Ndị Ọmeiwu Anambra Asịla Obianọ ‘Jee Nke Ọma’ Dịka Ọchịchị Ya Gwụrụ

Mar 17, 2022 - 15:54
 0
Ndị Ọmeiwu Anambra Asịla Obianọ ‘Jee Nke Ọma’ Dịka Ọchịchị Ya Gwụrụ
Ndị Ọmeiwu Anambra Asịla Obianọ ‘Jee Nke Ọma’ Dịka Ọchịchị Ya Gwụrụ

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ndị omeiwu steeti Anambra nọrọ ụbọchị Tuzdee wee nwee ọgbakọ pụrụ iche ha jiri sị aka chịpụ̀rụ̀ steeti Anambra, bụ Maazị Willie Obianọ ‘Jee nke ọma’, dịka ọchịchị afọ asatọ ya bịagoro na njedobe na steeti ahụ.

Ọgbakọ ahụ pụrụ iche e mere n'ogige ụlọ ọgbakọ omeiwu steeti ahụ dị n'Awka bụ isi obodo steeti Anambra, ma bụrụkwa nke ọtụtụ ndị dị icheiche e ji okwu ha agba izu na steeti ahụ sonyere na ya.

N'okwu ya n'ebe ahụ, Ọkaokwu ụlọ omeiwu steeti Anambra, bụ Maazị Uchenna Okafor tòrò Maazị Obianọ maka ọtụtụ ọmarịcha ọrụ mnwògharị dị icheiche ọ rụrụ na steeti ahụ n'ime ahọ asatọ gara aga, ma kọwaa na ha hibere ya bụ ọgbakọ pụrụ iche kelekwa ya maka ezi mmekọrịta dị n'etiti ha bụ ndị omeiwu na isi ọchịchị steeti ahụ.

Dịka ọ na-akpọpụtasị ezi ọrụ ọkpụtọrọkpụ dị icheiche ọchịchị Obianọ rụrụ na steeti ahụ, Maazị Okafor mere ka a mara na ha na isi ọchịchị steeti ahụ rụkọrọ ọrụ ọnụ nke ọma, iji nye ndị Anambra ezi ọchịchị, ma kelekwa Obianọ maka ibìnyè aka n'ọmarịcha amụma iwu dị icheiche ha mere n'ụlọ omeiwu ahụ.

Ọtụtụ ndị omeiwu dị icheiche, nke gụnyere onye na-anọchite anya ọgbọ nta nkwàdo ‘Awka South’ nke mbụ n'ụlọ omeiwu ahụ, bụ Maazị Nnamdi Okafor; ògbò ya nke na-anọchite anya Anaọcha nke abụọ, bụ Maazị Ejike Okechukwu na ọtụtụ ndị ọzọ tìnyèrè ọnụ wee gbaa akaebe banyere ezi ọrụ Willie Obianọ rụrụ na steeti ahụ, nàkwà ezi mmekọrịta dị n'etiti ọchịchị ya na ndị omeiwu steeti ahụ; ma sịkwazie ya gaa nke ọma, dịka ọ na-enyefèzị ọkwa ọchịchị n'aka Ọkammụta Chukwuma Soludo.

Na nzaghachi, Maazị Willie Obianọ kèlèrè ndị omeiwu ahụ maka ọmarịcha okwu ha dị icheiche banyere ya na ọchịchị ya, ma gwakwa ha buru ekele n'ụkpa bugara ndị ọgbọ nta nkwàdo ha dị icheiche maka ezi nturuugo ahụ otu ndọrọndọrọ ọchịchị APGA nwetere na nhọpụta ọchịchị ọkwa gọvanọ e mere na steeti ahụ n'ime ahọ olenaome gara aga

O kwèrè ha nkwà na ọ gaghị echezọ ha, ọbụladị ma ugbua ọ rịtugoro n'ọkwa. Ọ rịọkwàzị̀rị̀ ha ka ha gakwa n'ihu nye Gọvanọ ọhụrụ steeti ahụ, bụ Ọkammụta Soludo ezi nkwàdó zuru oke, iji mekwa nke ọma karịa ya onwe ya, n'ọchịchị ya.

Ọkammụta Soludo, ndị eze ọdịnala, ndị kọmishọna, ndị ndu otu ndọrọndọrọ APGA, na ọtụtụ ndị ọzọ sònyèkwàra na ya bụ oke ọgbakọ pụrụ iche.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484