Obianọ Ekwenwòó Nkwà Ịkwàdò Ndị Ntorobịa Na Ụmụnwaanyị

Feb 7, 2020 - 00:36
Jan 24, 2021 - 01:32
 0
Obianọ Ekwenwòó Nkwà Ịkwàdò Ndị Ntorobịa Na Ụmụnwaanyị

Izunna Okafor, Awka

Aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ ekwunwòóla ezi njikere ya ịkwàdò na ịkwàlìtekwù ọtụtụ ndị ntorobịa na ụmụnwaanyị steeti ahụ, site n'ime ka ha sòro n'ihe a na-eme n'ime ahọ abụọ fọdụụrụ ọchịchị ya na steeti ahụ.

Ya bụ aka na-achị achị kwupụtàra nke a na nnukwu ọgbakọ weere ọnọdụ nso-nso a n'ogige 'Dọra Akụnyili Women Development Center', dị n'Awka, bụ nke a chịkọbàrà site na njikọaka òtù ndị ntorobịa a mààrà dịka 'United Anambra Youth Assembly (U-AYA)' na otu jikọtara ụmụnwaanyị, bụ 'United Anambra Women Assembly (U-AWA)'.

O tòrò ndị ntorobịa na ụmụnwaanyị steeti ahụ maka ezi agbambọ ha nà nkwàdo ha na-enye ọchịchị ya, bụ nke mere o jiri nweta mmeri n'okpuru ọchịchị ime obodo iri abụọ na otu e nwèrè na steeti ahụ, ọbụnadị dịka o kwupụtara na ọchịchị nwèrè ọtụtụ atụmàtụ dị iche iche ọ na-atụpụta maka ndị ntorobịa na ụmụakwụkwọ steeti ahụ.

Gọvanọ Obianọ, onye kwupụtàrà na isi òbòdo mba Austria bụ Vienna enyela ndị ntorobịa Anambra ruru iri ise n'ọnụọgụgụ ohèrè agụmakwụkwọ n'efù na mba Germany, kpọkùzịkwàrà ndị ntorobịa ka ha tinyekarịzie anya n'ọmụmụ ICT, chọọ òhère ọrụ na ngalabà ahụ, n'ihi na ụwa na-emezị ntụgharị ugbua.

Na mbụ n'okwu ya, onye chọpụtàra òtù U-AYA na U-AWA, ma bụrụkwa onye na-anọchite anya ọgbọ nta nkwàdo Anambra East na West n'ụlọ ọgbakọ nnọchianya etitì, bụ Maazị Chinedu Obidigwe kwùrù na ebumnobi mmemme ahụ bụ iji kwàlite ịdịnotu, ma kelekwazie Gọvanọ Obianọ maka ezi ọrụ ya dị iche iche na steeti ahụ.

O kwupùùrù ya maka inye ndị ntorobịa òhèrè dị iche iche n'ọchịchị ya, kelee ya maka ezi ọrụ mmepe ya nà inwòghàrị ndụ ụmụafọ steeti ahụ, ọbụnadị dịka o kwèzịrị nkwà na ndị òtù abụọ ahụ ga-aga n'ihu ịkwàdò ya na ịdọnyere ọchịchị ya úkwù iju rụzùó ezi ọrụ dị iche iche o ji n'aka na steeti ahụ.

Mmemme ahụ bụ nke gbadoro ụkwụ na nnukwu isi okwu pụtara (ma a tụgharịa ya) "Anambra: Ọrụ Dịịrị Anyị Niile," ma bụrụkwa nke e siri na ya wepụta isi okwu na-asị, (ma a tụgharịa ya) "Mkpa Ọ Dị Ka Ndị Ntorobịa Sonye n'Igwù Okwe Ndọrọndọrọ Ọchịchị, Iwulite Ala Anyị, Ya Na Ndịiche Dị n'Igwù Okwe Ndọrọndọrọ Na Ịkụ Asịrị."

Ndị ọzọ kwuru okwu na mmemme ahụ gụnyèrè nwa amadi ahụ bụ onyeisi ụlọ ọba ego ala anyị, bụ Ọkammụta Chukwuma Soludo, bụ onye nyere nkuzi na ya bụ mmemme; eze ọdịnala Nteje, bụ Igwe Rowland Odegbo; onyeisi ndị ọrụ nyegara Gọvanọ Obianọ, bụ Maazị Primus Ọdịlị, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ.

A nọkwàzịrị na ya bụ mmemme wee nye Gọvanọ Obianọ onyinye nkwanye ugwu pụrụ iche site n'aka ndị òtù ahụ, iji sị ya jisie ike n'ezi ọchịchị ya na steeti ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.