Gọọmenti Etiti Amalitela Ikesàrà Ụmụnwaanyị Ego Nkwàdo n'Anambra

Mar 2, 2021 - 07:08
 0
Gọọmenti Etiti Amalitela Ikesàrà Ụmụnwaanyị Ego Nkwàdo n'Anambra
Gọọmenti Etiti Amalitela Ikesàrà Ụmụnwaanyị Ego Nkwàdo n'Anambra
Gọọmenti Etiti Amalitela Ikesàrà Ụmụnwaanyị Ego Nkwàdo n'Anambra
Gọọmenti Etiti Amalitela Ikesàrà Ụmụnwaanyị Ego Nkwàdo n'Anambra


Izunna Okafor dere akụkọ a


Gọọmenti etiti amalitela ikesàrà ụmụnwaanyị ruru puku abụọ na narị asatọ (2,800) ego dị nde naịra iri ise na isii, dịka ego nkwàdo n'okpuru atụmatụ 'National Social Investment Programme (NSIP)'. 

Mmemme nkesà ego ahụ bụ nke weere ọnọdụ n'ogige 'Dora Akunyili Women Development Centre' dị n'Ọka (Awka) bụ isi obodo steeti ahụ, ma bụrụkwa nke e mere site n'aka Minịsta na-ahụ maka Ọdịmma Ọhaneze na Nkwalite Ọnọdụ Obibindụ, bụ Hajiya Sadiya Umar Farouk.

N'okwu ya oge ọ na-agbape atụmatụ ahụ, Hajiya Farouk, nke ọ bụ odeakwụkwọ ọkpụtọrọkpụ na minịstịrị ahụ, bụ Bashir Nura Alkali nọchitere anya ya mèrè ka a mara na nke ahụ so n'otu n'ime atụmatụ dị iche iche ọchịchị onyeisiala Muhammadu Buhari weputara ma bụrụkwa nke ebumnobi ya bụ iji chụọ enweghị ọrụ na ụbịam ọsọ ụkwụ erughịala n'ala Nigeria site n'ịkwàdò ndị ntorobịa, ụmụnwaanyị di ha nwụrụ na ndị ọzọ ihe na-esiri ike.

Dịka ọ na-akọwa na onyeisiala Buhari ka na-aga n'ihu n'ime ka ihu ọchị waa ụmụ mmadụ n'agbanyeghị etu ọnọdụ akụnụba ala Nigeria siri debe isi ugbua, o kwuru na ọtụtụ mmadụ eritela uru n'atụmatụ ahụ, ma mekwa ka a mara na gọọmentị etiti na-ezube isi na ya dọpụta ezinụlọ ruru otu narị nde pụọ n'ụbịam n'ime ahọ iri, dịka o siri bụrụ ọchịchọ obi Onyeisiala Buhari o jiri wepụta atụmatụ ahụ.

Ọ sị na e wepụtara atụmatụ nke ikesàrà ụmụnwaanyị nọ n'ime ime obodo ego ahụ bụ iji mee ka ụmụnwaanyị sonyere n'ihe a na-eme ma sorokwa rite uru na ya.

Ọ gara n'ihu kọwaa na a ga-enye ụmụnwaanyị ruru 125, 000 ego dị N20, 000 n'ime steeti iri atọ na isii e nwere n'ala Nigeria, tinyere isi obodo ala Nigeria bụ Abuja; ma kwuo na ebumnobi ha bụ ka mmadụ ruru puku abụọ na narị asatọ (2800) keta òkè n'ego ahụ n'ime okpuru ọchịchị dị iche iche na steeti Anambra.

Ọ kpọkuzịrị ndị ọbụla soro rite urù n'ego ahụ ka ha tinye ya n'ihe ga-abara ha úrù iji wee sikwa ebe ahụ nweta ego ọzọ, karịa irichàpụ ya n'ọnụ.
 
N'okwu nke ya, Kọmishọna na-ahụ maka ọdịmma ọhaneze na ihe metụtara ụmụnwaanyị na ụmụaka, bụ Oriakụ Ndidi Mezue kelere gọọmentị etiti maka ịga n'ihu n'ezi ọrụ ya n'ịkwàlite ọnọdụ obibindụ ụmụ mmadụ n'agbanyeghị ọnọdụ ihe isi ike dị n'ala Nigeria ugbua. 

Ọ kpọkuzịrị ndị ahụ ritere uru n'atụmatụ ahụ ka ha jiri ego ahụ wee mepụta ezigbo ihe ma jirikwa ya gbaara onwe ha mbọ, ka ebumnobi e jiri hibe ya wee nwee ike ịbịa na mmezù.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484