Mmadụ Asaa Anwụọla n'Ihe Mberede Ụgbọelu Mere n'Abụja

Feb 28, 2021 - 09:18
 0
Mmadụ Asaa Anwụọla n'Ihe Mberede Ụgbọelu Mere n'Abụja

Izunna Okafor

Mmadụ asaa abụrụla ndị zutere ọnwụ ike ha, dịka ihe ụgbọelu ndị ọrụ agha elu ala Nigeria nwèrè ihe mberede na nsonso ọdụ ụgbọelu Nnamdi Azikiwe dị n'Abuja, wee binwuru ọkụ, ma gbarikọọ.

Nke a bụ nke e kwupụtara site n'ọnụ onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na isi ụlọọrụ ndị ọrụ agha elu ala Nigeria, bụ Maazị Ibikunle Daramola, site n'ozi ọ kụpụrụ banyere ya bụ ihe mberede ụgbọelu dapụtara ụbọchị ụka gara aga.

Dịka o siri kọwaa, ya bụ ụgbọelu bụ nke e zubere ka ọ bagide n'ọrụ ngagharị nnyocha banyere ịzọpụta ụmụakwụkwọ ahụ a tọọrọ ụbọchị Wenezdee izuụka gara aga site n'otu ụlọakwụkwọ dị na mpaghara steeti Niger. 

Ọ dị ncheta na ndị omekóòmè nọrọ na nsonso a wee tụọ ka égbé, gbuo otu onye, ma tọrọ mmadụ iri anọ na abụọ, nke gụnyere ụmụakwụkwọ dị iri abụọ na asaa n'ọnụọgụgụ, ndị nkuzi atọ na ụmụnne ụfọdụ ndị na-arụ ọrụ n'ụlọakwụkwọ ahụ; bụzị nke mere onyeisiala Muhammadu Buhari jiri nye ntụziaka ka a nwụchie ndị kpara ajọ agwa ahụ ma zọpụtakwa ndị ahụ a tọọrọ ozigbo ozigbo.

O mezịrị ka a mara na ọ bụ n'ịgbasò ntụziaka ahụ ka e jiri kwadobe ya bụ ụgbọelu (nwere akàrà Beechcraft KingAir B350i) ịbagide na nnyocha na mpaghara steeti Niger na gburugburu ya, iji chọpụta ebe e zoro ndị ahụ ma zọpụtakwa ha; o wee zute ya bụ ajọ ihe mberede.

O mere ka a mara na mmadụ asaa niile nọ n'ụgbọelu ahụ nwụrụ n'ihe mberede ahụ, ma kwuo na a na-enyo enyo na ọ bụ ngharịpụ njini nke ụgbọelu ahụ mere ya bụ ihe mberede jiri dapụta.

N'okwu ya banyere ajọ ọdachi ahụ, Minista na-ahụ maka njem ụgbọelu n'ala Nigeria, bụ Maazị Sirika Hadi kọwara nke ahụ dịka nke jọgburu onwe ya, ma nye ntụziaka ka e mee nnyocha miri emì banyere ya bụ ihe mberede na ihe kpatara ya. 

O kpekwazịrị ka mkpụrụobi ndị ahụ nwụrụ anwụ zuo ike na ndokwa.

Aha mmadụ asaa ahụ nwụrụ n'ime mberede ụgbọelu ahụ bụ Haruna Gadzama, Henry Piyo, Micheal Okpara, Bassey Etim, Olasunkanmi Olawunmi, Ugochukwu Oluka, na Adewale Johnson.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484