Chekwaanụ Okèala Ụnụ - Nzukọ Mba Afrịka

Nov 24, 2019 - 21:08
Jan 24, 2021 - 04:32
 0
Chekwaanụ Okèala Ụnụ - Nzukọ Mba Afrịka

Ibe Kelechukwu , Ibadan

Nzukọ Mba Afrịka adụọla Naijiria na mba ndị ọzọ ọdụ ka ha chekwaa ókèala ha karịsịa n'ebe o metụtara ọnọdụ nchekwa na aghụghọ dịka ụzọ kacha mma iji were dozie ezi ọnọdụ nchekwa n'okèala.

Nzukọ ahụ kpọkukwara mba ndị ọzọ ka ha na mba ndị gbara ha okirikiri kparịta ụka gbasara ihe ha ma ka ewere wulite ezi ọnọdụ nchekwa n'okèala obodo na ibe ya.

Nkea bụ ihe pụtara ìhè na ọzụzụ maka okeala nke otu nzukọ Afrịka chịkọbara maka mba ọdịda anyanwụ Afrịka were ọnọdụ n'isi obodo Naijiria, Abuja.

Ozi nke sitere n'aka nzukọ ahụ ụbọchị Fraịdee na ngwụcha ọgbakọ ha nwere rịọrọ obodo ndị so nzukọ mba Afrịka ka ha leba anya na mmekọrịta nke otu ndị na-ahụ ma na-ahazi okwu gbasara okèala.

Dịka ozi ahụ siri dị, "Mba ndị soro na Nzukọ Afrịka ga-ahazi ụzọ kacha mma ma wulite ezi nchekwa n'ebe oke ala ha dị."

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.