Ndị Nnobi Emeela Emume Ịkpọ Ji Nke Ahọ 2021

Aug 4, 2021 - 21:34
 0
Ndị Nnobi Emeela Emume Ịkpọ Ji Nke Ahọ 2021

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ọkwà mbà na-achị n'olu n'olu. Omenala bụkwà nwata tote o tokwuru, ma bụrụkwa ọbara na-ehù na ndụ agbụrụ ọbụla.

Ka ọ dị taa, ndị obodo Nnobi dị n'okpuru ọchịchị ime obodo 'Idemili South' nke steeti Anambra nọrọ na nsonso a wee mee otu omenala pụrụ iche e jiri mara obodo ahụ, bụ nke a maara dịka mmemme Ịkpọ Ji Nnobi, nke ahọ 2021.

Ya bụ oke mmemme bụ otu ụzọ ndị obodo ahụ si echekwaba ma na-akwàlite omenala Igbo, ma bụrụkwa emume ha ji ekele Chineke maka onyinye ji ọhụrụ, gọzie ma doo ji ọhụrụ nsọ n'obodo ahụ tupu a malite iri ya maọbụ ire ya n'ahịa obodo ahụ bụ Afọr Nnobi.

Ọ bụ n'ụbọchị ahịa afọr ikpeazụ nke ọnwa Julaị ahọ ọbụa ka ndị Nnobi na-eme emume ịkpọ ji, bụkwa nke ha na-eji amalite ire maọbụ igo ji ọhụrụ n'ahịa ha, nke na ọ bụrụ na e meghị ya, ị mara na o nweghị onye ọbụla ga-anwa ànwà bubàta, ree maọbụ rie ji ọhụrụ n'ahịa obodo ahụ.

Dịka omenala Nnobi siri dị, ọ bụ Isiana Nnobi na-anọ n'isi mmemme ahụ, bụkwazị nke a ga-emerịrị tupu eze odịnala obodo ahụ maọbụ ụmụafọ obodo ahụ amalite ime mmemme iri ji ọhụrụ ha, kwà ahọ ọbụla. 

N'okwu ya na mmemme ahụ mgbe ndị ichie obodo ahụ na ndị mmadụ ndị ọzọ jiri egwu ọdịnala wee soro ya  gaa n'ahịa obodo ahụ, bụkwá ebe ọtụtụ ndị mmadụ jupụtagoro wee na-eche oke emume ahụ na owuwe ihe ubi gbara ọkpụrụkpụ; Isiana Nnobi, bụ Maazị John Isiana kelere Chineke maka etu o siri duo ha n'ogologo oge ọrụ ugbo, ha wee kọnye ji n'ala ma dịkwa ndụ gwupute ya.

Ka o gosipụtachara ji ọhụrụ e tinyesiri n'ụkpa maka emume ahụ, o kèrè ya ụzọ anọ, nke pụtara ahịa anọ dị n'izù, bụ Eke, Orie, Afọr na Nkwọ, ma bụrụkwazie nke ndị a ma ama selitere isi n'obodo ahụ gooro.

O kelere Chineke maka udo tọrọ àtọ dị n'obodo ahụ, kpee ka udo, ịdịnotu na ọganihu gaa n'ihu ịchị n'obodo ahụ, ọbụladị dịka o kpere ka Chineke gaa n'ihu ịgọzi na ichekwa ụmụafọ Nnobi, ma ndị bi n'obodo ahụ ma ndị bi na mba ọzọ.

Ka e mechazịrị nke a n'ahịa ahụ, ìgwè mmadụ ahụ niile zukọtakwara n'ogige 'Aho Square' dị n'Ụmụọna, nụ ebe ha nọkwàzịrị wee malite ịbịara Isiana mgbaru nà iburu ya ìhù, bụ nke ndị otu dị iche iche n'obodo ahụ sokwara mee.

N'okwu nke ya, onyeisioche nchere oge ọchịchị obodo ahụ, bụ Maazị Chris Ezeani kwuru na ebumnobi mmemme ahụ bm iji mee ka ụmụafọ obodo ahụ nwee ike iri na ire ji ọhụrụ.

Ụfọdụ ndị ichie obodo ahụ, nke gụnyere Dọkịta Mike Omenugha, Maazị Okwudili Oguejiofor kèlèrè Chineke maka inye ha ezigbo ihu igwe iji mee mmemme ahụ, ọbụladị dịka ha nkwa na ha ga-aga n'ihu ịkwàlite njirimara na omenala Igbo oge niile.

A nọrọ na mmemme ahụ wee gbaa egwu ọdịnala dị iche iche, tie mmanwụ, tinyere ihe ọzọ dị iche iche mere ka ọ magbuo onwe ya.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484