Obianọ Agbapeela Ụlọ Ọrụ Nsucha Osikapa Coscharis n'Ịgbarịam

Oct 3, 2019 - 01:28
Jan 22, 2021 - 05:51
 0
Obianọ Agbapeela Ụlọ Ọrụ Nsucha Osikapa Coscharis n'Ịgbarịam

Izunna Okafor, Awka, Nigeria

Oke ọñụ dara ụnyaahụ n'Ịgbarịam dị n'okpuru ọchịchị 'Anambra East' nke steeti Anambra, dịka aka na-achị steeti ahụ, bụ Gọvanọ Willie Obianọ gbàpèrè ụlọ ọrụ ọhụụ nke Coscharis, bụ ebe a ga na-esuchapụta osikapa.

N'okwu ya oge ọ na-agbape ya bụ ụlọ ọrụ, Gọvanọ Obianọ mere ka a mara na ụlọ ọrụ Cọscharis atụnyela ụtụ dara ụda n'ịkwàlite ngalaba ọrụ ugbo steeti ahụ, bụkwa nke o kwùrù na ọ dabàrà adabà n'atụmatụ ọchịchị ya ji n'aka n'inwògharị ngalaba niile nke steeti ahụ na ịkwàlite ọnọdụ akụnụba steeti ahụ, maka na mnwògharị ọrụ ugbo so n'otu n'ime ide anọ nke ọchịchị ya gbakwàsàrà ụkwụ were arụ ọrụ.

O mere ka a mara na ịgbape ya bụ ụlọ ọrụ nsucha osikapa, bụ nke a rụrụ site na njikọ aka steeti ahụ na ụlọ ọrụ Cọscharis, emeela ka ọnụ ọgụgụ ụlọ ọrụ nsucha osikapa dị na steeti ahụ dịzie asatọ, ma bụrụkawa ndị nwere ikike isuchapụta karịa tọn narị asatọ na iri anọ na iteghete, ma mekawazie ka a mara na ya bụ steeti ka nwère ohere na ezi ọnọdụ dị larịị maka ndị oji ego achị ego chọrọ ịbata ebe ahụ wunye akụnụba ha.

Mmemme ịgbape ụlọ ọrụ ahụ nwéré ikike isucha osikapa ruru metric ton otu narị puku na ụma iri abụọ, bụ nke dọtara ọtụtụ ndị iche iche sonyere na mmemme ahụ gụnyèrè onyeisi ụlọ ọba ego ala anyị, bụ Maazị Godwin Emefiele; aka na-achị steeti Kebbi, bụ Gọvanọ Atiku Bagudi; Minista na-ahụ maka ọrụ ugbo n'ala Nigeria, bụ Alhaji Sabo Nanono, Ọkaokwu ụlọ ọgbakọ omebe iwu steeti Anambra, bụ Maazị Uchenna Okafor; ndị eze ọdịnala, ndị omebe iwu, nakwa ọtụtụ ndị ọzọ e ji okwu ha agba ìzù n'ala Nigeria na mpụga ya.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.