Ndị Fulani Na-Achị Ehi Awakpola Ebonyi na Enugu, Gbuo Mmadụ 22

Apr 1, 2021 - 18:06
 0
Ndị Fulani Na-Achị Ehi Awakpola Ebonyi na Enugu, Gbuo Mmadụ 22

Izunna Okafor dere akụkọ a

Mkpu akwa dara na nsonso a na steeti Ebonyi na Enugu, dịka ndị Fulani na-achị ehi wakpòkwàrà steeti abụọ ahụ ọzọ, ma gbuo mmadụ ruru iri abụọ na abụọ n'ọnụgụgụ.

Dịka akụkọ siri kọọ, ọ bụ n'ụbọchị Mọnde ka ndị Fulani ahụ na-achị ehi wakpòrò obodo Obeagụ dị n'okpuru ọchịchị ime obodo Ishielu, nke steeti Ebonyi, ma gbuo mmadụ iri na isii n'ebe ahụ, bụ ndị nọ n'agbata ahọ iri na asatọ na ahọ iri ise na isii.

Ọgbatumtum iri na otu ụgbọala nke ndị ahụ e gburu egbu ka e kwuru na ndị Fulani ahụ mụnyekwara ha ọkụ, ha wee gbarikọọ.

N'okwu ya banyere mwakpo ahụ na ogbugbu e gburu ndị ahụ, otu onye n'ime ndị ahụ ndị Fulani gara eso gbuo ụbọchị ahụ, mana Chineke zọpụtara ya, bụ Oriakụ Ngozi Odoabuchi kọwara ya bụ atụmatụ ndị Fulani ahụ dịka nke na-awụ akpataoyi na nke jọgburu onwe ya.

Dịka o siri kọwaa, ya na otu nwaanyị nọ n'Ọkada oge o si n'ụlọọrụ ya na-ala be ya, ha wee hụ mmadụ asaa yi ákwà ojii, nke anọ n'ime ha nọ n'okporoụzọ, ebe atọ ndị ọzọ na-abaye n'ime ọhịa.

Oge ha rutere ebe ahụ, dịka o siri kọwaa, ndị ahụ kwụsịrị ha, ma ndị òtù ha ndị ọzọ ruru 15 n'ọnụọgụgụ nọ n'ọhịa ahụ; ha wee màlite tibe ha ihe tinka tiri paanụ, ma jiri dágà sụgbuo onye ọkada ahụ bu ha n'ọgbatumtum ozigbo n'ihu ha abụọ. O kwuru na ndị ahụ malitere ịzọkwasị ha ụkwụ n'elu; o wee na-emezị onye ọgbatumtum ọbụla gbatara ebe ahụ, ha egbuo ya, ma mụnye ọgbatumtum ya ọkụ.

Ya bụ nwaanyị mere ka a mara na ọ bụ Chineke zọpụtara ya ụbọchị ahụ, n'ihi na ndị Fulani ahụ hapụzịrị ya na nwaanyị ọzọ nọ n'ala ebe ahụ, ma chụrụzie ndị mmadụ ndị ọzọ ọsọ wee pụọ; ha onwe ha wee bilite ozigbo, gbabàá n'ime ọhịa dị nso ebe ahụ, ebe ha nọgidezịrị wee ruo ụtụtụ echi ya bụ Tuuzdee, ha wee si ụzọ ọzọ pụta.

N'akụkụ nke ya, otu onye ọzọ Chineke zọpụtakwara ụbọchị ahụ, bụ Oriakụ Amuche Uga kwuru na ọ bụ Onitsha ka o siri bata, wee zute ndị ahụ oge ọ na-aga ịhụ nne na nna ya; ọbụladị dịka o kelere Chineke maka ịzọpụta ya.

