Onye Ogbuaọwaraọsọ Akụgbuola Otu Nwaanyị n'Osun

Aug 22, 2021 - 19:10
 0
Onye Ogbuaọwaraọsọ Akụgbuola Otu Nwaanyị n'Osun

Izunna Okafor dere akụkọ a

Otu nwaanyị nọrọ na nsonso a wee zute ọnwụ mberede ya, dịka otu onye na-anyà ụgbọala jiri ụgbọala wee kụgbuo ya ebe ọ na-agara onwe ya, ma rie mbọmbọ ọsọ.

Ihe mberede okporoụzọ a bụ nke dapụtara na mpaghara Arura dị n'Osogbo bụ isi obodo steeti Osun, ka ọ jiri nkeji iri abụọ gata elekere anọ nke uhuruchi ụbọchị Monde.

Nke a bụ nke e mere ka ụwa mara site n'ọnụ onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ụlọọrụ 'Federal Road Safety Corps (FRSC)' na steeti ahụ, bụ Agnes Ogungbemi. O kwukwara na ọ bụ ịgba oke ọsọ kpatara ihe mberede okporoụzọ ahụ.

Ọ kọwakwara na ọ bụ ihe jọgburu onwe ya na onye ọkwọ ụgbọala ahụ (nwéré ákàrà GNN144AH) gbahapụrụ nwaanyị ahụ ebe ahụ ọ kụgburu ya, gbahapụkwa ụgbọala Sienna ahụ o jiri kụgbu ya, wee gbaa ọsọ.

Ọ gara n'ihu kwuo na e buuru ụgbọala ahụ ga dọba n'isi ụlọọrụ ogige ndị uweojii dị na mpaghara Dugbe, ebe e jikwazịrị ụgbọala ambụlansị wee buru ozu nwaanyị ahụ ga dọnye n'ụlọ nchekwa ozu.

Ọ dụkwazịrị ndị na-anya ụgbọala ọdụ ka ha zeere ịgba oke ọsọ, n'ihi na nke ahụ so n'otu ihe kacha eweta ihe mberede okporoụzọ, ọkachasị ugbua mmiri na-ezo, maka na ụzọ na-amị amị ma mmiri zòó.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484