N'Awka, Ndị Agbataobi Azọpụ̀tala Nne Nà Nwa n'Ọkụ Ọgbụgba

Aug 26, 2021 - 21:11
Aug 28, 2021 - 02:42
 0
N'Awka, Ndị Agbataobi Azọpụ̀tala Nne Nà Nwa n'Ọkụ Ọgbụgba

Izunna Okafor dere akụkọ a


Ndị agbataobi na ndị ọnọmgbeomere ényéla aka zọpụta mmadụ abụọ nọ n'ime otu ụlọ dị n'Awka bụ isi obodo steeti Anambra oge otu akụkụ ya bụ ụlọ gbara ọkụ na nsonso a.

Ụlọ ahụ otu akụkụ ya gbara ọkụ ka e kwuru na ọ bụ ụlọelu nwere otu òkpùkpù, dị na mpaghara ụzọ Echeazu Ajuorah, nke dị n'akụkụ mpaghara ụzọ ime ogbe Emma-Nnaemeka, n'Awka.

Dịka akụkọ siri kọọ, ọkụ ọgbụgba ahụ bụ nke malitere n'ihe dịka elekere asaa nke ụtụtụ n'akụkụ ebe e si arịgo n'ụlọelu ahụ, ma nwusàá ozigbo, gbagoo n'elu ụlọ ahụ, ebe nwaanyị nwe ụlọ ahụ, bụ Oriakụ Nkiru Chinwoko bì, ya na obere nwa ya nwaanyị dị ihe dịka ahọ asaa.

Otu onye ọnọmgbeomere kwuru na ọ malitere tibe mkpu ngwangwa ọ hụrụ ọkụ ahụ, bụkwazị nke mere ụfọdụ ndị agbatobi jiri mara banyere ya, gbapụta ozigbo, ma màlite inye aka n'ibusò ya bụ ọkụ agha, wee ruzie ogè ndị ọrụ nsọnyụọkụ bịaruru n'ebe ahụ, wee tinyekwazie aka n'ịgbanyụ ya.

O mekwazịrị ka a mara na ha dọkapụrụ ihe igwè a rụnyere na windò ime ụlọ ebe ahụ nwaanyị nwe ụlọ ahụ nà nwa ya nwaanyị nọ, wee ga zọpụta ha abụọ. Ọ kọwakwara na aka ndị agbataobi ahụ nyere nà etu ndị ọrụ nsọnyụọkụ siri gbata ọsọ ngwangwa ebe ahụ so n'ihe mere e jiri gbanyụnwuo ya bụ ọkụ n'oge, ma gbochikwa ya inwusà, bàá n'ụlọ niile ahụ.

Ka ọ dị ugbua, a mabèghị maọbụ chọpụta ihe ọ bụ ya kpatàrà ọkụ ọgbụgba ahụ kpọnkwem, maka na ụfọdụ ndị ọnọmgbeomere na-ekwu na ọ bụ ihe a, ebe ụfọdụ ndị ọzọ na-asị ọ bụ ihe ọzọ. Ụfọdụ ndị ọzọ sị na ọ bụ mmanụ ọkụ e debere n'okpuru ebe ahụ e si arịgo ụlọelu ahụ, ebe ụfọdụ ndị ọzọ na-asịkwa na ọ bụ mbọkesi si n'ihe a na-akwụnye n'ọkụ latiriiki kpàtàrà ya bụ ọkụ ọgbụgba.

Otu ọ dị, mbọ niile a gbara iji nweta ọnụmmiriokwu nwaanyị ahụ nwe ụlọ ahụ amịtàghị mkpụrụ, maka na e kwuru na ọ ka nọ n'ụlọọgwụ anara ọgwụgwọ maka àpà na mmerụahụ dị iche iche o nwetere site n'ọkụ ọgbụgba ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484