NDLEA Ejidela Dọkịta Maka Iji Ọgwụ Ike Koken Emepụta Biskiiti

Jun 23, 2021 - 16:42
Jun 23, 2021 - 17:09
 0
NDLEA Ejidela Dọkịta Maka Iji Ọgwụ Ike Koken Emepụta Biskiiti

Izunna Okafor dere akụkọ a


Aka ndị ụlọọrụ ahụ na-ahụ maka ịñụ na ịtụ mgbere ọgwụ ike n'ala Nigeria, bụ 'National Drug Law Enforcement Agency, NDLEA' anwụchiela otu onye ọrụ dọkịta, bụ Dọkịta Jane Chioma Ofoma maka ire na ịtụ mgbere ọgwụ ike site n'usoro nzikọrịtaozi ọgbaraọhụrụ.

Onye na-ahọ maka mgbasaozi n'isi ụlọọrụ NDLEA, bụ Maazị Femi Babafemi bụ ya mere ka a mara nke a site n'ozi ọ kụpụụrụ ndị ntaakụkọ, bụkwa nke o siri na ya kọwaa na nwaanyị ahụ bụ Chioma (gbara ahọ iri abụọ na isii) gụrụ akwụkwọ ịbụ dọkịta na mahadum ala Nigeria, bụ 'University of Nigeria, Nsukka (UNN)' ma mechakwa 'housemanship' ya na nsonso a na mahadum 'University of Benin Teaching Hospital'.

Ọ kọwara na nwaanyị ahụ, onye nwere usekwu 'Omachis Kitchen' n'usoro nzikọrịta ozi ọgbaraọhụrụ, na-eji ọgwụ ike koken (cocain) na ọgwụ ike ndị ọzọ dị iche iche wee na-emepụta achịcha ekoghị eko bụ biskiiti na ụfọdụ ihe oriri ndị ọzọ, ma bụrụkwa nke ọ na-ere ma na-ekesàra ndị mmadụ na mpaghara ebe dị iche iche n'ala Nigeria.

Ka ndị NDLEA nwetara ozi banyere nke ahụ, ndị ụlọọrụ ha na steeti Edo wụchàrà n'ebe ahụ ya bụ nwaanyị na-emepụta biskiiti ahụ, dị na '1 Winners Way, Auchi,' wee nwụchie ya bụ nwaanyị, nwetekwa biskiiti ruru iri iteghete na anọ (94) o jiri ọgwụ ike 'cannabis sativa' wee mepụta.

O kwukwazịrị na nwaanyị ahụ kwètàrà ma gbaa akaebe na ihe niile ahụ a kwuru banyere ya bụ eziokwu, oge a na-agba ya ajụjụọnụ, ma rịọ ka a gbaghara ya maka na ihe ahụ bụ aka ọrụ ekwensu.


N'akụkọ ọzọ dịkwa ka ibè ya, ndị NDLEA na steeti Edo ahụ nọkwàrà na nsonso a wee nwụchie otu nwoke gbara ahọ iri atọ, bụ Maazị Emmanuel Ehiramhen, ịke mpaghara 'No. 10 Egan Street Ekpoma' maka itinye aka n'ịtụ mgbere ọgwụ ike koken.

NDLEA ngalaba steeti Kwara jidekwara otu nwoke ọzọ gbara ahọ iri ise na abụọ, bụ Sgt. Ibrahim Musa ma bụrụkwa onye ọrụ agha ala Nigeria n'oge mbụ, maka itinye aka n'ọgwụ ike. Ya bụ nwoke e jidere na mpaghara Oke-Odo, Tanke nke Ilorin bụ isi obodo steeti Kwara e kwuru na e jidere ya oge o siri Lagos bịa ka o bunye onye ahịa ya ọgwụ ike o goro n'aka ya, ma bụrụkwazie onye  e nwetere ọgwụ ike 'cannabis sativa' arọ ya ruru kilogram 12.167, koken arọ ya ruru kilogram 4, na flunitrazepam arọ ya ruru kilogram 25 n'aka ya.

O kwuru na nwoke ahụ na-arụbụ na ngalaba nlekọta nke ụlọọrụ agha ala Nigeria a maara dịka 'Abati Army Barracks' dị na Lagos, bụ ebe e siri wee gaa na 117 Bataliọnụ dị na Chibok, na steeti Borno, tupu o wee gbaa arụkwaghịm n'ọrụ agha. Ya bụ nwoke kpọkwà nwunye ya, bụ 
Basirat Musa n'ime ụgbọala 'Honda Accord' ya nwere akàrà JJ 707 BL wee bịa Ilorin ibunye onye ahịa ya ọgwụ ike ahụ, tupu e wee nwụchie ya.

Oge a na-agba ya ajụjụọnụ, Sgt. Ibrahim kọwàrà na ọ bụ oge ọ nọ na Chibok ka o nwètèrè akàrà onye na-ere ma na-ekesà ọgwụ ike dị iche iche na Lagos, bụkwa onye ọ kpọrọ ozigbo ọ hapụrụ ọrụ agha n'ọnwa Ọkụtoba 2020.

O kwuru na o kpebiri ịba n'ịtụ mgbere ọgwụ ike iji nwee ike ịchụta ihe ya na nwunye ya na ụmụ ya atọ ga-eri, ma mee ka a mara na nke a bụ nke ugboro abụọ ọ na-abịa ebunye onye ahịa ya ọgwụ n'Ilorin, bụ nke o buru otu n'ime ndị nwunye ya wee bịa, n'agwaghị ya na ọ bụ ọgwụ ike ka ọ na-aga ebunye mmadụ.

N'okwu ya banyere nke a, onyeisi ụlọọrụ NDLEA n'ala Nigeria, bụ Maazị Mohamed Buba Marwa kwupụtara obi ụtọ ya banyere ezi ọrụ ahụ ndị ọrụ ya rụrụ site n'ịnwụchikọ ndị ahụ, kelee ha, ma kwezie nkwa na a ga-akpụpụ ndị ahụ ụlọikpe, ebe a ga-eji usoro iwu wee gwọọ ha ji mmanụ, dịka ihe ha metara siri dị. 

Ọ dụkwara ndị na-etinye aka n'ọgwụ ike ka ha sepu aka na nke ahụ, n'ihi na ụlọọrụ ahụ na ndị ọrụ ya agaghị ada mbà n'ibu agha megide ihe ọbụla bụ ọgwụ ike n'ala Nigeria.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484