Ọba Akwụkwọ Anambra Emeela Ụbọchị Ncheta Asụsụ Ọdịnala na Mba Ụwa

Ọba Akwụkwọ Anambra Emeela Ụbọchị Ncheta Asụsụ Ọdịnala na Mba Ụwa
Ọba Akwụkwọ Anambra Emeela Ụbọchị Ncheta Asụsụ Ọdịnala na Mba Ụwa

Izunna Okafor dere akụkọ a

A kpọkuola ụmụakwụkwọ, ndị nkuzi na nne na nna bụ ndị Igbo ka ha jiri asụsụ Igbo wee na-ekwurịta okwu n'ụlọakwụkwọ na n'ezinụlọ ha dị iche iche, ma n'ala Igbo ma na mpaghara ebe ndị ọzọ.

Onyeisi ọba akwụkwọ Steeti Anambra (bụkwa Ọba Akwụkwọ Ọkammụta Kenneth Dike) dị n'Ọka (Awka) bụ Dọkịta Nkechi Udeze kpọrọ òkù ma nye ndụmọdụ a n'okwu ya mgbe ya na ụmụakwụkwọ na ndị nkuzi ụlọakwụkwọ dị iche iche na-akparịta ụka n'Ọka bụ isi obodo steeti ahụ.

Mkparịtaụka ahụ bụ nke weere ọnọdụ na njem ngagharị ọba akwụkwọ ahụ bàgidere n'ụlọakwụkwọ ndị ahụ, iji merube mmemme ụbọchị ncheta asụsụ ọdịnala na mba ụwa (bụ 'International Mother Language Day') nke ahọ 2021.

N'ịgbakwàsà ụkwụ n'isiokwu mmemme ahụ nke ahọ a, Dọkịta Udeze gbara akaebe na ọ dị mma ka mmadụ mụta ma mara na-asụ asụsụ obodo dị iche iche, n'ihi ọtụtụ uru dị iche iche nke ahụ ga-ewètara onye ahụ; mana ọ kwukwazịrị na ọ dịghị mma ka onye ọbụla tụfuo maọbụ chefuo asụsụ ọdịnala nke ya. O kwuru na onye ọbụla tụfuru maọbụ chefuo asụsụ ọdịnala ya  echefuola ma tụfuo njirimara ya, n'ihi na ihe abụọ ahụ na-agakọ ọnụ.

Oge ọ na-akpọku ụmụakwụkwọ ahụ ka ha mụta ka e si asụ, na-ede ma na-agụ n'asụsụ Igbo nke ọma, dịka ndị nna-nna ha siri mee ya, ka asụsụ Igbo wee ghara ịnwụ maọbụ fùó n'oge nke ha; ya bụ onyeisi ọba akwụkwọ Anambra nyèkwara ndị nkuzi na ndị nne na nna ndụmọdụ ka ha bụrụ ndị na-akwalite ma na-agbasa oziọma banyere nkwalite asụsụ Igbo n'ụlọakwụkwọ na ezinụlọ ha dị iche iche oge ọbụla, site n'ịsụ ya ma jiri ya na-agwa ụmụ ha okwu mgbe niile, ma na-akụzikwara ha ya bụ asụsụ.

O mere ka a mara na onye ọbụla tiri nwata ihe maọbụ nye ya ntaramahụhụ maka na ọ sụrụ asụsụ Igbo mèrè arụ, ma kwesikwa ka e meso ya etu ahụ. Ọ gara n'ihu kọwaa na ọrụ ịkwalite asụsụ na omenala Igbo bụ ọrụ dịịrị onye Igbo ọbụla, ma kwuo na o nweghị oge kacha mma iji mee nke ahụ n'abụghị ugbua, iji wee chekwaa ya bụ asụsụ ka ọ ghara ịnwụ dịka òtù mba ụwa UNESCO siri buo ya n'amụma na asụsụ Igbo ga-anwụ n'oge adịghị anya.

N'akụkụ nke ya, onye ọrụ ọba akwụkwọ ọzọ nọ na ngalaba ndị na-ebìnye akwụkwọ n'ọba akwụkwọ steeti Anambra, bụ Oriakụ Uche Ekweozor katọrọ akparamagwa ụfọdụ ndị Igbo ndị na-ekwu na asụsụ Igbo na-eme ha ihere, ma kpọkuo ndị na-eme ihe dị etu ahụ ka ha wepụ ụdịrị echiche ahụ n'uche ha, ma were asụsụ ha na-eme ngàlá, jigidesiekwa ya ike, n'ihi ọtụtụ uru dị iche iche dị na ya.

N'okwu ha dị iche iche, onyeisi ụlọakwụkwọ 'Udodimma Primary School' dị na Nodu, Ọkpụnọ, bụ Oriakụ Ata Mary; onyeisi ụlọakwụkwọ 'St. Mary's College, Awka' bụ Rev. Fr. Angelo Obiakor; na ụfọdụ ndị nkuzi ndị ọzọ sitere ụlọakwụkwọ ahụ, nke gụnyere Maazị Okoye John na Oriakụ Ebere Okeke kèlèrè ọba akwụkwọ Anambra maka iburu oziọma nkwàlite asụsụ Igbo ahụ wee bịakwute ha n'ụlọakwụkwọ ha dị iche iche.

Ha kwere nkwà ịgbasi mbọ ike iji na-akwalite asụsụ Igbo n'ụlọakwụkwọ ha dị iche iche malitezie ugbua gaba, karịa ka ha si eme n'oge mbụ, dịka ọba akwụkwọ ahụ siri nye ntụziaka.

Rev. Fr. Obiakor kwèkwàrà nkwà ịkpọ ọba akwụkwọ ahụ ka ha bịaghachi ọzọ maka ụdị mmemme dị etu ahụ ha ga-achịkọba, bụzị nke a ga-eme n'ụzọ kacha buo ibù.

E wezùga mkparịtaụka ahụ, a nọkwara na mmemme ahụ wee nye ụlọakwụkwọ ahụ dị iche iche a gara ụbọchị ahụ akwụkwọ e biri ihe ncheta maka ịkwalite asụsụ Igbo, bụ nke ọba akwụkwọ Anambra nyegasịrị ha ka ha kòbe n'ụlọakwụkwọ dị iche iche.