Ndị Ukpor Emeela Emume Ụbọchị Ukpor, Nye Onyinye Nkwanyeùgwù

Dec 31, 2021 - 18:48
 0
Ndị Ukpor Emeela Emume Ụbọchị Ukpor, Nye Onyinye Nkwanyeùgwù

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ọ bụ nnukwu ụbọchị ekele na nkwanyeugwu n'Ukpor, bụ isi obodo okpuru ọchịchị ‘Nnewi South’ nke steeti Anambra, dịka ndị obodo ahụ zùkọ̀tàrà ọnụ wee tòó ma kwanyere ọtụtụ ụmụafọ obodo ahụ ruru iri abụọ na anọ n'ọnụọgụgụ ùgwù, na mmemme Ụbọchị Ukpor a mààrà dịka Ukpor Day, nke afọ 2021, bụkwá nnukwu mmemme nke obodo ahụ na-eme kwà afọ, n'abalị iri abụo na iteghete nke ọnwa Disemba afọ.

N'okwu nnabata ya na mmemme ahụ nke e mere n'ama egwuregwu ụlọakwụkwọ 'Central School, Ukpor', onyeisi ọchịchị 'Ukpor Improvement Union (U.I.U.)’, bụ Chiifu Izuchukwu Nwawulu kọwàrà mmemme ahụ dịka nke na-enye ha ohere ịbịakọta ọnụ dịka ụmụnne, ma kparịta ụka banyere etu ha siri mee n'afọ ahụ na etu ọnọdụ obodo ahụ siri gbata kwụrụ, ma tụkwa arò banyere ụzọ a ga-esi na-agawanye n'ihu, maka ọganihu na mmepe obodo na ọdịmma ụmụafọ ya.

Chiifu Nwawulu, onye banyere n'ọchịchị n’afọ gara aga, kọwapụtaara ụfọdụ n’ime ihe dị icheiche ọchịchị ya mepụtagoro n'ime otu afọ gara aga, ma kelekwa ndị Ukpor maka nkwàdó ha nye ọchịchị ya, ma kwupụtakwa olileanya ọ nwere na obodo ahụ ga na-agawanye n'ihu.

Na mbụ oge ọ na-awa ọjị na mmemme ahụ, onye bụ nnukwu nna nke ụbọchị ahụ ma bụrụkwa eze ọdịnala Ukpor, Igwe Felix C.N. Onyimadu kèlere Chineke maka udo tọrọ àtọ̀ dị n'ime obodo ahụ, ma kpeekwa ekpere ka Chineke chebe  ma gakwa n'ihu na-agọzi ma na-echekwaba ụmụfọ obodo ahụ na mpaghara dị icheiche ha nọ, na n'ihe dị icheiche ha na-eme ihe.

N'okwu nnabata ya, onyeisioche nke mmemme ahụ ma bụrụkwa onyeisi ọchịchị obodo ahụ na mgbe gara aga, bụ Ọkaiwu Hyacinth Maduagwu, kwupụtara ụdị ịhụnanya pụrụ iche o nwere n'ebe obodo ahụ nọ, kọọ akụkọ banyere etu mmemme Ụbọchị Ukpor siri wee malite n'obodo ahụ, n'oge ọchịchị Chiifu Livinus Okeke. O kelekwara ma ndị ọchịchị gara aga ma ndị nke nọ ugbua maka ịkwàdò na ijigide ọkụ ahụ a gụnyere ha n'aka, na ime ya ka ọ na-enwusi ike.

Oge ọ na-akọwakwa óké ụbọchị ahụ dịka ụbọchị pụrụ iche e wepụtara iji na-ekele Chineke maka ọtụtụ ngọzi ya n'isi obodo ahụ na ụmụafọ ya; ọ gbakwara onye ọ bụla n'ime obodo ume ka ha gosipụta ịhụnanya ha nwere n'ebe obodo ahụ dị, site n'ịdị na-esonyesi ike na mmemme ahụ mgbe niile na site n'izèrè ịkànyè ihe ọbụla ọzọ n'ụbọchị ahụ e ji eme ya bụ mmemme.

A nọrọ na mmemme ahụ kpọpụta, guzobe ma nye asambodo na nkwanyeùgwù nyegara ụfọdụ ndị nnukwu nna na ndị òtù nlekọta ọhụrụ nke U.I.U.; nye nkwanyeùgwù nyegara ụfọdụ ụmụafọ obodo mepụtagoro ọtụtụ ihe dara ụda ma mmemme ahụ, tinyere ụfọdụ ihe ndị ọzọ dị icheiche e mere.

Ụfọdụ n'ime ndị ahụ e guzobere ọhụrụ ịbụ ndị nnukwu nna nke òtù U.I.U.  gụnyere onyeisi ọchịchị obodo ahụ n'oge mbụ, Chiifu Emmanuel Nwachukwu (Ọnọdugo); Onuora C.C. Anene, na Chiifu Simeon Arazu; ebe Chiifu Walter Okafor bụkwazị onye a gbàkwụ̀nyèrè n'òtù nlekọta U.IU.

N'aka nke ọzọ, otu onye n'ime ndị ahụ e nyere ònyìnyé nkwanyeùgwù ‘2021 Ukpor Special Award’ gụnyere onyeisi ụlọọrụ Apams, Chiifu Kelvin Chukwumobi; onye na-anọ̀chite anya ọgbọ nta nkwàdo 'Nnewi South' nke abụọ n'ụlọ omeiwu steeti Anambra, bụ Hon. Johnbosco Akaegbobi; onyeisi ụlọọrụ 'Makson Oil and Gas', bụ Chiifu Matthew Agbasi; Ọ̀kàmmụta Victoria Chikaodili Ukachukwu; Oriakụ Esther Oluchukwu Okeke; Maazị Nwosu Maduabuchukwu Sylvester; Chiifu Anthony Ifeanyi Umeh, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ.

N'okwu nke ha n'ótù n'ótù, ndị ahụ e nyere onyinye nkwanyeùgwù, gosipụtara ọṅụ dị ukwuu ha nwere maka ịbụ ndị a hutara dịka tozuru okè iso nweta ya bụ onyinye nkwanyeùgwù dị óké elu, kọwaa ya dịka nnukwu ihe agbamume nsọpụrụ ahụ dị ka ihe na-egosi na a na-ahụ ezi ọrụ ha, na-amata ma na-ekele ha. Ha kọwakwara nke ahụ dịka nnukwu agbamume iji gaa n'ihu n'ezi ọrụ ha na-arụ n'obodo ahụ, ọbụladị dịka ha kwere nkwa na ha agaghị ada mbà n'ezi ọrụ ha na ịtụnye ụtụ na mmepe obodo ahụ.

Emume ahụ, nke nwere Owelle Greg Okafor dịka onye ọbịa pụrụiche, bụ  nke a nọrọ na ya rie ma ńụọ ma rie tie mmanwụ, gbaa egwu Egbeliọba, na ndị egwu ndị ọzọ mere ndị mmadụ obiụtọ site n'ihe ngosi ha.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484