Ịñụ Mmiri E Jiri Sa Ozu: Kọmishọna Agbajerela Nwaanyị Ajadụ Ọsọ Enyemaka n'Anambra

Jun 22, 2021 - 20:41
Jun 22, 2021 - 21:39
 0
Ịñụ Mmiri E Jiri Sa Ozu: Kọmishọna Agbajerela Nwaanyị Ajadụ Ọsọ Enyemaka n'Anambra

Izunna Okafor dere akụkọ a


Kọmishọna ahụ na-ahụ maka ọdịmma ọhaneze na ihe metụtara ụmụaka na ụmụnwaanyị na steeti Anambra, bụ Oriakụ Ndidi Mezue nọrọ n'isi ngwụcha izuụka gara aga wee gbaje ọsọ enyemaka n'ebe ahụ a manyere nwaanyị di ya nwụrụ, bụ nwaanyị ajadụ ka ọ ñụọ mmiri e jiri saa ozu di ya.

Nsogbu na akụkọ bànyere ịñụ mmiri ozu ahụ bụ nke malitere ikwò n'ime izuụka gara aga, ma bụrụkwa nke usoro nzikọrịta ozi ọgbara ọhụrụ nyere aka wee gbasàá ka ụwà wee hụ ya ma mara banyere ya. 

Akụkọ ihe ahụ mere n'obodo Ubahuekwem dị n'Ihiala, na-akọwa na ndị obodo ahụ jidèrè otu nwaanyị di ya nwụrụ, bụ Oriakụ Chioma Asomugha (gbara ahọ iri atọ na anọ) wee manye ya na ọ ga-añụrịrị mmiri e jiri wee saa di ya nwụrụ anwụ ahụ, iji gosi na ọ bụghị ya gburu ya, ma gosikwa ụwa na aka ya dị ọcha n'ihe ọbụla gbasaara ọnwụ nwoke ahụ.

Ya bụ okwu megideziere wee ruo ntị ọtụtụ ndị e ji okwu ha agba izu na ngalaba dị iche iche, nke gụnyere Kọmishọna ahụ na-ahụ maka ọdịmma ọhaneze na ihe metụtara ụmụaka na ụmụnwaanyị na steeti ahụ, bụ Kọmishọna Mezue; o wee gaa ebe ahụ, iji were anya ya hụ ma jirikwa ntị ya nụ n'ọnụ ya bụ nwaanyị ajadụ. Kọmishọna na-ahụ maka mgbasaozi na ịkụziri ọhaneze ihe ha kwesiri steeti ahụ, bụ Maazị C-Don Adinuba sokwàrà ya wee gaa njem ahụ.

N'okwu ya n'ebe ahụ oge ọ nụchara mkpesa nwaanyị ahụ na ndị ahụ gwara ya ñụọ mmiri ozu ahụ, Kọmishọna Mezue rịọrọ nwaanyị ajadụ ahụ ka ọ gbaghàra ihe ọbụla e mere ya, ma dụkwa ndị ezinụlọ ahụ ọdụ ka onye ọbụla n'ime ha gbaghara ma ọ bụrụ na e nwere ebe e siri mejọọ ya. 

O mere ka a mara na ịsị nwaanyị ajadụ ñụọ mmiri e jiri wee saa ozu di ya nwụrụ anwụ bụ ihe mgbe ochie, ma bụrụkwa ihe a kàgbugoro kwụsịkwa ime ya kemgbe ọtụtụ ahọ gara aga. Ọ katọrọ ya bụ ihe kpamkpam, rịọ ka e wezuga ma gbaghara ihe ọbụla e jiri maka ya wee kpọlitekwa ya bụ ajọ akparamagwa ọzọ, ọbụladị dịka ọ rịọrọ ka udo tọrọ àtọ chịa n'ezinụlọ ahụ.

N'okwu nke ya n'aha ndị ezinụlọ ahụ, nwanne nwoke nke onye ahụ nwụrụ anwụ, bụ Maazị Friday Asomugha gọrọ agụgụ sị na o nweghị mgbe ha bụ ndị ezinụlọ jiri gwa maọbụ manye nwaanyị ahụ ka ọ ñụọ mmiri ahụ e jiri saa ozu di ya, n'ihi na ha ghọtara na nke ahụ bụ ihe mgbe ochie.

Kaosiladị, ọ kọrọ akụkọ banyere etu ya bụ ihe siri mee na etu ótù nwanne ha siri jiri iwe wee kwuo ya bụ okwu ụbọchị ahụ, ma kwuo na ihe mere onye ahụ jiri kwuo ya bụ okwu bụ maka na nwaanyị ajadụ ahụ akpọghị ụmụ ya anọ wee bàta maka akwamozu di ya, bụzị nke butere ịba mba, bụ nke a na-abazị, okwu ahụ wee dapụ onye ahụ n'ọnụ.

Na ntụnye nke ha n'otu n'otu, ụfọdụ ndị okenye na ndị ọzọ e ji okwu ha agba ìzù n'ọchịchị obodo ahụ, nke gụnyere Maazị Pius Nwabuikwu na Maazị Ossy Agums gosipụtara obi mwute ha banyere ya bụ nsogbu dapụtàrà n'etiti ndị ezinụlọ na nwaanyị ajadụ ahụ, ma gbakwa akaebe banyere etu ya bụ ihe siri wee mee. 

Ha mèkwara ka a mara na ya bụ akwamozu mechààrà gaa nke ọma ụbọchị ahụ n'enweghị ihe ogbochi ọbụla, kọwaa na nwaanyị ahụ n'onwe ya sonyèkwàzịrị n'akwamozu ahụ n'ozuzuoke, ma kwuo na ọ ñụghịkwa mmiri ozu ahụ.

N'okwu nke ya n'ebe ahụ, Kọmishọna Adịnụba, onye bụkwa onye obodo ahụ dụrụ ndị ahụ ọdụ ka ha sepụ aka n'ihe ọbụla nwere ike ịkpụtọ na imetọ ezi aha obodo ahụ maọbụ mechuo steeti Anambra ihu, ọbụladị dịka ọ rịọkwazịrị ha ka ha gbaso udo, iji gaa n'ihu na-adọta ọganihu n'ezinụlọ ahụ na n'obodo ahụ n'izugbe.

Kọmishọna Mezue nọkwàzịrị ebe ahụ wee bunye nwaanyị ajadụ ahụ gbara ahọ iri atọ na anọ ihe erimeri na ihe ọñụñụ dị iche iche, iji tie ya aka n'obi ma kwàdó ya ịzụ ụmụ ya anọ di ya bụ Charles Asomugha (gbara ahọ iri anọ na isii) hapụrụ wee laa mmụọ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484