Gọvanọ Obianọ Ekwela Nkwa Ịkwàlitekwu Ezi Ọnọdụ Nchekwa n'Anambra

Mar 26, 2021 - 22:53
 0
Gọvanọ Obianọ Ekwela Nkwa Ịkwàlitekwu Ezi Ọnọdụ Nchekwa n'Anambra
Gọvanọ Obianọ Ekwela Nkwa Ịkwàlitekwu Ezi Ọnọdụ Nchekwa n'Anambra
Gọvanọ Obianọ Ekwela Nkwa Ịkwàlitekwu Ezi Ọnọdụ Nchekwa n'Anambra

Izunna Okafor dere akụkọ a

Aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obiano ekwenwòóla nkwà na ọchịchị ya agaghị ada mbà n'ibu agha megide mpụ na arụrụala n'ime steeti ahụ, ya na ime ka udo na ezi ọnọdụ nchekwa bụ ịgbà gaa n'ihu ịdị na steeti ahụ.

Gọvanọ Obianọ kwupụtara nke a oge ọ na-anabata onyeisi ndị ọrụ agha ala Nigeria e wetara ọhụrụ na mpaghara GOC 82 nke Enugu na-elekọta ndịda-ọwụwa anyanwụ, bụ 'Major General' Taoreed Lagbaja oge ọ bịara kpọtụrụ ya n'ebe obibi Gọvanọ dị n'Ọnịtsha.

N'okwu ya n'ebe ahụ, Gọvanọ Obianọ tòrò ndị ọrụ agha ala Nigeria na ụlọọrụ nchekwa dịgasị na steeti ahụ maka ezi ọrụ ha, bụ nke megoro ka e nwee ezi nchekwa na steeti ahụ, n'agbanyeghị aka ọrụ ndị omekoome na mkpamkpa ahụ ha malitekwara ịkpa na nsonso a. 

O kelere ndị ọrụ agha ala Nigeria maka ezi ọnụnụọkụ n'obi ha ịlụ ọgụ nchekwa na ibu agha megide mpụ, arụrụala na ndị omekoome, ma n'ime steeti ahụ ma na mpụga ya.

O gosipụtara ezi olileanya na mmasị ọchịchị ya ịga n'ihu na-arụkọ ọrụ ọnụ, ya na ụloọrụ agha ala Nigeria na ụlọọrụ nchekwa ndị ọzọ e nwere n'ime steeti ahụ, ọbụladị dịka o kwere nkwa ịga n'ihu na-enye ha nkwàdo zuru òkè.

Na mbụ n'okwu ya, onyeisi ndị ọrụ agha ahụ e wetara ọhụrụ, bụ 'Major General' Lagbaja, onye malitere ọrụ n'izuụka gara aga, mèrè ka a mara na ebumnobi o jiri bịa njem nleta ahụ bụ ka ya na Gọvanọ wee mara onwe ha, ya na ka o were mara ma jirikwa ya hụ ka ọnọdụ nchekwa siri gbata kwụrụ na steeti ahụ, dịka ọ dị ugbua, ọkachasị n'ilekwasa anya n'ajọ ọdachi ajọ ọnọdụ nchekwa ahụ dapụtara na mpaghara ebe dị iche iche n'ime steeti ahụ n'ime izuụka olenaole gara aga.

O bunyere Gọvanọ Obianọ ekele maka ihe dị icheiche o megoro na ngalaba nchekwa steeti ahụ, ya na ụzọ dị iche iche o sigoro kwàdó ma nyere ndị ọrụ nchekwa aka n'ọrụ ha site n'inyegasị ha akụrụngwa dị iche iche ga-enyere ha aka ime ka ọrụ ha kawanye mma ma dịkwa mfe. 

Dịka ọ na-agbarụ ihu banyere akaọrụ ndị omekóòmè ndị malitere ịwakpò ndị ọrụ nchekwa ma na-ebibìkwa ndụ na akụnụba na mpaghara ebe dị iche iche n'ime steeti ahụ na nsonso a; 'Major General' Lagbaja kwezịrị nkwa ezi njikọaka n'etiti ndị ọrụ ya na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ, iji weghachite ezi ọnọdụ nchekwa n'ime steeti ahụ.

Ọ dị ncheta na Gọvanọ Obianọ nọrọ na nsonso a wee mee mgbasaozi izugbe ntụmadị banyere ọnọdụ nchekwa steeti ahụ ugbua na etu o siri debe imi na ọnụ, bụ nke ọ nọrọ na ya wee kọwaa ihe dị iche iche na-eme na ngalaba nchekwa ugbua, ma kwuo na ọchịchị ya ga-aga n'ihu inye ndị omekoome ọsọ na steeti ahụ.

Ọ dịkwazị ncheta na ya bụ Gọvanọ nọrọ na nsonso a wee nye ezinụlọ ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa ahụ ndị omekoome gburu na nsonso a n'ime steeti ahụ ihe nkwàdo dị iche iche, iji gbàá ha ume, tie ha aka n'obi, ma nyere ha aka ịga n'ihu na-enwe ihe oriri n'ezinụlọ ha dị iche iche.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484