Ncheta Chukwuma Nzeọgwụ na Ụmụnakwe Agụiyi-Irọnsị -- Mbido Igbo
By mbidoIgbo.com
N’ụbọchị taa ka soja ụmụ Igbo abụọ a, zara oku ọnwụ. Nzeọgwụ nwụrụ na agha Biafra n’afọ 1967, ebe Agụiyi-Irọnsị nwụrụ n’afọ 1966, n’aka ndị soja Naịjirịa.
Na ndụ ha, a mụrụ Nzeọgwụ na Kaduna. Ọ bụ onye Anịọma dị na Delta Steeti. Ọ banyere armị n’afọ 1957, ebe o ruru ọkwa majọ. Nkwenye ya na ndị soja ndị ọzọ nwere na ndị ọchịchị nkịtị na-aghasa Naịjirịa, butere ndị armị ị weghara ọchịchị n’ike.
Nke a mere ha ji gbuo ndị dịka Ahmadu Bello, Tafawa Balewa na Festus Okotie-Eboh. Mana egbughị ndị dịka Michael Ọkpara na Azịkiwe, nke mere e ji kpebie na ndị Igbo ji ụzọ aghụghọ wee kpochapụ ndị ha gburu, maa werekwa ọchịchị n’ike.
Ọ bụ n’ọnọdụ a ka akụrụ ajọ mkpụrụ mechara bute agha Biafra. Mgbe agha Biafra malitere, Nzeọgwụ nke ruola ọkwa “Lt. Colonel” na armị ndị Biafra zutere ọnwụ ya na Nsụka. Nke a mere mgbe ọ nọ ọrụ ịhazi ndị agha Biafra n’abalị, maka agha ahụ a nọ n’ime ya.
Ha amaghịkwa na ndị agha Naịjirịa nọ ha nso, nke mere na ha ekeghị nkwụcha. Maka onye ndị iro gbara gburugburu, na-eche ndụ ya nche oge niile. Ọ bụ n’ebe a ka pịnyụrụ ọkụ odogwu a. Ọ gbakwara naanị afọ iri atọ oge ọ nwụrụ.
Ka agha biri, onyeisi ala bụ Gowon nyere iwu ka e lie ozu ya na “Military Cemetery” nke dị na Kaduna, ma kwanyere ya ugwu ruru ya.
A mụkwara Johnson Ụmụnakwe Agụiyi-Ironsi n’ụbọchị nke atọ, n’ọnwa March n’afọ 1924. Ọ bụ onye Ịbeku dị n’Ụmụahịa, Abịa Steeti. Ọ banyere armị n’afọ 1942, ebe o ruru ọkwa Majọ-Generalụ.
E mere ya onyeisi ala Naịjirịa na Janụarị n’afọ 1966 ka Nzeọgwụ na ndị soja ụfọdụ wetara ọchịchị ndị nkịtị na njedebe, mgbe ha gburu ndị dịka Ahmadu Bello, maka kwenye ha nwere na ha na-aghasa obodo.
N’ezie, Agụiyi-Ironsi sokwa na ndị e wepụtara ka e kpochapụ, mana dịka onye soja ọ bụ, ọ weghara ọchịchị na Legọs n’ike. Maka n’oge ahụ, Legọs bụ ‘Federal Capital Territory.’ Mana ndị a ha gburu bịa kpodo Naịjirịa isi n’ala, maka ndị “Northern” Naịjirịa kwenyere na ndị Igbo ji aghụghọ weghara ọchịchị, site na-igbu ndị be ha bụ Ahmadu Bello na Balewa.
Ironsi n’aka nke ya, enyekwughị aka n’okwu a, maka ndị niile tinyere aka na-igbu ndị ahụ enweghị ntaramahụhụ o nyere ha. Nke a mere e ji kpara ya nkata ọnwụ, nke ọ dabara n’ime ya, n’ụbọchị 29 July, n’afọ 1966.
Ọ bụ Theophilus Danjuma du ndị soja wee bata na ngige Adekunle Fajuyi na Ibadan, ebe e gburu ma Ironsi tinyere Fajuyi. Ọ gbara afọ iri anọ n’abụọ, oge ọ nwụrụ. Akụkọ karịrị otu o si nwụ kpọmkwem, mana ihe a maa bụna, a hụrụ ozu ya, tinyere nke Fajuyi n’ọhịa dị ụlọ Fajuyi nso. Ihe kachaa mwute bụ na Ironsi nọ n’ọkwa ọchịchị naanị ọnwa isi.
Nke a akwụsịghị ndị ugwu igburu ndị Igbo gawa na mpaghara “Northern” Naịjirịa. Ọ bụ n’ọgbaghara a, ka agha Biafra si wee malite.
What's Your Reaction?