Ogbunigwe gburu mmadu 3, meruo mmadu 176 ahu na Boston

Ogbunigwe gburu mmadu 3, meruo mmadu 176 ahu na Boston

Apr 18, 2013 - 05:25
Jan 20, 2021 - 05:25
 0
Ogbunigwe gburu mmadu 3, meruo mmadu 176 ahu na Boston

Mgbọ ogbunigwe awụnyego aja na garrị n’obodo Boston, na Steeti Massachusetts, na mba Amerịka. N’ụbọchị Mọndee, ụwa niile gbakọtara na Boston maka asọmụmpi ọsọ onye mere ike ya, nke a kpọrọ Boston marathon, n’olu bekee.

Ndị omekome jere lie mgbọ ogbunigwe abụọ n’ogige ebe e mere maka ịkwụsị ọsọ. Ogbunigwe ahụ gbawara n’ebe elekere abụọ nke ehihe na Boston were chụjuo ndị mmadụ ọhịa n’ụzọ. Mgbe anwụrụ ọkụ gafechara, a chọpụtara mmadụ atọ nwụrụ anwụ, gụnyere otu obere nnwa a na-akpọ Martin, onye ndị mmadụ daara abalị na Boston ụnyahụ.

Kemgbe Mọndee ahụ, ndị uwe ojii na ndị FBI na-agbakeri ala na-achọ onye nyụrụ ụdịrị nsị a n’igbudu ahịa. Ụnyahụ, ha gosiputere photo okpokoro ite igwe na nkirika akpa ojii e jiri rọchi nsị egbe mgbọ ogbunigwe ahụ.

Mmadụ 3 nwụrụ anwụ, ebe mmadụ 176 merụrụ ahụ. Ndị dibịa bekee n’ụlọ ọgwụ Boston kwuru na ha hụrụ ụdị mmerụ ahụ dị iche iche, ma ndị e bere ụkwụ, ma ndị e bere aka.

Ndị uwe ojii na ndị FBI kpọrọ oku ka onye ọ bụna matara, m’ọ bụ, hụrụ onye merụrụ ala a mee ka ha mata. Ha kpọrọ ndị niile setere photo m’ọ bụ ihe nkiri vidio zitere ha ya.

Taa bụ Nwenezdee, ndị uwe ojii kwuru na, site n’ihe vidio ndị rutere ha aka, ha ahụtagorị mgbe otu nwoke dọwara akpa ebe ahụ ogbunigwe ahụ gbawara, kama na ha achọpụtabeghị onye ọ bụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.