Ọkụ Agbarikọọla Ebe A Na-Azụ Anụ Ụlọ N'Ukpo

Feb 7, 2020 - 00:29
Jan 24, 2021 - 01:41
 0
Ọkụ Agbarikọọla Ebe A Na-Azụ Anụ Ụlọ N'Ukpo

Izunna Okafor, Awka

Ọ kpọtụrụ akpọtụ ma zụọ azụọ nso nso a n'Ukpo dị n'okpuru ọchịchị ime obodo Dunukọfịa nke steeti Anambra, dịka ajọ ọkụ ọgbụgba dabìdòrò ma gbarikọọ ebe a na-azụ anụ ụlọ, bụ 'Sunday Ezeaku Modern Integrated Agricultural Farm' dị na Ndiagụ-Isiekwulu.

Ya bụ ajọ ọkụ ọgbụgba ka e kwùrù na ọ gbarìkọrọ ụlọ nwere ọnụ ụlọ ise, nnukwu itè nchekwa mmiri, nnukwu igwe na-enye ọkụ, ihe e jiri anụ nri, ewu, ézì, nchì na ihe ndị ọzọ.

N'okwu ya bànyere nke ahụ, onye nwe ebe ahụ, bụ Maazị Sunday Ezeakụ, kọwàrà na ya na ndị ezinaụlọ ya adịlaarị na mbụ menyụọ ọkụ nke na-agbabụ n'ọhịa dị n'akụkụ be ya, mana ha amaghị na ya bụ ọkụ abànyelarị n'ụlọ anụ ya.

O kwùrù na ihe ọkụ mèrè n'ụlọ anụ ya, bụzị nke ha chọpụtàrà echi ya, mèzịrị ka o siere ya ike ịsọnyụ ọkụ ahụ, ya na ndị ezinaụlọ ya na ndị ọzọ gbataara ya ọsọ enyemaka ike, tupuu ndị ọrụ nsọnyụ ọkụ na ndị uwe ojii abịaruo ebe ahụ.

Maazị Ezeakụ, bụ onyeisi ọrụ oyibo n'oge gara aga, kọwara ya bụ ọkụ ọgbụgba dịka oke ihe ọdachi, ma rịọkwazie enyemaka ndị mmadụ na gọọmenti steeti ahụ, iji nyere ya aka ịkwụrụkwa chịm ọzọ n'ịzụ anụ ya, n'ihi na mmadụ anaghị adị mma ọ dàá ka ọ tọbirizie ebe ọ dara.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.