O mere ka a mara na ndị niile ahụ mere ihe ahụ bụ ndị Fulani, n'ihi na ha onwe ha jiri ọnụ ha wee kwuo nke ahụ, ma sịkwa ha gaa gwa Nnamdi Kanu na ha bụ ndị Fulani nwere ikike ịbanwu obodo ọbụla dị n'ala Igbo, gbuo mmadụ maọbụ mee ihe ha chọrọ ime, pụọ, o nweghị ihe ga-eme ha.

Otu onye ọzọ kwúrú na aha ya bụ Okechukwu Ebeh mere ka a mara na ọ bụ ọbụchị Monde ahụ ka e jiri ụgbọala Hilux ise (enweghị ákàrà) wee bubàta ndị Fulani ahụ. O kwuru na ọ bụ otu nwoke ya na nwunye ya na nne ya so abata be ya ka ndị Fulani ahụ buru ụzọ wakpò, nke mezịrị ha onwe ha jizịrị kpọọ ndị nke ha nọgasị ebe dị iche iche òkù, gwa ha ka ha ka nọrọgodi ebe ha nọ oge ahụ ruo mgbe ihe niile dajụrụ; ka ha wee ghara ịdanye n'aka ndị ọjọọ ahụ.

Mana, ka o sila dị, ụfọdụ n'ime ha ndị enwetaghị ozi ahụ n'oge dabàrà n'aka ndị Fulani ahụ oge ha na-abata; e wee site etu ahụ memilaa ha.

N'okwu ya banyere nkwafu ọbara ahụ, onyeisioche okpuru ọchịchị Ishielu, Maazị Henry Eze, kọwara nke ahụ dịka ihe mgbọwa obi na ihe anyammiri jọgburu onwe ya, ma kpọkuo ndị ọrụ nchekwa ka ha mee ngwangwa nwụchikọọ ndị ọjọọ ahụ rụrụ ya bụ arụrụala. 

Na ntụnye nke ya, aka na-achị steeti ahụ, bụ Gọvanọ Dave Umahi, katọrọ ya bụ ajọ ọdachi dịka nke jọgburu onwe ya, ma kwuo na ndị Fulani ahụ buru égbè AK47 wee bịa ya bụ njem, ọbụladị dịka o nyekwara ndị ọrụ nchekwa ntụziaka ozigbo ka ha chọpụta ma nwụchikọọ ndị omekoome ahụ n'oge adịghị anya.


N'akụkọ ọzọ dịkwa ka ibe ya, ndị a na-enyo ènyò na ha bụ ndị Fulani na-achị ehi nọkwàrà na nsonso a wee wakpò obodo Adani, dị n'okpuru ọchịchị ime obodo Ụzọ-Ụwanị nke steeti Enugu, ma gbuo mmadụ isii ozigbo, merụọ mmadụ abụọ ọzọ ahụ, ma bibiekwa ọtụtụ ihe.

Nke bụ nke e mere ka ụwa mara site n'ozi a kụpụrụ site n'aka isi ụlọọrụ ndị uweojii steeti Enugu, bụkwa nke kọwara na ndị Fulani ahụ wakporo otu nwoke si n'obodo Igga, onye na-arụ ọrụ n'ụlọọrụ ugbo Adarice ma gbaa ya egbe, gbochiekwa ndị mmadụ ịga buru ya gaa ụlọọgwụ, ka o wee nọrọ ebe ahụ nwụọ.

Nke a, dịka onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii na steeti Enugu, bụ Maazị Daniel Ndukwe, siri kọwaa, mezịrị ndị Fulani ahụ na ndị obodo ahụ jiri wee kwàtụọ, nke wetekwazịrị mbibì n'ụdị dị iche iche.

O mere ka a mara na onyeisi ndị uweojii na steeti ahụ, bụ Mohammed Aliyu edurula ndị ụrụ nchekwa wee gaa n'ebe ahụ ya bụ ihe nọrọ wee mee, ma kwezie nkwà na a ga-eme nnyocha miri èmì iji nwụchikọọ ndị aka ha dị n'ajọ ọdachi ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484