Na Lagos, Ọkụ Ọgbụgba Emeela Mkpamkpa n'Ahịa Ladipo

Jun 2, 2021 - 20:13
 0
Na Lagos, Ọkụ Ọgbụgba Emeela Mkpamkpa n'Ahịa Ladipo

Izunna Okafor dere akụkọ a

Nnukwu ihe ọdachi dakwàsàrà ụfọdụ ndị na-azụ ahịa n'ime ahịa Ladipo dị na Mushin nke steeti Lagos, dịka ajọ ọkụ ọgbụgba dị egwù dapụtara n'ebe ahụ na nsonso a, wee gbarikọọ ngwaahịa gburu ego dị nde kwùrú nde naịra.

Dịka akụkọ siri kọọ, ọkụ ọgbụgba ahụ dapụtara n'oge ụtụtụ, ma bụrụkwa nke malitere n'otu ime ọdụ ahịa ebe a na-ere akụkụ ahụ ụgbọala na mpaghara Alapeju n'ime ahịa Ladipo ahụ.

N'ozi ọ kụpụrụ banyere ọkụ ọgbụgba ahụ, onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ụlọọrụ 'Lagos State Emergency Management Agency' (LASEMA), bụ Maazị Nosa Okunbor mèrè ka a mara na a gbanyụrụ ọkụ ahụ ozigbo site n'aka ụlọọrụ ahụ na ndị njikọaka ha, bụ ndị ha na ha na-arụkọ ọrụ ọnụ.

O mere ka a mara na ha nwètàrà ozi n'ụlọọrụ ahụ banyere ọkụ ọgbụgba ahụ, bụzị nke mere ha jiri gbara ọsọ ozigbo wee gaba n'ebe ahụ, maka ịgbanyụ ya bụ ọkụ.

O kwuru na ọbịbịa ha n'ebe ahụ na ọrụ nsọnyụọkụ ha mèrè ka a ghara inwe onye ọbụla nwụrụ n'ahịa ahụ, ma gbochiekwa mbibì ọtụtụ ngwaahịa n'ebe ahụ.

O kwuru na ọdachi ahụ dọtàrà ọtụtụ ndị mmadụ ndị bi nso na gburugburu ahịa ahụ, na ndị ọzọ gbatara ọsọ n'ebe ahụ, bụ ndị bịara iso nye aka n'ịgbanyụ ọkụ ahụ, maọbụ nye aka n'ibupụtà ngwaahịa ụfọdụ maka ịgba ọkụ.

N'okwu nke ya, onyeisi ụlọọrụ LASEMA, bụ Olufemi Oke-Osanyintolu kọwara na ngwangwa ha wụchara n'ebe ahụ, na ha hụrụ na ọkụ ahụ na-enwu vuu n'otu nnukwu ụlọelu dị n'ebe ahụ, bụ ebe ọdụ ahịa ndị mmadụ dịgasị.

O mekwazịrị ka a mara na ụlọọrụ dị iche iche nyeere ha aka iji wee gbanyụọ ọkụ ahụ, ma sị na a ka na-eme nnyòcha iji chọpụta ihe ọ bụ ya kpatara ọkụ ọgbụgba ahụ. 

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484