Ọnọdụ Nwaanyị Ajadụ n'Ala Igbo (2)

Jun 17, 2021 - 22:58
Jun 17, 2021 - 23:22
 0
Ọnọdụ Nwaanyị Ajadụ n'Ala Igbo (2)
Ụmụnwaanyị ajadu na-eme ngagharịiwe maka mmegbu a na-emegbu ha

.

Izunna Okafor dere edemede a

.

.

Edemede a bidòrò ụnyaahụ 

N'ụfọdụ obodo dịgasị n'okpuru ọchịchị Ụzọ-Ụwanị dị na steeti Enugu, ọ bụrụ na nwaanyị ajadụ bido iru uju di ya, a na-eji nkịrịka ákwà wee kechie aka ya, nke a ga-adịkwa etu ahụ wee ruo ihe dịka ọnwa atọ maọbụ karịa. N'ime oge a, nwaanyị ahụ agaghị eji aka ya ahụ wee na-eri nri; ọ bụ nwaanyị ajadụ ibe ya ga na-enye ya nri. Mgbe ụfọdụ, ọ na-abụkwa a kpụchaa nri, a tụpụrụ ya nwaanyị ahụ n'ala, o were wee na-akpụrụ ya; maọbụkwanụ e tinyere ya nri n'efere ochie kụwara akụwa. Ọtụtụ oge, a na-amanyekwa nwaanyị di ya nwụrụ ka ọ na-asa ahụ n'akụkụ ili di ya, nke, mgbe o mechara ya, ọ gbara ọtọ wee bàá n'ime ụlọ ga hichaa ahụ ya.

N'ọtụtụ obodo n'ala Igbo, ọkachasị n'oge gboo, ọ bụ n'ala ka a na-atọbara nwaanyị ajadụ ihe onyinye na ego e jiri bịara ya akwamozu n'ime oge ahụ ọ na-eru uju, ọkachasị ụbọchị a na-akwa di ya kpọmkwem; a naghị enye ya ihe ahụ n'aka, maka na a na-ahụta ya dịka onye rụrụ arụ oge ahụ na onye enweghịzị ùgwù.

N'ụfọdụ obodo, dịka Nise, dị n'okpuru ọchịchị ime obodo 'Awka South' nke steeti Anambra, a naghị ekwe ka nwaanyị di ya nwụrụ rie nri e siiri ndị ezinụlọ ya, malite ụbọchị ahụ a kwara ozu di ya wee ruo mkpụrụ ụbọchị anọ. Ọ gaghị emetụkwa ego maọbụ ihe e nwetere n'akwamozu ahụ aka, n'ụdị ikètà òkè n'ime ya; n'agbànyèghị ego ole ọ tụnyere n'akwamozu ahụ. 

Na Nise ahụ, a naghị ekwe ka nwoke bịa lụrụ maọbụ gbaa nkwụ nwa nwaanyị di ya nwụrụ, wee ruo oge ọnwa isii gachara maọbụ ọnwa ole nne ya ga-eru uju. Ọ bụrụ na o ruchaghị uju ahụ wee mee ihe a na-akpọ Imepu Ajadụ, bụ omenala ọ ga-eji wee chịkọta iru uju ya, ọ bụ nkwenye ha na nwoke ọbụla batara n'ezinụlọ ahụ wee bịa lụọ nwa ya nwaanyị gà-anwụrịrị. Nwa ya  nwaanyị ọbụla chọrọ ịlụ di ga-echeregodi, wee ruo mgbe nne ya ruchara uju, tupuu ọ lụba.

Ekwuola m na mbụ na ọ bụ otu ahọ (ya bụ ọnwa iri na abụọ) ka nwaanyị na-anọ n'ọnọdụ iru uju n'oge mbụ; mana ugbua, ụfọdụ na-eruzị uju ọnwa isii maọbụkwanụ, opekatampe, ọnwa atọ. N'agbanyèghị ọnwa ole nwaanyị ga-eru uju di ya, otu ihe pụtakarịchara ìhè bụ na ọ bụ naanị ákwà oji ka ọ ga na-eyi ogologo oge ahụ niile, ọkachasị n'oge mbụ. Kaosiladị, n'ihi ụka, ụfọdụ bụzị ákwà ọcha ka ha na-eyi n'ime oge iru uju ahụ ahụ, n'ọnọdụ ákwà oji. 

