Gọvanọ Obianọ Enyena Ndị Otu Asọm Mpi Steeti Anambra Onyinye Ego

Sep 18, 2017 - 02:05
Jan 23, 2021 - 17:53
 0
Gọvanọ Obianọ Enyena Ndị Otu Asọm Mpi Steeti Anambra Onyinye Ego

Izunna Okafor, Awka, Nigeria

Aka na-achị steeti Anambra bụ gọvanọ Willie Obianọ enyena ego dị otu nde Naịra dịka onyinye, nyegara ndi otu asọm mpi a jụọ a zaa nke steeti ahụ bụ ndị siri mba Ịndọneshịa bata, na ụmụakwụkwọ abụọ ndị Anambra bụ ndị kachara me nke ọma n'ule 'Common Entrance' n'ala anyị n'ahọ a.

Ya bụ gọvanọ nyere onyinye ego ahụ oge ọ nabatara ndị otu abụọ ahụ ụnyaahụ na nzukọ 'State Executive Council' nke weere ọnọdụ n'ebe obibi gọvanọ dị n'Amawbịa.

Ndị otu a jụọ a zaa ahụ, nke ụmụakwụkwọ atọ sitere na steeti ahụ mejupụtara bụ ndị tuuru ugo n'asọm mpi a jụọ a zaa mba ụwa nke weere ọnọdụ na Bally nke mba Ịndọneshịa, ma bụrụkwa nke mba iri ise na atọ sonyere na ya.

Onye ọbụla n'ime ụmụakwụkwọ atọ ahụ nwetara ego dị otu nari puku Naịra n'otu n'otu ebe ndị isi ha dị abụọ nwetara otu narị puku Naịra na ụma iri ise n'otu n'otu. Gọvanọ Obianọ nọkwara n'oge ahụ wee nabata ụmụakwụkọ abụọ ndị Anambra, bụ ndị nwetara akara otu nari iri asatọ na iteghete n'ule 'Common Entrance' n'ala anyị, nke mezịrị ka ha bụrụ ndị kachara wee mee nke ọma na ya bụ ule n'ahọ a.

Obere nwaada Chinazọm Ọnụbụọgụ dị ahọ iri nke sitere n'Obosi bụ nwata akwụkwọ 'God's Wisdom International School, Nnewi', ebe obere nwaada Chinecherem Emeka-Egbuna dị ahọ iri sitere Ichida bụ nwata akwụkwọ 'Tendercare International School na Nkwelle Ezunaka'. Ha abụọ nwetagbadoro puku Naịra iri ise n'otu n'otu na ohere agụm akwụkụkwọ n'efu n'ogoogo sekọndịrị na n'ogoogo mahadum ma ha mee nke ọma, ebe ụlọ akwụkwọ ha nwetekwara ego dị otu narị puku Naịra na ụma iri ise n'otu n'otu.

Ka ọ na-enye ihe onyinye ahụ, gọvanọ Obianọ toro ụmụakwụkwọ ahụ na nturu ugo ha, ma sịkwa na ọchịchị ya ga na-aga n'ihu n'ịnye ụdị onyinye ahụ nyegara ụmụakwụkwọ na-ewetara steeti ahụ ugwu dị iche iche.

O kwuru na ọ bụ ihe oke ọñụ na ihe ngala na ụmụakwụkwọ sitere na steeti ahụ bụ ndị kacha eme nke ọma n'ule dị iche iche n'ala anyị, ma sịkwazie na nke ahụ bụ n'ihi ịgba dị iche iche ọchịchị ya tigoro na ngalaba agụm akwụkwọ na steeti ahụ. Ọ gbara ụmụakwụkwọ ahụ ume ka ha gaa n'ihu n'ịbụ ndị mbụ n'ihe dị iche iche ha na-eme, mekwa ka ha mara na site n'inye aka Chineke na ịgbasi mbọ ike ha, na ha ga-eru ogoogo dị elu na ndụ a.

Na mbụ n'okwu ya, kọlishịọna na-ahụ maka agụm akwụkwọ na steeti ahụ bụ ọkammụta Kate Omenụgh kwuru na nturu ugo niile ahụ bụ nnọọ ngosipụta na ezigbo nnwogha na-agawanye n'ihu na ngalaba agụm akwụkwọ na steeti ahụ.

Na nzaghachi ya n'aha ndị otu asọm mpi a jụọ a zaa ahụ, obere nwaada Precious Chigozie kelere gọvanọ Willie Obianọ n'icheta ha na inye ha nkwado iji wee mara ihe a na-akpọ asọm mpi n'ogoogo mba ụwa site n'inye ha nkwado iji wee sonye na ya bụ asọm mpi.

N'okwu nke ha n'otu n'otu, obere nwaada Chinazọm na obere nwaada Chknecherem kwuru na nkwado na onyinye ahụ gọvanọ nyere ha bụ ihe ịkwalite mmụọ nyere ha iji wee gaa n'ihu n'ile nke ọma na agụm akwụkwọ ha na n'iwetara steeti ahụ ezi aha.

A nọkwara n'oge ahụ wee kesaara ụmụakwụkwọ ahụ akwụkwọ ọgụgụ ahụike site n'aka ministry na-ahm maka agụm akwụkwọ na steeti ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.