Ndi uwe ojii egbugo Tamerlan, jido Dzhokhar na Watertown

Ndi uwe ojii egbugo Tamerlan, jido Dzhokhar na Watertown

Apr 20, 2013 - 21:09
Jan 20, 2021 - 05:15
 0
Ndi uwe ojii egbugo Tamerlan, jido Dzhokhar na Watertown

Igidi ọgụ ahụ mmadụ abụọ ndị omekome ahụ tụrụ ogbunigwe na Boston na ndị ọrụ nchekwa na-agba kemgbe mkpụrụ abalị anọ abịago n’isi njedebe.

Mkpụrụ abalị ise gara aga, ụmụ nne n’abọ, Tamerlan Tsarnaev, gbara afọ 26, na Dzhokhar Tsarnaev, gbara afọ 19  tụrụ ogbunigwe n’ogige ebe  a na-eme mmemme ịgba ọsọ Boston maratọnụ. Kemgbe ahụ ka ndị uwe ojii na ndị FBI na-achọ ha.

N’abalị nwanne ụnyahụ, ụmụ nne n’abọ ahụ jere na Watertown nara otu onye ụgbọala ya n’ike. Ha gburu otu onye owe ojii, Sean Collier, na-arụ ọrụ na Massachusetts Institute of Technology (MIT), merụọ onye uwe ojii ọzọ, Richard Donahue, ahụ.

Ndị ọrụ nchekwa mechara gbaa ha gburugburu, ha na ha were malite ịkwarịta mgbọ. Ndị uwe ojii gburu otu n’ime ụmụ nne n’abọ ahụ, nke obere, Dzhokhar Tsarnaev, jiri ụgbọ ala ahụ ha zuru n’oshi gbanarị ndị uwe ojii. Ndị uwe ojii chọjuru ya afọ na mpaghara Boston.

N’oge uhuruchi, otu onye hụrụ ebe Dzhokhar zoro n’ụgbọ mmiri  dị n’azụ ụlọ ya, were gbara ndị uwe ojii ama. Mgbe ha rutere ebe a ahụ ha malitere ịkwarịta mgbọ. E merụrụ Dzhokhar ahụ were jidezie ya. E bujere ya n’ụlọ ọgwụ na Boston.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.