N'ụfọdụ obodo n'ala Igbo n'oge gboo, a na-ebunye nwaanyị ajadụ ìtè n'etiti ime abalị, dupu naanị ya n'ime abalị ahụ ka ọ gaa chute/gbata mmiri na mmiri obodo ahụ, bụ nke nwere ike ịdị ebe dị anya maọbụkwa dị n'ime ọhịa. E nwekwàzịrị ọtụtụ ihe dị iche iche a na-eme nwaanyị ajadụ, ya na etu e si emeso ha, ọkachasị n'ime oge ha na-eru uju, na oge ha nọchara n'iru uju.

N'ime ọnọdụ niile a a na-enye nwaanyị di ya nwụrụ n'ala Igbo, nke kacha nke bụ ọnọdụ gbasaara ọnụnọ ya n'ezinụlọ ahụ oge di ya nwụchara. Ụfọdụ oge, ọ bụrụ na di nwaanyị nwụchaa, nwanne nwoke ahụ na-ekùchí (wèéré/maọbụ wèghara) nwunye ya ka ọ bụrụzie nwunye ya. Ụfọdụ oge, a na-eme nke a n'íké maọbụ n'ịmanye nwaanyị ahụ amanye ka  ọ lụba nwanne di ya, ma ọ chọrọ ya ma ọ chọghị ya.  Otu ihe pụtakarịchara iche e ji maka ya ekuchi nwaanyị di ya nwụrụ n'ala Igbo bụ ka o wee mụọ nwa ga-anọchi anya di ya (ma ọ bụrụ na nwaanyị ahụ atụghị ime maọbụ mụọ nwa tupu di ya nwụọ). E nwekwàzịrị ihe ndị ọzọ mere e ji ekuchi nwannyị n'ala Igbo, nke ụfọdụ n'ime ha bụ naanị bụ maka ọdịmma nke onwe (selfish interest) nke onye ahụ chọrọ ikuchi ya. Ọ bụrụ na a chọọ ikuchi nwaanyị ahụ, o wee jụ, sị na ọ chọrọ ịnọrọ onwe ha n'ihi otu ihe maọbụ nke ọzọ, e nwere ike nyezie ya ọnọdụ kawanye njọ.

Ọtụtụ oge, ụmụnne di nwaanyị ahụ nwụrụ anwụ na-achụpụ ya achụpụ maọbụ chụlaa ya be nna, kpakọrọ maọbụ resie ihe dị iche iche di ya nwere, ma ala ma ihe ndị ọzọ, mà gàbázie nwaanyị ahụ maọbụ ya na ụmụ ya aka, n'enyeghị ha ihe ọbụla maọbụ òkè ego ha retere n'ihe nwoke ahụ. Nke a mee, ị hụ ka nwaanyị ahụ ga-ejizị isi na-aga ijè ma werekwa eze na-ékpè ekwere, ọkachasị n'ịzụlịte ụmụaka di ya hapụụrụ ya wee nwụọ (ma ọ bụrụ onye mụrụ nwa).

Na mpaghara ebe dị iche iche iche na steeti Imo, ihe a na-eme n'ọtụtụ obodo bụ na nwoke nwụọ, ụmụnne ya na-anakọrọ nwunye ya akwụkwọ ihe dị iche iche di ya nwere, ma gwakwa ya ñụọ iyi na o weghị nke ọbụla o zoro ezo, ebe ụmụada ga-adàkwa ya nha dị iche iche, site n'ịsị ya kwụọ ụgwọ nke a maọbụ nke ọzọ.

Nke a bụ nke adabaghị adaba n'usoro iwu na-ahụ maka alụmalụ di na nwunye n'ala Nigeria. Mpaghara iri atọ na anọ nke iwu alụmalụ ahụ a kpọrọ 'Nigerian Marriage Act' 1990 kọwàrà ebe o dòró anya, na ọ bụrụ na nwoke nwụọ, ọ bụrụ na nwunye ya mụtara nwa/ụmụ, ọ ga-ewere òkè ruru otu n'ime nkewa atọ nke ihe niile di ya nwere, ebe ụmụ ya ga-enwerezị ndị nke ọzọ. Mana ọ bụrụ na nwaayị ahụ amụtaghị nwa, ị mara na ọ ga-ewere ọkara ihe niile di ya nwụrụ, ma ọ bụrụ na nwoke ahọ edeghị etu a ga-esi wee kèé ekpe ya ma ọ laa mmụọ. Mana ihe ndị a bụ naanị n'akwụkwọ ka e dere ya; a naghị eme ya eme n'ala Igbo, maka na ọtụtụ amaghị banyere iwu ahụ, ebe ọtụtụ màchà maka ya na ọtụtụ iwu ndị ọzọ dị etu ahụ, mà kpàchárá anya na-emegbu nwaanyị di ya nwụrụ.

