Nrurita uka ihu na ihu Obama na Romney

Nrurita uka ihu na ihu Obama na Romney

Oct 18, 2012 - 05:50
Jan 20, 2021 - 05:51
 0
Nrurita uka ihu na ihu Obama na Romney

N’agba nke mbụ nrụrịta ụka ahụ, Romney meriri Obama, onye mega anya ụra ụbọchi ha nwere yabụ nrụrịta ụka n’abalị 3 nke ọnwa ọkụtoba a.

Ụnyahụ, onye isi ala mba Amerịka, bụ Barack Obama, na Mitt Romney, onye ji aha ndị otu Rịpọlikan azọ ọkwa onye isi ala mba ahụ, nwere nrụrịta ụka. Nke a mere ka o mechera izu ụka abuọ ha abụọ nwere agba nke mbụ nrụrịta ụka ahụ na mahadum Steeti Denver, na Nwenezdee, abalị 3 nke ọnwa ọkụtoba afọ 2012.

N’agba nke mbụ nrụrịta ụka ahụ, Romney meriri Obama, onye mega anya ụra ụbọchi ha nwere yabụ nrụrịta ụka n’abalị 3 nke ọnwa ọkụtoba a. N’agba nke abụọ ya ha mere ụnyehụ, Obama jiri anya nwoke ji anyụ nsị pụta. O gosiri Romney na nwata bulie nna ya elu, ọgọdọ nwụchie ya anya. Ndị nta akụkọ na ndị okwu na-adị mma n’ọnụ kwuru na Obama meriri Romney n’agba nke abụọ nrụrịta ụka ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.