 

N'amụmà ego ọrụ ahụ, ịrụ okporoụzọ na ọrụ mmepe ndị ọzọ ga-ewè ijeri naịra iri abụọ na atọ; ọrụ ụgbo ga-ewe ijeri naịra atọ, ebe a ga-etinye ijeri naịra atọ na ụma iri atọ na abụọ n'agụmakwụkwọ; tinye ijeri naịra atọ na ụma iri anọ na abụọ n'ihe gbasaara gburugburu; tinye ijeri naịra abụọ na narị puku naịra asatọ n'ịkwàlite ndị ntorobịa; tinye ijeri naịra ise na ụma asatọ n'ịkwalite obere ahịa na ụlọ mmepụta ngwaahịa (SMEA), ma tinyekwazie ijeri naịra abụọ na otu n'ịkwalite ihe gbasaara mmiri ọñụñụ na ihe e ji akwalite ọnọdụ obibindụ ọhaneze.
 
Ọrụ ịkwalite mmepe ime-ime obodo ga-ewe otu ijeri naịra na ụma anọ,  iji bido àgbà nke atọ nke amụmà inye obodo ọbụla ego ka ha wee họrọ ma rụọ ihe dị ha mkpà, ya na iji nyekwara ndị ọlụsị aka. 

N'okwu ya oge ọ na-edobe amụma ego ọrụ ahụ n'ihu ndị omeiwu ahụ, Gọvanọ Obianọ kọwara ya dịka nke gbakwasara ụkwụ n'ịkwàlitekwuo ezi ọrụ ọ rụgoro na steeti ahụ kemgbe ahọ asaa gara aga ma mee ka o guzosie ike, n'ebughị n'obi itinyekwu ego n'ụtụ isi n'ime ahọ na-abịa abịa.

O kwuru na ọchịchị ya na-agbasi mbọ ike ma na-emezupụta amụmà ego ọrụ steeti ahụ, n'agbanyeghị etu ọnọdụ akụnụba ala Nigeria siri debe imi na ọnụ. O kelekwazịrị ndị omeiwu steeti ahụ maka nkwàdo ha na-enye ya site n'etu ha si arụkọ ọrụ ọnụ kemgbe ahọ asaa gara aga; ọbụladị dịka ọ rịọrọ ha ka ha mee mee ngwa binye aka n'amụmà ego ọrụ ahụ ngwangwa dịka a tụrụ anya, n'ihi na amụma ego ọrụ ahụ ga-enye aka n'imezupụta atụmatụ mmepe ahụ a kpọrọ 'Anambra Vision 2070'.

Na nzaghachi ya n'aha ndị omeiwu ahụ, Ọkaokwu ụlọ omeiwu steeti ahụ, bụ Maazị Uche Okafor kwuru na Gọvanọ Obianọ emezupụtala ihe o kwuru banyere ọdụ ụgbọelu mba ụwa Anambra, ogige ụlọ ezumezu mba ụwa Anambra a na-arụ n'Awka, ama egwuregwu 'Awka City Stadium' na ọrụ ngo ndị ọzọ ọ rụtụrụ aka oge ọ bịara inyefe ha amụmà ego ọrụ nke ahọ 2021.

O kwuru na ha bụ ndị omeiwu ga-enyòcha ma lebà anya amụmà ego ọrụ ahụ nke ọma, jide n'aka na ọ dabara adaba n'ihe ụmụafọ Anambra chọrọ, ma binyekwa ya aka ma ha lebàchaa ya anya.

O kelere Gọvanọ Obianọ maka ịnọgidesi ike na mkpebì ya ịhụ na amụma ego ọrụ steeti ahụ na-aga n'àgbàtà ọnwa Jenụwarị ruo ọnwa Desimba.

Mmemme inyefè amụmà ego ọrụ ahụ bụ nke weere ọnọdụ n'ụlọ omeiwu steeti ahụ dị n'Awka, ma bụrụkwa nke dọtara ọtụtụ ndịisi ụlọọrụ gọọmenti dị icheiche na steeti ahụ, ndị eze ọdịnala, na ndị ọzọ e ji okwu ha agba izu na ngalaba dị icheiche na steeti ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484