E nwekwazịrị ọtụtụ ụzọ dị iche iche e si emegbu ụmụnwaanyị di ha nwụrụ n'ala Igbo site n'ọnọdụ a na-enye ha n'ezinụlọ na obodo dị iche iche malite n'oge di ha nwụrụ, ruo oge ha ruchara uju, maọbụkwanụ ogologo ụbọchị niile nke ndụ ha.

Ọ dị ọtụtụ ihe na-ewèta mmegbu a a na-emegbu ụmụnwaanyị ajadụ na ọnọdụ ekwesighị ekwesi a na-enye ha, mà nwekwa ọtụtụ ihe mere e jiri ka na-eme ya bụ ihe ruo taa. Ụfọdụ isi sekpụ ntị n'ihe ndị a gụnyèrè: nkwenye, agụghị akwụkwọ/awaghị anya, omenala ụfọdụ, enweghị ọnụokwu (n'akụkụ ụmụnwaanyị), ejighị ụmụnwaanyị kpọrọ ihe, anyaukwu na óké ọchịchọ, tinyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ. O nwèkwàrà ike bụrụ na ihe ụfọdụ ndị mmadụ maọbụ obodo ji emegbu ụmụnwaanyị ajadụ bụ ka ndị nke di ha dị ndụ wee mebe di ha nke ọma ma na-elekọta ya anya etubo kwesiri, ka di ha wee nọọrọ ha ogologo ndụ, ghàrá ịnwụ, iji wee gbanahị ime ha ihe e mere nwaanyị ajadụ.

N'agbanyeghị ihe ọ sọrọ ya bụrụ na-akpata imegbu ụmụnwaanyị di ha nwụrụ n'ala Igbo maọbụ inye ha ọndụ ekwesighị ekwesi, ọ dị mkpa ịkọwa na ọtụtụ n'ime ihe ndị ahụ a na-eme ụmụnwaanyị bụ ihe jọgburu udele na njọ ma sigbuo nkakwụ n'ísì, ma bụrụkwazie ihe ekwesighị ịdị na-ahụta maọbụ na-anabata n'obodo ọbụla taa. Ọtụtụ n'ime ihe ndị ahụ bụ ihe mgbe gboo ekwesighịzị ka a na-eme ha taa, n'ihi mgbanwè e nwegoro n'ọtụtụ ihe dị iche iche.

Ọtụtụ ụmụnwaanyị ajadụ esitela n'ụdị mmegbu dị etu ahụ wee nwụọ ọnwụ ike, ebe a na-amanye ha ka ha ruo uju di ha nwụrụ anwụ maọbụ na-emeso ha omume ekwesighị ekwesi maka na di ha nwụrụ. Iji maa atụ, ụfọdụ ụmụnwaanyị anwụọla maka na ha ñụrụ mmiri e jiri wee saa ozu di ha, n'ihi unyi, ọrịa maọbụ ihe ọjọọ ndị ọzọ ha a sapụtara n'ahụ ozu nwoke ahụ; ha wee ñụọ, naanị ka ha wee gwa ụwa na aka ha dị ọcha n'ebubo ahụ a na-ebo ha banyere ọnwụ di ha. 

Ọtụtụ ụmụnwaanyị ajadụ anwụọla n'obi mgbọwa, ọbara mgbalielu, maọbụkwanụ jiri aka ha gbuo onwe ha, maka na ha enweghịzị ike inagide ọnọdụ ọjọọ dị iche iche a na-enye ha maka na di ha nwụrụ. Keduzị úrù dị na ya? nà mmadụ nwụrụ maka na ọ na-eru uju onye nwụrụ anwụ. Onye ga-azụzị ụmụaka nwoke na nwaanyị ahụ hapụrụ?

Ọ bụ n'ihi ihe dị etu a na ọtụtụ mpụtàrà ọjọọ dị iche iche si na ya apụta ka ọtụtụ òtù mba ụwa dị iche iche, ndị na-ahụ maka ichekwa na ịkwàlite ikike dịịrị mmadụ, na ọtụtụ obodo na ndị ndu ha ji etinyezị ọnụ ma na-agbazị mbọ ugbua iji bèlata ya bụ mmegbu a na-emegbu ụmụnwaanyị ajadụ na ọnọdụ a na-enye ha.

