N'Anambra, Kuryas Abànyéla n'Ọkwa Dịka Onyeisi Ndị Uweojii Ọhụrụ

N'Anambra, Kuryas Abànyéla n'Ọkwa Dịka Onyeisi Ndị Uweojii Ọhụrụ

Izunna Okafor

Igbo sị na ọ na-adị mma a sụgide ụtara, e hogharịa ọdụ.

N'ịgbasò nke a, CP Monday Bala Kuryas, fsi, awụchaala ma malite ọrụ na steeti Anambra dịka onyeisi ọhụrụ nke ndị uweojii na steeti ahụ, ma bụrụkwa onyeisi nke iri abụọ na iteghete steeti ahụ nwègoro, dịka onye jibụ ọkwa ahụ bụzị onye nke e buliri n'ọkwa dị elu ma wegazie ya n'ebe ọzọ.

N'okwu ya na mmemme mkparịtaụka mbụ ya na ndị nta akụkọ nwere n'isi ụlọọrụ ndị uweojii steeti ahụ dị n'Amawbia, CP Kuryas kelere AIG John Abang, bụ onyeisi ndị uweojii ahụ nke pụrụ àpụ na steeti ahụ na nsonso a, maka ezi agbambọ ya ime ka steeti Anambra bụrụ steeti kachara nwee ezi nchekwa n'ala Nigeria, dịka ọ dị taa.

Ọ kpọpụtasịrị ụfọdụ ihe a gwagoro ya kacha echere ọnọdụ nchekwa aka mgba na steeti ahụ, nke gụnyere ohi, ịtọrọ mmadụ, otu nzuzo, ịma aka akpà, nsogbu ịzọ ókè ala, nsogbu ịzọ ọchịchị obodo, nsogbu ndị Fulani na-achị ehi na ndị ọrụ ugbo, tinyere nsogbo ndị ọzọ, ma mee ka a mara na ụlọọrụ uweojii steeti ahụ ga-aga n'ihu ịrụsi ọrụ ike n'agha ahụ a na-ebu megide mpụ na arụrụala n'ime steeti ahụ. O kwuru na ọ ga-amàlite ebe onye nke pụrụ apụ rụdobere, ma welitekwuorị aka n'ọrụ ime ka steeti ahụ gaa n'ihu ịnọ n'ọnọdụ ịbụ steeti kachara nwee ezi nchekwa n'ala Nigeria.

O kwuru na ọchịchị ya ga-etutekwa atụmatụ nchekwa ahụ a maara dịka (Operation Puff Adder II), ma busie agha ike megide nsogbu otu nzuzo, izu ohi, ntọrị mmadụ, na ịna ego n'ụzọ iwu akwadòghị na mpaghara ebe dị iche iche na steeti ahụ, nke gụnyere Onitsha, Nkpor, Obosi, Ọba, Enugwu-Agịdị, Ụzọ Nnobi/Alor na Nnewi.

Ọ kpọkuzịrị ndị omekoome na ndị ọzọ na-ewèta àlà adịghị mma na steeti ahụ ka ha sepụ aka n'arụrụala maọbụ kwakọrọ ngwongwo ha pụọ na steeti ahụ, n'ihi na ọnọdụ ga-akawanyere ha njọ na steeti ahụ ugbua.

CP Kuryas gbarụkwàrà ihu megide mgbasaozi ụgha na ibugharị akụkọ abụghị eziokwu n'ime steeti ahụ, bụ nke ọ kọwara dịka nke nwere ike ibute ọgbaaghara n'ọtụtụ ụzọ dị iche iche, ọbụladị dịka ọ kpọkuru ndị na-eme ihe dị etu ahụ ka ha sepu aka na ya, maọbụ dị njikere ịgba egwu ọbụla iwu ga-akụrụ ha ma e jide ha.

Dịka ọ na-adọ ndị uweojii steeti ahụ aka na ntị ka ha dị uchu n'ọrụ ha ma rụọ ya n'usoro iwu kwàdoro site n'ịsọpụrụ ikike dịịrị mmadụ, ya bụ onyeisi ndị uweojii rịọkwazịrị njikọaka ọhaneze, ndị nta akụkọ na ụlọọrụ dị iche iche na steeti ahụ, iji nyere ha aka n'ọrụ inye steeti ahụ ezi nchekwa. 

O nyekwara ndụmọdụ ka onye ọbụla nwere ozi ọbụla ga-enyere ndị uweojii aka n'ọrụ nchekwa maọbụkwanụ onye ọbụla ọnọdụ ọjọọ maọbụ ihe meberede ọbụla dabìdòrò kpọtụrụ ha bụ ndị uweojii ozigbo site n'akara ekwentị 112 maọbụ 07039194332 ka e wee gbatara ya ọsọ enyemaka aka-ọkụ aka-ọkụ.

N'okwu ya n'aha ndị nta akụkọ, onyeisioche otu jikọtara ndị nta akụkọ na steeti Anambra, bụ Maazị Emma Ifesinachi welììrì onyeisi ndị uweojii ahụ aka elu maka ịhụta mkpa ọ dị na ya na ndị nta akụkọ nwèrè mkparịtaụka n'ọnụ ụtụtụ nke mmalite ọchịchị ya na steeti ahụ.

Dịka ọ na-ekwe ya nkwà na ndị nta akụkọ steeti ahụ dị ezi njikere ịga n'ihu n'ezi njikọaka ha na ụlọọrụ uweojii na-enwe n'ime steeti ahụ kemgbe ahọ ole gara aga, Maazị Ifesinachi kpọkukwazịrị ya bụ onyeisi ndị uweojii ọhụrụ ka ọ na-etinye nta akụkọ n'ihe a na-eme, ma kwàlitekwa ezi njikọaka ahụ dị n'etiti òtù abụọ ahụ, dịka onye nke pụrụ apụ bụ AIG John Abang na ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ CSP Haruna Mohammed si eme ya.

A nọkwara na mmemme ahụ wee mee emume ịchọ mma nke e mere ndị uweojii ahụ e buliri n'ọkwa ọhụrụ na nsonso a n'ime steeti ahụ, bụ nke e mere site n'aka CP Kuryas na ụfọdụ ndị uweojii selitere isi na steeti ahụ.

Monday Bala Kuryas bụ onye obodo Kurya dị na Dada, n'okpuruọchịchị ime obodo Jaba nke steeti Kaduna, ma bụrụkwa onye banyere n'ọrụ uweojii dịka Cadet ASP n'ahọ 1990. O jiela ọtụtụ ọkwá dị iche iche n'ọrụ uweojii na mpaghara ebe dị iche iche n'ala Nigeria, ma bụrụkwa onye nwetagoro ọtụtụ nturuugo na onyinye nkwanyeugwu dị iche iche.

Ya bụ nwa amadi, onye gụchara akwụkwọ na Mahadum Usman Dan Fodio dị na Sokoto n'ahọ 1986, bụkwà onye sonyegoro n'ọtụtụ ọzụzụ na nkụzi dị iche iche, nwetakwa asambodo dị iche iche, nke ótù n'ime ọzụzụ ahụ o sonyere na ya bụ 'National Institute of Security Studies, Abuja', ebe o nwetara ọzụzụ n'ọmụmụ ihe 'Executive Intelligence Management', nke nyere ya echichi na nkwanyeugwu dịka 'Fellow of Security Institute' (fsi), bụkwazị nke a na-etinye n'ahà ya.