Ndị Ebenator Akpọkuo Gọọmenti Maka Enyemaka

Nov 19, 2020 - 15:57
Jan 30, 2021 - 15:57
 0
Ndị Ebenator Akpọkuo Gọọmenti Maka Enyemaka

Izunna Okafor

Igbo sị na onye ọ na-eme omume oume na-ebe obube obube, ma sịkwa na ọkụkọ anaghị ahaà mkpu akwa maọbụrụ na ihe ji ya ahàghị ya aka.

Ka Ọ Dị Taa, ndị Ebenator dị n'okpuru ọchịchị 'Nnewi South' na steeti Anambra akpọkuola ma rịọ gọọmenti steeti ahụ na gọọmenti etiti ka ha gbatara ha ọsọ enyemaka n'ihi ajọ ọnọdụ mbize na-echere ha aka mgba ma na-achọkwazị ikpochàpụ ya bụ obodo.

Òkù arịrịọ bụ nke a kpọrọ site n'ọnụ onyeisi ọchịchị obodo ahụ, bụ Maazị Anthony Okechukwu n'okwu ọ gwàrà Ka Ọ Dị Taa bànyere ọnọdụ mbize ahụ ọkachasị ugbua udummiri chịkpugoro ụkwụ n'ime ụlọ.

Dịka o siri kọwaa, mbize ahụ a maara dịka 'Ibo Ebentọr' so n'ótù n'ime mbize kachara mie imi na mpaghara ndịda-ọwụwa anyanwụ ala anyị, ma bụrụkwa nke na-emekpà obodo ahụ na ụmụafọ ya ahụ kemgbe ihe karịrị ahọ iri atọ.

Ọ gara n'ihu kwuo na mbize ahụ etinyela ọtụtụ ụmụafọ obodo ahụ n'ọnọdụ anya mmiri n'ụzọ dị iche iche, tinye ọtụtụ mmadụ n'ọnọdụ enweghị ebe obibi site n'izedà na ibibì ụlọ ha, mee ka ọtụtụ nọrọ n'egwù ehighị ụra abalị, bibie ọtụtụ ubì na ihe a kọrọ na n'ime ya, mebisie ọtụtụ okporo ụzọ jikọrọ obodo ahụ ọnụ, ma gbasàrazie ugbua na-aga n'ogige ụlọ akwụkwọ 'Community Central School, Ebenator,' nke mezịrị ka ọ bụrụ ọnyà ọnwụ na ihe izè ndụ nyégárá ụmụakwụkwọ na-agụ ebe ahụ.

Dịka ọ na-akpọpụtasịa ụfọdụ ọrụ ha rụgoro n'onwe ha na mbọ dị iche iche ha gbàgòrò dịka ndị obodo iji bèlata ya bụ ajọ ọnọdụ, bukwa nke amịtàghị mkpụrụ ọbụla ruo ugbua n'ihi ajọ ọnọdụ mbize ahụ; Maazị Okechukwu, kèlèrè aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ maka ezi agbambọ ọchịchị ya n'ịkwàlite mmepe imeime obodo.

Ọ gazịrị n'ihu kpọkuo ma rịọ ya, gọọmenti etiti na ụlọọrụ mba ụwa dị iche iche ka ha gbatara obodo ahụ ọsọ enyemaka iji zọpụta ụmụafọ ya n'aka mbibì mbize ahụ aghaghị iwètàrà ha ma ọ bụrụ na e busòghị ya agha aka ọkụ aka ọkụ ma ọ bụ memìlaa ya ugbua.

N'okwu nke ya, onye ọzọ ọnụ na-eru n'okwu n'obodo, bụ Ọkammụta Sam Ụzọchukwu kọrọ akụkọ ntọala bànyere etu mbize ahụ siri màlite, kwuo na ya bụ mbize emeela ọtụtụ mkpamkpa n'obodo ahụ dịka o si eme kwà ahọ ọbụla, nke nà ọ na-achọzịkwa ịkwụsị ndị mmadụ ịga ugbo, ịga ahịa na ikèwàsị obodo ahụ ugbua, site n'ibibìsì okporo ụzọ jikọrọ ogbe dị iche iche n'obodo ahụ.

Na ntụnye ya, otu onye ọzọ e ji okwu ya agba ìzù n'obodo ahụ, bụ Maazị Jerome Ifeanyi Igwe mèrè ka a mara na gọọmenti Anambra nọrọ n'ahọ 2014 wee nye ụlọọrụ ọrụ ngo 'Mastek Construction Ltd' ọrụ ịrụ mbize ahụ n'ọnụ ego dị narị nde naịra atọ, ma mechaa weta ihe ruru pasenti iri abụọ na isi iji malite ọrụ; mana ka ọ gachaara ọnwa ole na ole e jiri malite ọrụ ebe ahụ, ọrụ kwụsịzịrị ịga n'ihu kemgbe ahụ, wee ruo taa. 

Maazị Igwe, onye bụkwa onye ọrụ Injinia, kwùrù na ọ bụrụ na gọọmenti kwuo na ya bụ

mbize kwesiri ka e lebàra ya anya mgwamgwa ugbua, tinye ego na ya ma wepụta atụmatụ bụ ịgbà site n'aka ndị ọkachamara a ga-agbasò wee rụọ ya, tupu ọ kawanye njọ karịe etu ọ dị ugbua, maọbụ mebisikwuo ọtụtụ ihe.

Ndị ọzọ kwuru okwu banyere mbize ahụ gụnyere Maazị Eugene Ezeiwuchukwu, Maazị Cajetan Anyika, Oriakụ Ngozi Okpara, nakwa ụfọdụ ndị ọzọ bụ ndị kwupụtàra ụzọ dị iche iche mbize ahụ sigoro metụta ha dịka ndị obodo ahụ, ma rịọkwa enyemaka gọọmenti n'ogoogo dị iche iche, iji rụọ ya ka ọ kwụrụ chịm tupubo kpochapụ obodo ahụ.

Ibo Ebenator so n'otu n'ime mbize dị iche iche kacha agbasàwanye ma na-ezekwa eze na steeti Anambra, ma sorokwa n'otu n'ime mbize kachara mie ímì na mpaghara ndịda-ọwụwa anyanwụ ala Nigeria.

Kwà ahọ ọbụla, mbize ahụ na-tinye ọtụtụ ndị mmadụ n'ọnọdụ enweghị ebe obibi, site n'ibibì na izekpu ọtụtụ ụlọ ndị mmadụ; ọ na-ebibi ihe a kọrọ n'ugbo, na-akwatùsi ụfọdụ osisi bara urù, ma na-ebibìsikwa okporo ụzọ, nke mezịrị o jiri dị mkpa na gọọmenti ga-agbatara ndị obodo ahụ ọsọ enyemaka mgwamgwa ugbua, iji buso ya agha ma kpàá ya eze ka ọ kwụsị ịkpa ike.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.