N'Ukpor, Ndị Be Agbasi Agbaarala Ndị Obodo Ekeresimesi na Ahọ Ọhụrụ

Jan 3, 2022 - 07:27
 0
N'Ukpor, Ndị Be Agbasi Agbaarala Ndị Obodo Ekeresimesi na Ahọ Ọhụrụ


Izunna Okafor dere akụkọ a

Ihe karịrị otu puku ndị ikom na ndị inyom bi na Mputu, dị n'Ukpor bụ́ isi obodo okpuruọchịchị 'Nnewi South' nke steeti Anambra, jiri ihu ọchị na àkpà osikapa na ọtụtụ ihe onyinye ndị ọzọ wee laa n'ụlọ ha dị icheiche na nsonso a. Nke a bụ dịka nnukwu ụmụnne abụọ bụ ụmụafọ obodo ahụ ọrụ obiebere na-atọ ụtọ, bụ Chiifu Mike Agbasi, onye a maara dịka Ikenga Ukpor; na nwanne ya nwoke, bụ Chiifu Matthew Agbasi, onye a maara dịka Ọnọnenyi 1 n'Ukpor, gbaara ndị ha ekeresimesi.

Ya bụ mmemme nke weere ọnọdụ n'ezinụlọ Agbasi dị́ na Mputu, bụ nke ọtụtụ ndị e ji okwu ha agba izu n'Ụkpọr sonyere na ya, ma bụrụkwa nke e jiri oriri na ọñụñụ wee màlite; nke mgbe e mechara ya, e wee malitezie ikesàrà ọhaneze bịara mmemme ahụ ihe nkesà ahụ.

Ikesà ihe ahụ kpọmkwem bụ nke e jiri ndịisi okenye ụmụnna dị icheiche wee malite, wee ruzie n'ikesàrà ụmụnwaanyị na ọhaneze ndị ọzọ bịara ebe ahụ. Ihe dị icheiche e kesààrà ndị ahụ gụnyèrè àkpà osikapa, tomato komkom, àkpà nnu, nchà e ji asụ akwà, ákwà, nri ekwentị (recharge card) ₦500 n'otu n'otu, na ihe ndị ọzọ.

Mgbe ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu na mmemme ahụ, otu n'ime ndị ahụ kwadoro ihe ahụ, bụ Chiifu Mike Agbasi kọwara na ọ bụ ihe ha na-eme kwà afọ, ma bụrụkwa otu n'ime ụzọ ha na ndị obodo ha na-esi emerùbe ekeresimesi n'ụbọchị ọbụla ha họ̀ọ̀rọ̀ n'ọnwa Disemba. O kwùrù na ọ bụkwa otu n'ime ụzọ dị icheiche ha si ekele Chineke maka afọ nke na-agwụ agwụ, ma na-atụkwa anya na afọ na-abịa ga-amakarị.

Ka ọ na-akọwa na ha na-eme ma na-akwàdo emume ahụ kemgbe afọ iri anọ gara aga ma ka na-emekwa ya ruo taa; Chief Agbasi, bụkwa onyeisi ụlọọrụ ‘Heritage Group’, kpọpụ̀tàsị̀kwàrà ụfọdụ ọrụ enyemaka ndị ọzọ Chineke jigoro ha wee rụọ ma ka na-arụkwa, nke gụnyere ịkwụ onye ọbụla onye gbara afọ iri asaa maọbu karịa n'obodo ahụ ụgwọ ọnwa, bụ nke ha ga-akwụgide onye ahụ ruo mgbe ọ nwụrụ.

O kwuru na nke ahụ bụ nke ha na-eme kemgbe afọ 2003 n'okpuru atụmatụ nkwàdo 'Offordile Agbasi Memorial Foundation’ bụ òtù ọrụ obiebere nke ha hibere n'aha nna ha lagoro mmụọ, bụ Chiifu Offordile Agbasi.

O kwùputara ezi olileanya o nwere na ha agaghị alaghachi azụ maọbụ dàá mbà n'ịkwàdo ọrụ enyemaka ndị ahụ ha na-arụ, site n'enyemaka na amara nke Chineke, ọbụladị dịka ọ dụkwara ndị ahụ ritere uru na mmemme ahụ ọdụ ka ha onwe ha na-enyekwara mmadụ ibe ha aka mgbe niile, ọkachasị n'oge mkpà, n'agbanyèghị ole ha nwere.

