Ọkaokwu Anambra Akpọkuola Ndị Anambra Nọ Mba Ofesi Ka Ha Wèlatruo Akụ Ha Ụlọ

Nov 29, 2021 - 22:16
 0
Ọkaokwu Anambra Akpọkuola Ndị Anambra Nọ Mba Ofesi Ka Ha Wèlatruo Akụ Ha Ụlọ

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ọkaokwu ụlọomeiwu steeti Anambra, bụ Maazị Uche Okafor akpọkuola ụmụafọ steeti Anambra nọgasị mba ofesi ka ha welataruo akụnụba ụlọ site n'ịbịa rụọ ụlọọrụ, ụlọ mmepụta ngwaahịa, na ihe mwunye ndị ọzọ, iji nye aka kwàlitekwuo ọnọdụ mmepe steeti ahụ.

Maazị Okafor kpọrọ oku a mgbe ọ gara njem nleta n'ebe ahụ a na-arụ agadada ogige ụlọahịa 'Akaeze Multi Services', bụ nke a na-arụ n'Awka site na njikọaka ụlọọrụ na-ahụ maka nkwàlite ewumewu ụlọ na steeti Anambra.

O tòrò ọrụ ahụ na ogoogo e ji arụ ya, kwupụta afọojuju ya banyere ya bụ ogige a na-arụ, ma kelekwa onye na-arụ ogige ụlọahịa ahụ maka iwelataru akụnụba ya ụlọ. O kwuru na nke ahụ dabara adada n'oku 'akụ ruo ụlọ' ahụ Gọvanọ Obianọ na-akpọ ndị Anambra bi na mba ofesi na ndị bi na steeti dị icheiche.

O kwuru na a rụchaa ya bụ ụlọahịa, na ọ ga-enye aka ikewàpụta ohere ọrụ nye ụmụafọ steeti ahụ, ọkachasị ndị ntorobịa, tinyere ọtụtụ uru ndị ọzọ ọ ga-ewèta. O kelekwara aka na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Obianọ maka ịdọtasị ndị ojiego achụ ego n'ime steeti ahụ site n'ime ka e nwee ezi ọnọdụ dị larịị maka ndị ojieego achụ na nkwalite ezi ọnọdụ akụnụba.

O kwuru na ndị ahụ na-arụ ihe ahụ enwetela akwụkwọ niile na nkwàdo niile ha kwesiri inwete maka ọrụ ahụ ha na-abagide, ma kelekwa òtù ọrụ na-ahụ maka ọrụ n'ụlọ omeiwu ahụ, maka ịhụ na a na-arụ ya bụ ogige ụlọ ahịa n'ogoogo kwesiri ekwesi.

Na ntụnye nke ya, onyeisi ụlọọrụ 'Anambra State Housing Development Corporation', bụ Maazị Willie Okafor nyere nkọwa banyere ya bụ ogige ụlọahịa

Dịka o siri kọwaa, eserese ụlọ ahụ nwere ebe a na-egwu mmiri, ebe a na-emesapụ ahụ, ebe a na-elele onyoonyoo, ebe a na-ere nri, ebe a na-eregasị ụfọdụ ihe dị icheiche, tinyere ihe ndị ụzọ dị icheiche a na-eme n'ogige ahụ.

Ọ gbakwara akaebe na ya bụ ogige ụlọahịa ga-enye aka ịkwàlitekwu na ime ka mma nke Awka bụ isi obodo steeti Anambra chawapụtakwuo n'uju.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484