Onyeisi NCAA Agaala Njem Nleta n'Ebe A Na-Arụ Ọdụ Ụgbọelu Anambra

Mar 26, 2021 - 22:55
 0
Onyeisi NCAA Agaala Njem Nleta n'Ebe A Na-Arụ Ọdụ Ụgbọelu Anambra
Onyeisi NCAA Agaala Njem Nleta n'Ebe A Na-Arụ Ọdụ Ụgbọelu Anambra
Onyeisi NCAA Agaala Njem Nleta n'Ebe A Na-Arụ Ọdụ Ụgbọelu Anambra
Onyeisi NCAA Agaala Njem Nleta n'Ebe A Na-Arụ Ọdụ Ụgbọelu Anambra

Izunna Okafor dere akụkọ a

Onyeisi ụlọọrụ ahụ na-ahụ maka njem ụgbọelu n'ala Nigeria a maara dịka ụlọọrụ 'Nigeria Civil Aviation Authority' (NCAA), bụ Capt. Nuhu Musa etoola gọọmenti steeti Anambra maka agadaga ọrụ o ji n'aka n'ebe ahụ ọ na-arụ ọdụ ụgbọelu n'Ụmụeri dị n'okpuru ọchịchị ime obodo Anambra East nke steeti ahụ. 

Maazị Musa kwupụtara nke a oge ọ gara njem nleta n'ebe ahụ a na-arụ ya bụ ọdụ ụgbọelu mba ụwa, ya na aka na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Willie Obianọ; odeakwụkwọ ukwu steeti ahụ, bụ Ọkammụta Solo Chukwulobelu; Kọmishọna na-ahụ maka ọrụ na steeti ahụ, bụ Maazị Marcel Ifejiofor, nakwa ụfọdụ ndị ọzọ selitere isi n'ọrụ gọọmentị.

N'okwu ya oge ọ gagharịchara wee hụ ka ọrụ si aga n'ebe ahụ, Maazị Musa kọwara na ogoogo e ji arụ ya bụ ọdụ ụgbọelu bụ nke dabara adaba ma bụrụkwa nke kwụdisiri ike ma gbasokwa ogoogo mba ụwa n'eziokwu, n'ilekwasị anya n'etu e si arụ ya.

Ọ gbara akaebe na akụkụ ebe ahụ a maara dịka 'Control Tower' nke ọdụ ụgbọelu ahụ so na nke kacha mma n'ala Nigeria niile gbaa gburugburu, ma kọwakwa na ihe niile a chọrọ zùrù òké n'ebe ahụ, bụ nke na-egosi na ọ bụghị egwuregwu ka gọọmentị Anambra na-egwù n'ebe ahụ, maka na ọ kwadoro akwado.

O kwukwazịrị hoohaa na a rụchaa ya bụ ọdụ ụgbọelu, na ọ ga-enye aka n'ịkwalite ọnọdụ akụnụba na ọnọdụ mmepe mpaghara ebe ahụ na steeti Anambra n'izugbe.

Na mbụ n'okwu ya oge ọ na-edugharị ya n'ebe ahụ, Gọvanọ Obianọ nyere nkọwa banyere etu ya bụ ọrụ si aga, ma kwunwòó na ya bụ ọdụ ụgbọelu ga-amalite ịrụ ọrụ oge adịghị anya.

Gọvanọ Obianọ mere ka a mara na ya bụ ọdụ ụgbọelu ga-enye aka n'ọtụtụ ụzọ dị iche iche n'ịkwàlite ọnọdụ mmepe steeti ahụ, tinyere ọtụtụ úrù ndị ọzọ ọ ga-ewèta ma a rụchaa ya; ma kwekwazie nkwa ịgbasi mbọ ike hụ na a rụchara ya bụ ọrụ n'oge ahụ a kàrà àkà.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484