Ndị Eze Ọdịnala Ọhụrụ Achala, Owelle, Aguluzigbo na Ogbunka Enwetela Asambodo

Mar 6, 2021 - 12:22
 0
Ndị Eze Ọdịnala Ọhụrụ Achala, Owelle, Aguluzigbo na Ogbunka Enwetela Asambodo
Ndị Eze Ọdịnala Ọhụrụ Achala, Owelle, Aguluzigbo na Ogbunka Enwetela Asambodo

Izunna Okafor dere akụkọ a

Oke ọnụ dara ụbọchị Wenezdee, dịka aka na-achị steeti Anambra,  bụ Gọvanọ Willie Obianọ nyekwùrù asambodo nyegara ndị eze ọdịnala ọhụrụ anọ na steeti ahụ.

Ndị eze ọdịnala anọ ahụ gụnyere Igwe Sunny Nwokedi, onye e nyere asambodo dịka eze ọdịnala obodo Achala; Igwe John-Mark Anyaoha, onye e nyere asambodo dịka eze ọdịnala Ogbunka; Igwe Raymond Omoja, onye e nyere asambodo dịka eze ọdịnala Owelle; na Igwe Rufus Iloduba, bụ onye e nyere asambodo dịka eze ọdịnala obodo Agụlụzigbo.

Mmemme inye asambodo ahụ bụ nke weere ọnọdụ n'ebe obibi Gọvanọ dị n'Amawbia, ma bụrụkwa nke e mere ka ọ gachara otu izuụka kpọmkwem Gọvanọ Willie Obianọ jiri nye ndị eze ọdịnala ọhụrụ atọ ọzọ asambodo nke ha. Inye asambodo nke a e mere na nsonso a mezịrị ya ka ọ bụrụ asambodo nke iri ise na asaa Gọvanọ Obiano nyegoro ndị eze ọdịnala kemgbe o jiri bata n'ọkwa ọchịchị n'ahọ 2014.

N'okwu ọ gwara ndị eze ọdịnala ọhụrụ ahụ oge ọ na-enye ha asambodo ahụ, Gọvanọ Obianọ chètààrà ha ọrụ dị iche iche dịịrị ha dịka ndị eze ọdịnala, ọkachasị dịka o siri metụta ichekwa omenala na ọdịnala Igbo na obodo ha, na ịkwalite udo, ọganihu ịdịnotu n'obodo dị iche iche, ma nye ha ndụmọdụ ka ha ghara ịda mba n'ịrụ ọrụ ndị ahụ n'ozuzuoke.

O kwuru na ọ bụ mmasị ọchịchị ya ịkwalite ezigbo mmepe tọrọ atọ n'ime obodo niile dị na steeti ahụ, bụ nke o megoro site n'atụmatụ inye obodo ego ka ha wee họrọ ma rụọ ihe ha chọrọ, tinyere atụmatụ ndị ọzọ o wepụtagoro, ọbụladị dịka ọ kpọkuru ndị eze ọdịnala ahụ ka ha tinye aka n'ọrụ mmepe ahụ site n'ịkwàdo na imezupụta atụmatụ gọọmenti n'ime obodo ha.

Dịka ọ na-agwa ha ka ha na-akwàlite udo tọrọ àtọ na ịdịnotu n'obodo ha dị iche iche, ọ gwara ha gbakwa mbọ hụ na e nwere ezi mmekọrịta n'etiti ha na ndị ha na-achị achị, na ndị ọzọ ji ọkwa ọchịchị n'obodo ha na n'ogoogo dị iche iche.

Onyeisioche òtù jikọtara ndị eze ọdịnala na mpaghara ndịda-ọwụwa anyanwụ ala Nigeria, ma bụrụkwa eze ọdịnala obodo Ọnịtsha, bụ Igwe Nnaemeka Achebe nyere ndị eze ọdịnala ọhụrụ ahụ ndụmọdụ ka ha were eziokwu, égwù nke Chineke na ịkwụba aka ọtọ wee duo obodo ha.

Ndị eze ọdịnala anọ ọhụrụ ahụ kelekwara Obianọ maka inye ha asambodo ahụ, bụ nke ha kọwara dịka ikike iji chịa obodo ha dị iche iche. Ha kwere nkwà idu obodo ha dị iche iche nke ọma dịka o siri bụrụ mmasị Chineke, site n'inye aka ya.

Mmemme inye asambodo ahụ dọtàrà ọtụtụ ndị ọrụ gọọmentị, ndị e ji okwu ha agba ìzù na ngalaba dị iche iche, tinyere ndị ọzọ sitere obodo ahụ e nyere eze ọdịnala obodo ha asambodo wee bịa, iji were anya ha gbara ekeresimeesi ma hụkwa ka ya bụ nnukwu mmemme siri gaa n'ụdị ya.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484