Ịgba mbọa a amịtálá ọtụtụ ezi mkpụrụ dị iche iche ma wètekwa mgbanwè n'ụfọdụ ọnọdụ ahụ a na-enye ụmụnwaanyị ajadụ. Iji maa atụ, a naghị ahụkarịzị ka a na-amanye nwaanyị di ya nwụrụ ka ọ ñụọ mmiri e jiri saa ozu di ya ahụ n'ọtụtụ obodo, dịka ọ dị n'oge mbụ. N'ọtụtụ obodo taa, a naghịzịkwa ahụta ka a na-akpọchido nwaanyị di ya nwụrụ n'ime ụlọ ruo ọnwa olenaole maka na ọ na-eru uju ọnwụ di ya. Anaghịkwa ahụkarị ka a na-edunye nwaanyị ajadu ka o were ime abalị wee chuo mmiri; maọbụkwanụ saa ya ahụ n'ihu mmadụ ma a kpụchaa ya isi maka na dinya nwụrụ.

N'ịga n'ihu, n'ọtụtụ obodo taa, ọ bụghịzị iwu na nwaanyị na-eru ọnwụ di ya ruo otu ahọ; ọtụtụ na-eruzị uju naanị ọnwa isii, ebe ndị ọzọ na-eruzị naanị ọnwa anọ. Ọtụtụ ezinụlọ bụzị naanị ihe dịka ọnwa anọ ka ha na-anọ taa wee yipù akwa uju. N'ụfọdụ obodo dị iche iche n'ala Igbo taa, a naghịzị amanye nwaanyị ajadụ ka ọ kwaara di ya ákwá n'ọnụ ụtụtụ maọbụ na mgbede ka obodo wee mara na ọ na-eru uju ọnwụ di ya. Ọzọkwa, ụmụnwaanyị di ha nwụrụ na-ejizị aka ya ahọrọ na ọ bụ ákwà oji ma ọ bụ nke ọcha ka ha ga na-eyi oge ha na-eruru di ha uju. A naghị akpọchidozịkwa ha ụzọ n'ọtụtụ obodo taa oge ha na-eru uju ọnwụ di ha. Ụfọdụ na-enyekwazị ụmụnwaanyị ajadụ ohere ka ha họrọ ma ha ọchọrọ ịkpụrụ di ha isi maọbụ na ha achọghị.

N'agbànyèghị mgbanwe olenaole a e nwegoro n'ihe banyere ọnọdụ a na-enye ụmụnwaanyị ajadụ na mmegbu a na-emegbu ha n'ala Igbo, ọtụtụ ọrụ ka fọkwara, maka na ọtụtụ ihe amachàbèghị kwụrụ.

Ọtụtụ obodo ka na-aga n'ihu na-emegbu ụmụnwaanyị ajadụ ma na-enyekwa ha ọnọdụ jọgburu onwe ha na mpaghara ebe dị iche iche n'ala Igbo na n'ala Nigeria taa, n'agbanyèghị mbọ niile a na-agba ka e memilaa ma kwụsị ya bụ ajọ omume. N'ọtụtụ obodo, e nwebèghịdị mgbanwe ọbụla chaa chaa banyere mmegbu ha na-emegbu ụmụnwaanyị ajadu nà ọnọdụ ọjọọ ha na-enye ha. Nke ahụ wee bụrụ ihe ịgba anyammiri nà ihe kwesiri ka e lebàrá ya anya.

Obodo dị iche iche, òtù mba ụwa, òtù na-ahụ maka ikike dịịrị mmadụ, ndị ụka dị iche iche, gọọmentị, ndị ọrụ ikpe na ndị ọzọ ọnụ na-eru n'okwu kwèsìrì iteta n'ụra ma gbasikwuo mbọ ike, tinye ọnụ n'okwu megide mmegbu a na-emegbu ụmụnwaanyị ajadụ. Ọ bụkwanụ naanị ụmụnwaanyị ka a na-eme ihe a, maka na nwaanyị nwụọ, nwoke ana-agagharịrị onwe ya; o nweghị onye ga-asị ya mee nke a maọbụ emela nke a; o nweghịkwa ihe ọbụla a ga-eme ya. Nke a na-egosi na ya bụ ihe bụkwà otu ụzọ e si emegide ụmụnwaanyị n'ụwa taa.

