Ndị Ukpor Ewere Oke Ọñụ Mee Ụbọchị Ụkpọr

Ndị Ukpor Ewere Oke Ọñụ Mee Ụbọchị Ụkpọr

Jan 11, 2020 - 17:57
Jan 19, 2021 - 17:57
 0
Ndị Ukpor Ewere Oke Ọñụ Mee Ụbọchị Ụkpọr

By Izunna Okafor, Awka, Nigeria

Ọ kpọtụrụ akpọtụ ma zụọ azụụ n'Ụkpọr bụ isi obodo okpuru ọchịchị Nnewi South na nso-nso a, dịka ndị obodo ahụ jiri óke ọñụ wee merùbe ụbọchị Ụkpọr nke ahọ 2019.

Ya bụ mmemme omenahọ bụ nke dọtàrà ọtụtụ ụmụafọ obodo ahụ sitere ebe dị iche iche wee bịa, ma bụrụkwa nke a nọrọ na ya wee nye onyinye nkwanye ùgwù nyégára ụfọdụ ndị Ụkpọr mepụtagòrò ihe dara ụda na ngalaba agbambọ ha dị iche iche.

N'okwu ya na mmemme ahụ, onyeisi oche 'Ụkpọr Improvement Union' (U.I.U), Maazị Emmanuel Nwachukwu mère ka a mara na mmemme ahụ na-enye ha bụ ndị Ụkpọr òhèrè pụrụ iche iji zukọọ dịka ụmụnne, wee kparịta ụka n'ihe gbasaara ya bụ obodo, dịka o siri metụta otu ha siri mee kwà ahọ ọbụla, ya na otu a ga-esi kwàlitekwu ọnọdụ mmepe obodo ahụ na ọnọdụ obibi ndụ ụmụafọ ya.

Ọ kpọpụtàsịrị ụfọdụ ihe dị iche iche e mepụtàgòrò n'obodo ahụ n'ime ọchịchị ya, nke gụnyere: ịhụ na a na-enwe ọkụ latiriiki gbàà-nyụụ (n'Ụkpọr), inwòghàrị na ịgbanwe Ahịa Nkwọ-Ọha ka ọ zabazie 'Ukpor Daily Market' (UDM); iwu ụlọ ahịa karịrị anọ na ọdụ ahịa karịrị narị anọ n'ọnụ ọgụgụ, tinyere akụrụngwa e ji enyere ndụ aka, bụ nke a rụrụ site n'okpuru atụmatụ ọrụ nkwàlite mmepe ime-ime obodo, nke Gọvanọ Obianọ sìtére na ya wee na-enye obodo dị iche iche ego iji họrọ ma rụọ ihe gụrụ ha.

N'ihe gbasaara onyinye nkwanye ùgwù ahụ e nyèrè ụfọdụ Ndị Ukpọr ụbọchị ahụ; Maazị Nwachukwu kọwàrà na nke ahụ bụ ótù ụzọ ha tụpụtàrà isi na-akwayere ụmụafọ obodo ahụ ùgwù, bụ ndị mepụtàgòrò ihe dara ụdà na ngalaba agbambọ ha dị iche iche, nke gụnyere ngalaba ọrụ oyibo, iji ego achụ ego, ngalaba mmụta, ngalaba azụmahịa na ngalaba ndị ọzọ dị iche iche.

Na mbụ n'ozi nnọọ ya, onyeisi oche na mmemme ahụ, bụ Maazị Moses Okezie Okafọr, bụkwa onye enyemaka pụrụ iche nyegara Gọvanọ steeti Kogi, kpọkùrù ndị obodo ahụ ka ha na-agbasòsi udo na ịhụnanya ike dịka a hụghị ebule ma sị elina dike n'ihe gbasaara ịkwàlìtè ọnọdụ mmepe obodo ọbụla na agamnihu ụmụafọ ya.

Ka ọ na-enyefe ụfọdụ ndị mmadụ onyinye nkwaye ùgwù ahụ, nnukwu onye ọbịa pụrụ ichè na mmemme ahụ, bụ Maazị Ben Ahanotu, bụ onye ọ bụ naanị ya nwètàrà nkwanye ùgwù ahụ n'ahọ 2018, kwupùùrù mmadụ iri na ise ọhụụ ahụ natara ya bụ nkwanye ùgwù, ma dụọ ndị enwetaghị ka ha jisiekwa ike n'ọrụ ọma ha, n'ihi na o nwere ike ịbụ ogè nke ha mgbe ọzọ.

Ọ rịọkwazịrị ndị Ụkpọr, ọ kachasị ndị bi na mbà dị iche iche ka ha na-echetakwa na ọ na-abụ àkụ ruo ụlọ, a mara onye kpara ya, ma rịọ ha ka ha jisie ike na mbọ ha na-agba ma gharakwa ichezọ na o nwèrè ebe ha sìrì pụta.

N'ozi mmechi ya, onyeisi oche òtù ọrụ haziri ya bụ mmemme, bụ Maazị Odịlị Ujubụọñụ kèlèrè isi ọchịchị U.I.U, maka inye ha òhèrè iji jeere obodo ha na ụmụ Ụkpọr ozi, ọbụnadị dịka o kèlèrè ndị tụnyere ụtụ n'ụzọ dị iche iche, iji hụ na ya bụ mmemme gara siriri-wèrèrè. O kwèzịrị nkwà ịga n'ihu n'ịtụnye ụtụ nke ya na mmepe obodo ahụ, na n'iji obi ya niile jeere ya bụ obodo ozi oge ọbụla a kpọkùrù ya.

Mmemme ụbọchị ndị Ukpọr nke ahọ 2019 dọtàrà ime ógbè iri ise na anọ dị n'obodo ahụ, ma dọtakwa ọtụtụ ndị dị iche e ji okwu ha agba ìzù, nke gụnyere eze ọdịnala obodo ahụ, bụ Igwe Felix C.N. Ọnyịmadụ, onye jibụrụ ọkwa dịka ọkà okwu ụlọ omebe iwu steeti Anambra, bụ Oriakụ Rita Madụagwụ; Onyeisi oche nchere oge n'okpuru ọchịchị ime obodo 'Nnewi South' bụ Maazị Chieloka Okoye; tínyéré nwa amadi ahụ na-anọchite anya ọgbọ nta nkwàdo 'Nnewi South' nke abụọ n'ụlọ ọgbakọ omebe iwu steeti ahụ, bụ Maazị Johnbosco Akaegbobi, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ.

A nọkwàzịrị na mmemme ahụ gbaa egwu ọdịnala dị iche iche, rie ọtụtụ nri e jiri mara ndị Igbo, ma mekwazie ọtụtụ ihe nkiri dị iche iche mere ka mmemme ahụ zaa aha a kpọrọ ya n'ezie.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.