N'Anambra, Otu Onye Ọzọ Anwụọla n'Ihe Mberede Okporo Ụzọ

N'Anambra, Otu Onye Ọzọ Anwụọla n'Ihe Mberede Okporo Ụzọ

Nov 20, 2020 - 00:47
Jan 19, 2021 - 00:48
 0
N'Anambra, Otu Onye Ọzọ Anwụọla n'Ihe Mberede Okporo Ụzọ

By Izunna Okafor

Otu onye zutere ọnwụ mberede ya na nsonso a, dịka otu nnukwu ụgbọala nwèrè ihe mberede okporo ụzọ n'Ụmụnze, dị n'okpuru ọchịchị Orumba South nke steeti Anambra.

Onye na-ahụ maka mgbasa ozi n'ụlọọrụ na-ahụ maka njem awele okporo ụzọ, bụ ụlọọrụ 'Federal Road Safety Corps' (ngalaba ya nke steeti Anambra), bụ RC Kamal Musa bụ ya mèrè ka ụwa mara nke a site n'ozi ọ kụpụrụ banyere nke ahụ 

O kwuru na ọ bụ ịgba oke ọsọ kpatara ihe mberede ahụ, dịka ozi e nwetàrà n'aka ndị ọnọmgbeomere siri kọwaa. Ọ sị na onye na-anya ụgbọala ahụ na-agba oke ọsọ, ya bụ ụgbọala wee pụnahị ya n'aka, nke na o nweghịzị ike ijidenwu ya, o wee kpọrikọọ onwe ya, na ndị ọzọ nọ n'ụgbọala ahụ.

O mere ka a mara na otu onye n'ime mmadụ atọ nọ n'ụgbọala ahụ nwụrụ ozigbo, ebe mmadụ abụọ ndị ọzọ nwètàrà mmerụahụ. Ọ sịkwazị na ndị ọrụ FRSC tinyèrè ozu onye ahụ nwụrụ anwụ n'ụlọ nchekwa ozu, ebe mmadụ ndị ọzọ mérụrụ ahụ bụkwazị ndị e buru gaa ụlọ ahụike maka inye ha ọgwụgwọ.

N'akụkọ dịkwa ka ibè ya, mmadụ ruru iri n'ọnụọgụgụ nọkwara na nsonso a wee nweta mmerụahụ n'ihe mberede okporo ụzọ dapụtàrà na njikọ ụzọ Eze Ụzụ dị n'Awka bụ isi obodo steeti Anambra, oge nnukwu ihe mberede ọzọ dapụtàrà na mpaghara ebe ahụ.

N'okwu ya banyere ihe mberede okporo ụzọ ndị ahụ, onyeisi ụlọọrụ FRSC na steeti Anambra bụ Maazị Andrew A. Kumapayi kpọkukwazịrị ma dụọ ndị na-anyà ụgbọala ka ha na-akpachapụ anya oge niile, zèére ịgba oke ọsọ, ma jirikwa uchè na-anya ụgbọala. O kwuru na ihe ndị ahụ so n'ihe na-eweta ihe mberede okporo ụzọ aghara aghara, ma nye ndụmọdụ ka ndị na-anya ụgbọala zèére ihe ndị ahụ iji belata oke ndapụta ihe mberede okporo ụzọ.

O kpekwazịrị ka mkpụrụobi onye nwụrụ anwụ zuo ike na ndokwa, ma kpee ka ndị nke nwetara mmerụahụ gbakere n'oge adịghị anya.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.