Ọka Ọhụrụ Apụtala

Jun 12, 2021 - 23:05
 0
Ọka Ọhụrụ Apụtala

Chinwendu Uzoatu dere edemede a


Ọka bụ ihe oriri na-amasị nwoke na nwaanyị, ma onye ukwu ma onye nta. O so n’ihe izizi na-apụta n’ime ihe ndị ọzọ niile a na-akọ n’ugbo. Ndị mmadụ na-eji ọńụ anabatata ọka n’ihi na mmadụ niile na-ata ma na-ejikwa ya eri ihe ndị ọzọ dị iche iche.

A na-eji ube ata ọka ma jirikwa akụoyibo na-ata ya. N’ụzọ dị otu ahụ, a na-ahụ ya n’ọkụ maọbụ sie ya esi, ebe ụfọdụ na-eghekwa ya eghe. Ka o siri dị bụ na ọka na-atọ ụtọ, otu ọbụla e siri kwado ya.

Ọzọ dị ka ibe ya bụ na a na-ejikwa ọka esikọ ihe ndị ọzọ dịka agwa, abacha, ụkwa, akịdị w.d.g. Ọ na-abụ ezigbo erimeri mgbe ọbụla e jiri ọka sikọọ otu n’ime ihe ndị a. Ọ na-atọ ụtọ ma na-enyekwa ihe n’ahụ. Onye richaa, ọ na-ańụ mmiri.

Ka ọ dị ugbu a, ọka na-apụta nwayọọ nwayọọ, ọtụtụ ndị na-akọ ya ebupụtabala ya n’ahịa. Otu o siri dị ugbu a, o jubeghị eju ebe niile. Dịka a na-ere ya n’ahịa a na-ahụkwa ya n’ọkụ na njikọ tinyere akụkụ ụzọ dị iche iche, ma na-esikwa ya esi.

Ọtụtụ ndị mmadụ ekwuputala obi ha banyere ọka ọhụrụ na-apụta ugbua.

Ken Ugwuanyị: Ọka bụ ezi ihe oriri. Ataala m ọka ọhụrụ. Ọka nke m tara tọrọ ụtọ nke ukwu. Hei, ọ tọka! Egotere m ya n’aka ndị na-ańa ọka n’akụkụ ụzọ ebe m bi. Ha hụrụ ya nke ọma, nke na ị na-ata, ọzọ a na-agụ gị. Ma ihe m chọpụtara bụ na ụkwara na-akwa m tupu m taa ọka ahụ, mana ka ọ dị ugbu a ụkwara ahụ ekwezighị akwụsị akwụsị. Amaghịzịm ma ọ bụ ọka ọhụrụ ahụ m tara mere na ụkwara ekwezịghị akwụsị. Ihe m ji ekwu bụ na amaghị m ma ha ahụkwara ya ka o ghee nke ọma n’ọkụ.

Oriakụ Uche: Abụ m onye ọrụ oyibo. Ọka so n’ihe ndị m na-akọ n’ugbo m n’ihi na ọ na-enye m ọńụ ma m bido gbutebe ya. Maka m na-egbute ọka n’ugbo m, m na-erekwa ya n’ahịa were na-enweta ego. Ọka bụ ara na-azụ nwa, a na-esi ya esi, a na-ahụ ya n’ọkụ ma jirikwa ya na-esikọta erimeri ndị ọzọ. Ọka bara nnukwu uru. Ọ na-eju afọ ma na-enyekwa ego.

Nwakaego Ume: Ataala m ọka ọhụrụ. Mmadụ gotere ọka a hụrụ n’ọkụ nyetụ m. Ọka ahụ tọrọ ụtọ nke ukwu maka na ọ bụ ụbọchị ahụ ka e gbutere ya n’ugbo. Ụtọ ọka bụ ma ị taa nke e gbutere ụbọchị ahụ. Ọka dịrị gaba abalị olemole e gbutere ya, ọnaghị atọcha ụtọ dịka o kwesịrị. Ugbu a ọka ọhụrụ na-apụta n’ike n’ike, obi na-atọ m ụtọ maka na ọka na-amasị m nke ukwu. Ejighị m ya egwu egwu, ana m ata ma nke a hụrụ n’ọkụ ma nke e siri esi. Eji m ya eme ihe oriri. Mgbe ọbụla m tara ọka, anaghị m achọzị ihe ọzọ m ga-eri, ihe m na-emezi bụ ịdị na-ańụ mmiri. Ọzọ dịka ibe ya bụ, e wepụgodu na ọka na-atọ ụtọ, ọ na-enyekwa ihe n’ahụ maka na ọ bụ ezigbo nri.

Ogoegbu Nneka: Ana m ere ọka afọ ọbụla. N’afọ a, ọka amalitela ịpụta nwayọọ nwayọọ. Ka ọ dị ugbu a, ọ na-agala ọnụ maka na o jubeghị eju n’ahịa. Ana m esi Awka gaa Onitsha gota ọka. Ihe a na-ere otu akpa ọka ugbu a nọ n’agbata puku naịra asaa, mgbe ụfọdụ o tinye etinye maọbụ wepu ihe. Anyị buru ya lọta Awka, anyị a na-eresi ndị mmadụ site n’otu anyị siri gota. Ndị mmadụ na-agba anyị akaahịa nke ọma, ma ndị na-ere ere ma ndị na-egoro ya laa be ha, jiri aka ha kwado ya otu ha siri chọ. I buru ọka na-abata, ozugbo ahụ ka ndị mmadụ ga-abịa n’ọdụ ahịa gị na-egokọrọ ọka.

Dịka m kwuru na mbụ, ọka dị oke ọnụ ugbu a, mana enwere m olile anya na ọ ga-adatu. Oge adịghị anya ọka ga-eju n’ahịa, nke na ọ ga-abụ atụrụ taba. Onye ọbụla ga-ataju ọka afọ. I legharịa anya, ị ga-ahụ na ọka na-eme nke ọma n’ugbo niile dị na gburugburu anyị.

Cynthia Eze: Ozugbo m malitere ịhụ ọka n’akụkụ ụzọ ebe a ka ndị mmadụ malitere na-ego ọka na-ata. Ọtụtụ na-abịa were oche na-eche ka m hụpụta ọka. Ka ọ dị ugbu a, ihe a na-eresị anyị ọka bụ anọ maọbụ atọ narị naịra abụọ; m hụchazie m na-eresi ndị mmadụ otu ọka otu narị naịra.

Ana m agba mbọ na-egota ole ọka m ga-enwe ike rechaa n’otu ụbọchị. Nke a pụtara na ana m aga ahịa egota ọka ụbọchị ọbụla. Mgbe ụfọdụ ana m agakwa n’ugbo, gote ọka. Mgbe ọbụla m siri n’ugbo gote ọka, ọ na-enye m afọ ojuju maka na ọka ọbụla a hụrụ n’ọkụ ozugbo e gbutere ya na-atọ ụtọ n’ụzọ pụrụ iche. Ndị mmadụ na-ata ya n’eleghị ego anya n’ihu. Ụmụikorobịa bụ ndị kacha agba m aka ahịa. Ha na-abịa nọrọ ala taa ọka ma gonyekwa ndị enyi ha. 

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484