N'echiche nke m, e kwesiri ịhapụ nwaanyị ka o were aka ya họrọ ogologo oge ole ọ chọrọ iruru di ya uju nà etu ọ chọrọ isi ruoro ya uju. Iru uju bụ ihe nke mmụọ na ihe nke onwe; ma bụrụkwa nke mmadụ kwesiri iji aka ya kpebiere onwe etu ọ ga-esi mee, n'abụghị site na mmanye; kama, site n'ilekwàsị anya n'etu ya na onye ahụ siri wee dị oge ọ nọ ndụ. Ọ bụ eziokwu na nwaanyị kwesiri iruru di ya nwụrụ anwụ uju. Nwoke kwesikwara iruru nwunye ya uju, maka na anyammiri anaghị agba n'otu anya hapụ anya nke ọzọ. Anyammiri na-agba n'anya abụọ. Kaosiladị, iru uju ekwesighị ịbụ na mmanye maọbụ site n'itinye onye ahụ n'ọnọdụ ọjọọ dị iche iche, maka na onye nwụrụ anwụ anwụọla. 

O nweghịkwanụ ụdị mmegbu e megburu nwaanyị ajadụ maọbụ etu o siri ruo uju, ka di ya nwụrụ anwụ si n'ọnwụ bilie, maọbụ gaa eluigwe ma ọ bụrụ na ọ bụ ihe ịga ọkụmmụọ ka o metere mgbe ọ nọ ndụ n'ụwa. 

N'eziokwu, imegbu nwaanyị ajadụ bụ ihe ọjọọ, ma n'anya Chukwu, ma n'anya mmadụ. Onye megburu nwaanyị ajadụ mègbùrù chi ya. I so emegbu nwaanyị ajadụ? Ị nà-anọ maọbụ na-ahụ ebe a na-emegbu nwaanyị ajadụ? 
Kwụsị mmegbu a a na-emegbu ụmụnwaanyị ajadụ taa. Imegbu nwaanyị ajadụ bụ ihe ọjọọ na imegbu mmadụ ọbụla bụ ihe ọjọọ. Ya kwụsị taa. O si taa dị  mma, ọ dịbara gboo. 

Mmadụ niile bụ ozu, mana ozu dị ndụ ka ozu nwụrụ anwụ dị mkpa.

Onye a gwara kwe, a hụ ọzọ a gwakwa ya. Mana onye a gwara agwa ma ọ nụghị anụ, o mee emee, ọ hụ ahụ.

Onye emegbukwala nwaanyị ajadụ

Igbo ga-dị.

Ndeewo.

© Izunna Okafor, 2021.


**************************************************

Maka Onye Dere Edemede a


Izunna Okafor bụ nwaafọ Ebenator dị n'okpuru ọchịchị Nnewi Sawụtụ nke steeti Anambra. Ọ bụ onye edemede iduazị na abụ, onye nta akụkọ na onye nkwàlite asụsụ Igbo. Ọ gụrụ na mahadum Nnamdị Azikiwe dị n'Awka, bụ ebe o mere maka ihe ọmụmụ nhazi ọhanaeze bụ 'Public Administration' n'olu bekee.

Dịka onye edemede, o nwetala ntúrú ùgò na nkwanye ùgwù karịrị iri abụọ na ise n'ihe gbasaara edemede, site n'ala anyị na n'ogoogo mba òfèsi. Nturu ùgò na nkwanye ùgwù ndị ahụ gụnyere: Nigerian Writers Award/Indigenous Writer of The Year 2015/2016; Pita Nwanna Award for Igbo Literature 2015; Nigerian Heritage Icon Award/Young Writer of the Year Federal Republic of Nigeria 2016; Anambra Exclusive Youth Choice Award/Youth Writer of The Year 2016; Future Award Africa 2016/African Prize For Education; SLAM Hero Youth International Award/Innovative Youth of the Year 2016;  Inspire Award/Outstanding Youth in Academics 2017; Ezenwa Ohaeto Prize for Young Nigerian Novelists 2015; Campus Best Writer/Journalist of The Year 2018, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ.

Dịka onye nta akụkọ, ọ rụọla n'ụlọ mbipụta akwụkwọ akụkọ dị iche iche, ma bụrụkwa onye edemede na onye ntaakụkọ n'Igbo Radio.

Izunna na-ede akwụkwọ n'asụsụ Igbo na n'asụsụ bekee, ma bụrụkwa onye e jìrì ịkwàlìtè asụsụ na omenala Igbo wee mara.
O deela akwụkwọ asatọ, ma nwekwa edemede karịrị narị asatọ n'ọnụ ọgụgụ o bipùtagòrò n'ìkùkù. Ọ bụ onye isi òtù jikọtara ndị ntorobịa na-ede akwụkwọ n'ala Nigeria, ngalaba steeti Anambra.

Gụọ maka ya nke ọma ebe a: https://9jabooks.com/profile/484

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484