E Jidela Mmadụ Atọ Ji Keke Ezu Ohi Àkpà Simenti n'Ogun

Jun 27, 2021 - 19:42
 0
E Jidela Mmadụ Atọ Ji Keke Ezu Ohi Àkpà Simenti n'Ogun

Izunna Okafor dere akụkọ a

Aka ndị uweojii na steeti Ogun nọrọ na nsonso a wee kpàrá mmadụ atọ na-anya Keke Napep maka izu ohi àkpà simenti ruru narị atọ (300) n'ọnụọgụgụ na steeti ahụ.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti Ogun, bụ Maazị Abimbola Oyeyemi bụ ya mere ka ụwa mara maka nke a site n'ozi ọ kụpụụrụ ndị ntaakụkọ banyere mnwụchikọ ahụ a nwụchikọrọ ndị ahụ, ya na arụrụala ha rụrụ.

Ọ kpọpụtàsịrị aha mmadụ atọ ahụ dịka Maazị Lawal Bidemi AbdulRaheem, Olalekan Azeez na Opeloyeru Kayode ma kọwaa na a nwụchikọrọ ha maka ịkpà nkịtà ọjọọ na izuru àkpà simeentị ruru narị atọ n'ọnụọgụgụ site n'ebe ndebe ngwaahịa ụlọọrụ 'Sandtrust Quarry Company'.

Dịka o siri kọwaa, e jidere ndị ahụ oge ndị uweojii nọ na mpaghara isi ụlọọrụ Awa-Ijebu nwètèchàrà mkpesa site n'aka otu onye na-arụ ọrụ n'ụlọọrụ ahụ banyere ihe ahụ ndị ahụ mere.

Ọ kọwara na onye ahụ nyere ha mkpesa ahụ gwàrà ha na ya hụrụ ụfọdụ ndị mmadụ ka ha na-adọnye simenti na Keke Napep ha n'ime otu ọhịa dị nso n'akụkụ ụlọọrụ ahụ; ma gwakwa ha na simenti ahụ nwèkwara ike ịbụ simenti e zuru ezu site n'ụlọọrụ ahụ.

O kwuzịrị na mgbe ha nwètèchàrà ozi ahụ, na ndị ọrụ ha jikèèrè ozigbo wee gaba n'ebe ahụ ozigbo.

Ngwangwa ndị ohi ahụ hụrụ ha bụ ndị uweojii, dịka Oyeyemi siri kọwaa, ha ripuru mbọmbọ ọsọ; ndị uweojii ahụ wee chụ ya ka nkịta na-achụ nchì n'ọdọakpụ, chụgide ha ma nwụchikọọ ha.

O mere ka a mara na oge a gbara ha ajụjụọnụ, na ndị ahụ kwuru n'eziokwu na ọ bụ ozuzu ka ha zuru akpa simenti ahụ n'ụlọọrụ ahụ, ma kwuo na ha ji Keke wee na-ebujesi ha n'ime ọhịa ahụ, ebe ha ga-esizị wee na-ebusàrá ya ndị ha na-eresi ya.

Ndị ahụ kwukwàrà na ha eresila ndị ahịa ha ụfọdụ n'ime àkpà simentị ahụ ha zuru tupu oge ahụ e jidere ha.

N'ime narị atọ ha zuru, ndị uweojii ahụ nwetazịrị akpa simenti iri ise na otu site n'aka ndị ohi ahụ, bụ ndị nke ha zoro n'ime ọhịa. Ha nwetekwara àkpà simentị iri abụọ ọzọ ha regoro ere site n'aka ndị ha resiri ya bụ simenti, ma napụtazikwa ha bụ ndị ohi Keke Napep atọ ahụ ha ji were arụ arụrụala ahụ.

Maazị Oyeyemi kọwara na e mechaara tọhapụgodi ndị ohi ahụ ka ha laruo ụlọ wee chighata n'ihi abụbọ ọrụ ahụ ndị ọrụ ikpe gbara na nsonso a, nke mere na e nweghị ike ịkpụpụ ha ụlọikpe n'oge ahụ.

Kaosiladị, ọ kọwara na ndị ahụ mechàkwàziere na-ebozị onyeisi ndị uweojii na mpaghara ahụ ebubo na ọ na-ana ha aka azụ (bribe) ka o wee hapụrụ ha Keke Napep ha, ma na-ebokwa ebubo na ọ bụ maka na ha ekweghị enye ya bụ onyeisi ndị uweojii aka azụ ọ na-ana ha mere na o kweghị ahapụrụ ha Keke ha.

Ọ bụzị nke a, dịka Oyeyemi siri kọwaa, mezịrị e jiri chọrọ ndị ahụ wee gaa ebe ha na-ezo ma nwụchikọkwazie ha nke ugboro abụọ, n'abalị iri abụọ na isii nke ọnwa Juunu a. Ha nọkwazị n'ogige ndị uweojii ugbua agba anya kpụrụkpụrụ ka oke a pịara isi n'ala.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484