Otu Nwoke Na Nwa ya Nwaanyị Akpụọla Arụ

Dec 14, 2019 - 20:56
Jan 24, 2021 - 03:23
 0
Otu Nwoke Na Nwa ya Nwaanyị Akpụọla Arụ

Ibe Kelechukwu, Ibadan

Ihe ọjọọ gbaa afọ, ọ bụrụ omenala ka Igbo kwuru mana ndị Nnewi ekweghị ka nkea bụrụ n'obodo ha. Ya mere ndị Okofia Otolo Nnewi jiri chụpụ otu nwoke, gbara afọ iri asaa, na nwa ya nwaanyị bụ ndị Okija, n'okpuru ọchịchị ime obodo Ihiala na Anambra Steeti, maka ịkpụ arụ.

Nwoke a, ka a na-ekwu tụwara nwa ya nwaanyị ime. Ozi sitere n'obodo ahụ sịrị na ndị obodo ahụ chụpụrụ nwoke ahụ oge ha chọpụtara arụ ọ kpara, nke mere nwa ya nwaanyị jiri mụta otu nwa nwoke.

Dịka ya bụ akụkọ siri gaa, "Nwoke ahụ bi na Okofia Otolo Nnewi, mana ọ bụ Okija. Ọ tụwara nwa ya nwaanyị ime nke abụọ. Nwoke ahụ, bụ onye nwunye ya nwụrụ ọtụtụ oge gara, jiri ya bụ ohere were na-edina nwa ya nwaanyị."

Ozi anyị nwetara gara n'ihu kọwaa na ọ tụwara nwa ya nwaanyị ime afọ abụọ gara aga nke mụpụtara nwa nwoke. Mana nke ikpeazụ a bụ ihe chịpụtara ha abụọ ọkpa n'iro.

Oge akụkọ na-aga ka ndị obodo Nnewi jiri nwayọọ were tinye anya na mmiri mewe nnyocha tupu ya bụ mmiri na-agafe obu ọkpa. Mgbe ha mechara nnyocha ha, o doro ha anya na agadi nwoke a na-edina nwa ya nwaanyị tupu nwunye ya anwụọ, nke mere e jiri chụpụ ya na nwa ya nwaanyị n'obodo ahụ.

"Ekere agadi nwoke ahụ ọmụ nkwụ n'olu ma kekwa nwa ya nwaanyị n'ụkwụ dịka njirimara ihe ihere na ha abụọ kpara arụ. Ndị obodo ahụ buteziri otu ụgbọala nke bupụrụ nwoke ahụ, nwa ya nwaanyị na ibu ha n'ọnụ ụtụtụ gawa obodo amaghị ma were azịza zachapụ arụ ha."

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.