Ndị Ogbunike Etòóla Obiano Maka Ọrụ Mmepe Ya

Sep 24, 2020 - 23:58
Jan 24, 2021 - 23:59
 0
Ndị Ogbunike Etòóla Obiano Maka Ọrụ Mmepe Ya

Si n'aka Izunna Okafor

Ndị obodo Ogbunike dị n'okpuru ọchịchị Oyi nke steeti Anambra nọrọ na nsonso a wee fọọ ekele n'ụkpa, bunye aka na-achị steeti ahụ, bụ Gọvanọ Willie Obiano maka ọmarịcha ọrụ mmepe dị iche iche o ji n'aka na steeti ahụ. 

Ndị obodo a kwupụtara òtùtó a na obi ekele ha site na nnukwu mmemme nkwàdo ha chịkọbàrà nà ngagharị udo ha mere na nsonso a iji kelee ya bụ Gọvanọ. Mmemme ahụ bụ nke weere ọnọdụ n'ụlọ ezumeezu obodo ahụ, ma bụrụkwa nke imirikiti ndị obodo ahụ sonyere na ya, ma ndịisi ọchịchị obodo ahụ, ụmụnwoke, ụmụnwaanyị na ndị ntorobịa Ogbunike.

N'okwu ya na mmemme ahụ, onyeisioche mmemme ahụ ma bụrụkwa onyeisioche nchere oge n'okpuru ọchịchị ime obodo Oyi, bụ Maazị Nnamdi Nwadiogbu mèrè ka a mara na obodo Ogbunike na ụmụafọ obodo ahụ anaghị enwetabụ nkusa ume gọọmenti maọbụ mmetụta gọọmenti n'oge mbụ, wee ruo mgbe Gọvanọ Willie Obianọ bàtàrà n'ọkwa ọchịchị.

O mere ka a mara na ọchịchị Obianọ èwètela ọtụtụ mmepe na mnwògharị na ngalaba niile nke steeti ahụ na obodo ahụ. Ọ kpọkukwazịrị ndị na-akụgharị asịrị site n'usoro nzikọrịtaozi dị iche iche iche iji kpụtọọ aha Gọvanọ Obianọ na ọrụ ọma ya, gwa ha ka rakpuo ire ha, ma ga chọọ ihe ha ga-eme iji bàára onwe ha úrù, n'ihi na ọrụ ọma Gọvanọ Obianọ pụtara ìhè ma bụrụkwa bụ ihe a gba n'aka e jighị enyò elele.

Na ntụnye nke ya, onyeisi ọchịchị nchere oge n'obodo ahụ, bụ Maazị Chukwugozie Ikegulu kpọpụtasịrị ụfọdụ ihe ọma dị iche iche obodo ahụ ritegoro site n'aka ọchịchị Gọvanọ Willie Obianọ. O kelekwara nwunye Gọvanọ, bụ Oriakụ Eberechukwu Obianọ, maka ihe ukwu dị iche iche ya onwe ya na-eme site n'òtù ọrụ obi ebere ya bụ 'Caring Family Enhancement Initiative (CAFE)', ma jaa ya ike, sị ya ka o jide ka o jì.

O kwuru na Gọvanọ Obianọ na-ewepụtasị atụmatụ bụ ịgbà ma na-akwalitekwa ọnọdụ mmepe na ọnọdụ obibi ndụ ụmụafọ steeti ahụ; ma kpọkuzie ya na nwunyè ka ha leghàrá ndị asịrị anya ma jisie ike n'ọrụ ọma dị iche iche ha ji n'aka na steeti ahụ.

N'okwu ya, onyeisi òtù jikọtara ndị na-azụ ahịa na steeti ahụ (bụ 'Anambra State Market Traders Association, ASMATA') bụ Maazị Ikechukwu Ekwegbalu gbara akaebe na Gọvanọ Obianọ na-emeta ndị na-azụ ahịa na steeti ahụ mma site n'ọmarịcha atụmatụ dị iche iche na ọrụ ọma ya, ma kwezie nkwà na ha agaghị ada mbà n'ịkwàdò ya na oriakụ ya bụkwa Ada Ogbunike.

Ndị obodo ahụ jikwazịrị otu olu wee kpọkuo Gọvanọ ma rịọ ya ka ọ rụchapụrụ ha ụfọdụ ọrụ ndị ọzọ o ji n'aka na steeti ahụ ma mekwuoro ha ụmụ ihe ole na ole maka na ọ na-abụ e tòó onye gburu ewu, ọ hụ ehi, o gbuo.

Ndị ahụ bùùrù egwu wee gbagharịa ebe dị iche iche n'obodo ahụ, nke gụnyere Ahịa Oye-Olisa, ma na-etòkwa Gọvanọ Obianọ na nwunye ya maka ọrụ ọma ya. Ndị dị iche iche sogoro rite úrù n'ọtụtụ ụzọ dị iche iche site n'okpuru atụmatụ CAFE sònyèkwàrà na mmemme ahụ, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ e ji okwu ha agba izu n'ọchịchị obodo ahụ na steeti Anambra.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.