E gbuona ochu na Saskatoon
E gbuona ochu na Saskatoon
![E gbuona ochu na Saskatoon](https://igboradio.com/uploads/images/2021/01/image_750x_6007c6040f21d.jpg)
N’ụzọ ụtụtụ taa bụ abalị mbụ nke ọnwa jenuwarị, ndị uwe-ojii na Saskatoon, na Kanada, nwetere oku gbanụ gbanụ, bụ oku 911.
Mgbe ha ruru na 100 Block, Avenue O South, ha hụrụ otu nwata-nwoke gbara afọ 28, ebe ọ nọ n’ọnọdụ ọ dị ndụ ọnwụ ka mma. Mgbe ha lere anya ọfụma, ndị uwe-ojii chọpụtara na a sụrụ nwata-nwoke ahụ daga.
E buru ya ọsịịsọ gawa n’ụlọ ọgwụ Royal University. Ndị uwe-ojii na-akọwa na nwoke ahụ mechara nwụọ. E nwebeghị onye a na-atụ aka na ya gburu ọchụ a. Ndị uwe-ojii na-akpọ ndị Saskatoon oku. Onye ọ bụna hụtara, ma ọ bụ matara ihe merenu, biko kpọọ ha na 1-800-222-8477.
What's Your Reaction?
![like](https://igboradio.com/assets/img/reactions/like.png)
![dislike](https://igboradio.com/assets/img/reactions/dislike.png)
![love](https://igboradio.com/assets/img/reactions/love.png)
![funny](https://igboradio.com/assets/img/reactions/funny.png)
![angry](https://igboradio.com/assets/img/reactions/angry.png)
![sad](https://igboradio.com/assets/img/reactions/sad.png)
![wow](https://igboradio.com/assets/img/reactions/wow.png)