Korona: Ụlọọrụ 'Procter & Gamble Ltd' Ebunyela Gọọmenti Anambra Ihe Mkpuchi Ọtọ Ụmụaka

Sep 24, 2020 - 21:59
Jan 24, 2021 - 22:01
 0
Korona: Ụlọọrụ 'Procter & Gamble Ltd' Ebunyela Gọọmenti Anambra Ihe Mkpuchi Ọtọ Ụmụaka

Si n'aka Izunna Okafor

Igbo sị na ọ bụ ihe nnekwu ọkụkọ nwere ka o ji emere okeọkpa ọgọ, ma sịkwa na ọ na-abụ e jikọọ aka buo ozu enyī, ọ dị mfe.

N'ịgbaso nke a, ótù ụlọọrụ nnọrọonwe a maara dịka 'Procter And Gamble Limited' ebunyela gọọmenti steeti Anambra ihe e ji awàchi ụmụaka íkè (bụ 'pampers' n'asụsụ bekee), nke ọnụọgụgụ ya ruru otu narị puku na iri abụọ, ka e késàárá ụlọ ahụike steeti ahụ, ụlọọrụ na-ahụ maka ihe metụtara ụmụaka na ụmụnwaanyị na steeti ahụ, ògìgè ụmụaka enweghị nne na nna, nakwa òtù ọrụ obi ebere bụ 'Caring Family Enhancement Initiative (CAFE)'.

Mmemme nnyefè ihe ahụ bụ nke weere ọnọdụ n'obi gọọmenti dị n'Awka bụ isi obodo steeti ahụ, ma bụrụkwa nke ụfọdụ ndị selitere isi n'ọrụ gọọmenti steeti ahụ sònyèrè na ya.

N'okwu ya oge ọ na-enyefè ihe ahụ n'aka gọọmenti, onye duru ụlọọrụ ahụ wee bịa ya bụ njem, ma bụrụkwa nnukwu onyemaka pụrụ iche nye Gọvanọ Willie Obianọ n'ihe gbasaara mgbasaozi na ijikwà  oyinyò, bụ Maazị Chika Ibeneme kọwàrà na ụlọọrụ ahụ butèrè ihe ndị ahụ dịka ótù ụzọ isi tụnye ụtụ nke ha n'ịkwàdò gọọmenti n'agha ahụ ọ na-ebu megide ọrịa nje korona n'ime steeti ahụ.

O kèlèrè ọchịchị steeti Anambra na mbọ ọ na-agba nmegide ọrịa ahụ, nakwà ùsòrò bụ ịgbà o si eme nke ahụ. Ọ fọkwàrà ekele n'ụkpa wee bunye aka na-achị steeti ahụ bụ Gọvanọ Obianọ maka ọmarịcha atụmatụ ahụike o ji n'aka na steeti ahụ, nakwa etu o sigoro nwògharịa ma mee ka ngalaba ahụike na ngalaba niile steeti ahụ bụrụ eji ama atụ. Ọ rịọkwazịrị ya bụ Gọvanọ ka o jisie ike n'ọrụ.

Na nzaghachi ya oge ọ na-anabata ihe ndị ahụ n'aha gọọmenti, ọdeakwụkwọ izugbe steeti ahụ, bụ Ọkammụta Solo Chukwulobelụ kèlèrè ụlọọrụ ahụ maka nkwàdo ahụ na nkwàdo nke ha nyebụrụ n'oge mbụ, bụ nke gosiri na ha nụrụ ma zakwa òkù ahụ gọọmenti kpọrọ maka nkwàdo na enyemaka site n'aka ọhaneze na ụlọọrụ dị iche iche n'ihi ọrịa nje korona. 

O mere ka a mara na site na nkwàdo ahụ ndị mmadụ, òtù na ụlọọrụ dị iche iche nyegoro gọọmenti steeti ahụ, na gọọmenti wàtàrà ọgọdọ ibuso ọrịa ahụ agha, ma kpọpụtasịa ụfọdụ ihe dị iche iche gọọmenti megoro n'ibuso ọrịa ahụ agha.

O kelekwazịrị ụlọọrụ ndị ọzọ nyegoro gọọmenti nkwàdo n'ụzọ dị iche iche, ma kwezie nkwà na gọọmenti agaghị ada mbà n'ịchụ ọrịa ahụ ọsọ na steeti ahụ, ọbụnadị ugbua e mepechagoro ụfọdụ ihe dị iche iche e mechiri emechi n'oge mbụ na steeti ahụ n'ihi ọrịa ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.