N'akụkụ nke ya, onye nke ọzọ soro wee kwàdó ihe mmemme ahụ, bụ Chiifu Matthew Agbasi, bụkwa onyeisi ụlọọrụ ‘Makson Oil and Gas’ kọwàrà na ha na-eme mmemme ahụ na ọrụ enyemaka ndị ọzọ iji na-etinyekwa ọchị n'ihu ndị be ha, na iji gosi ha etu ha siri hụ ha n’anya.

Ọ sịrị, “Ọ bụghị naanị na anyị na-ekesara ha osikapa. N'ụzọ dị icheiche, anyị na-enyekwa ha nkwàdó na mgbè na mgbè ka ha nwekwa ike ịbụ ndị kwụụrụ onwe ha, ma ndị ntorobịa nọ n'etiti ha; onye ọ bụla n'ime ha anyị na-ahụ na-agbasi mbọ ike, anyị na-enye ya nkwàdo kwesiri ekwesi iji kwàdó ihe ọ na-eme; ihe niile a bụ ka e wee nye aha Chineke otuto.”

Ọ gbakwara ndị na-erite uru n'ihe nkesà ahụ ume ka ha nọgidesie n'ịtụkwasị Chineke obi ma ghara isonye maọbụ tinye aka n'ihe ọbụla iwu akwadòghị, maọbụ nwere ike itinye ha n'ọnọdụ ihere, n'agbanyèghị ụdị ọnwụnwa nke ọnọdụ ha nọ n'ime ya nwèrè ike iwètèrè ha oge ụfọdụ.

Na ntụnye nke ya, nwunye Chiifu Matthew Agbasi, bụ Lọọlọ̀ Anthonia Agbasi, bụ́kwá onye kesarakwààrà ụmụnwaanyị àjàdụ̀ niile nọ n'obodo ahụ ọgọdọ̀ n'oge mmemme ahụ, kèlèrè Chineke maka iji ha na-etinye ọnụ ọchị n'ihu ndị ọzọ, ọbụnadị dịka ọ gbara ndị ahụ e kesààrà ihe niile ahụ ume ka ha guzosie ike n'imé Onyenweanyị.

N'okwu ha n'ótù n'ótù, ụfọdụ ndị e ji okwu ha agba ìzù n'obodo ahụ bụ Chiifu Ikenna Amaechi na Ọkaiwu Hyacinth Maduagwu tòrò mmemme enyemaka ahụ dịka nke magburu onwe ya, kèlee ụmụnne abụọ ahụ na-akwàdó ya, ma kpekwa Chineke gaa n'ihu na-agọzi ma na-enye ha amara na ihe onwunwe ha ga-eji na-arụ ọrụ ọma ahụ na-agawanye n'ihu.

N’okwu n’aha ndị ọzọ ketara òkè n'ihe nrite ahụ ụbọchị ahụ, onyeisi ụmụnna Ụmụdarafụnanya, bụ Maazị Simeon C. Okeke, na onyeisi òtù ụmụnwaanyị n'ime Mpụtụ ahụ, bụ Oriakụ Augustina Olisakwe kọwara ụmụnne abụọ ahụ na ndị nwunye ha dịka ndị Chineke zitere, kwpụtakwa obi ekele ha maka ọmarịcha ọrụ obiebere ahụ, ya na etu ha siri jiri akụnụba ha wee na-ejere Chineke na mmadụ ozi. Ha kelekwazịrị Chineke maka iji obi onyínyé wee gọzie ha.

Ha gbara akaebe banyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ ụmụnne abụọ ahụ na ndị nwunye ha mere n’oge gara aga, ma dụọ ha ọdụ ka ha gharakwa ịdà mbà n'ezi ọrụ ahụ.

Nkesa nke ihe ahụ kpọmkwem nyegara ndị ahụ, ya na ịbụ̀ abụ otuto pụrụ iche site n'ọnụ ụmụnwaanyị ahụ, so n'ihe ndị mere ka mmemme ahụ dàá ụ̀dà.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484