Òtù 'Wikimedia Fan Club' Enweela Ọ́gbakọ̀ Nkụzi Ọzọ n'Awka

Dec 2, 2021 - 21:32
 0
Òtù 'Wikimedia Fan Club' Enweela Ọ́gbakọ̀ Nkụzi Ọzọ n'Awka

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ka ọ gachara izuụka olenaole e mechara agba nke mbụ ya, agba nke abụọ nke ọgbakọ inye nkụzi banyere idezi, ịtụgharị, itinye na ibipụta okwu ọhụrụ na Wikipedia ewerela ọnọdụ n'ogige 'Ekwueme Centre for Disciplinary Research' dị n'ime mahadum Nnamdị Azikiwe dị n'Awka bụ isi obodo steeti Anambra.

Ọgbakọ inye nkụzi ahụ bụ nke a na-achịkọba na mgbe na mgbe site n'aka ndị otu 'Wikimedia Fan Club', ma bụrụkwa nke a nọrọ na ya wee kpọkuo ndị Igbo ka ha nye aka n'ichekwaba, ịkwàlite na ime ka ya bụ asụsụ Igbo ná-ewu èwù n'ogoogo mba ụwa.

N'okwu ya na mmemme ahụ, onye chịkọbara ya bụ ọgbakọ ma bụrụkwa onye hibere òtù 'Wikimedia Fan Club', bụ Oriakụ Obiageli Ezeilo, onye ihe gbasaara nkwàlite asụsụ Igbo na-atọ ụtọ nke ukwuu, yèrè nkọwa banyere WIkimedia Foundation ya na ụmụnne ya ndị ọzọ yiri ya, nke gụnyere Wiki Books, Wiki Voyage, Wiki Quotes, Wikisource, Wikitionary, na ọtụtụ ndị ọzọ.

O kwùrù na ebumnobi o jiri hibe òtù ahụ nà atụmatụ ahụ bụ iji kwàlite ma bawanyekwuo ọnụọgụgụ edemede na okwu Igbo dị na Wikipedia, ma sikwazie n'ụzọ dị eti ahụ mee ka asụsụ Igbo guzosie ike ma gharakwa ịnwụ maọbụ fuo dịka ndị òtù mba ụwa 'United Nations Educational, Scientific and Cultural Organisations (UNESCO)' siri wee buo n'amụma na mgbe gara aga, sị na asụsụ Igbo ga-anwụ oge adịghị anya.

Ọ kọwakwara na òtù ahụ na atụmatụ ahụ ga-enyekwa aka itinyesikwu ọtụtụ okwu Igbo dị icheiche n'akwụkwọ nkọwaokwu igbo dị na Wikipedia, bụ Wikitionary, mee ka asụsụ ahụ na-ewu èwù n'ala Nigeria na n'ogoogo mba ụwa, tinyere ọtụtụ uru ndị ọzọ dị icheiche ọ ga-eweta.

Dịka ọ na-eme ka a mara na isonye na nkụzi ahụ bụkwa n'efu ma bụrụkwa maka onye ọbụla nwere mmasị, Oriakụ Ezeilo kọwakwara 
na a ga na-enwe ya bụ ọzụzụ na mgbe na mgbe. 

Ọ kpọkukwazịrị ndị sonyere na mmemme ahụ ka ha gba mbọ na-etinye ihe niile a kụziiri ha n'ebe ahụ n'ọrụ ma jirikwa ya na-emepụta ihe oge niile, dịka nkụzi e nyere ha siri dị. Ọ dụkwàrà Ndị Igbo ọdụ ka ha nye aka ịkwàdò, ịkwàlite na ichekwaba asụsụ ha.

Ọgbakọ ahụ dọtara ọtụtụ ndị dị icheiche ihe gbasaara asụsụ Igbo na-amasị, nke gụnyere Ọkammụta Nkechinyere Nwokoye, Dọkịta Angela Nwankwere, Dọkịta Onwudile, na Maazị Charles Azubuike, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484