N'Anambra, A Malitela Ịkụtùsi Ihe Iwu Akwadoghị A Rụrụ n'Ala Gọọmenti

Aug 13, 2020 - 20:54
Jan 28, 2021 - 20:55
 0
N'Anambra, A Malitela Ịkụtùsi Ihe Iwu Akwadoghị A Rụrụ n'Ala Gọọmenti

By Izunna Okafor

Gọọmenti steeti Anambra amalitekwala ịgawanye n'ihu ịkụtusi ihe dị iche iche iwu akwadoghị ndị mmadụ rụnyere n'ala ya na mpaghara ebe dị iche iche na steeti ahụ.

Ọrụ ịkụtusi ihe ahụ bụ nke a bagidere site n'aka òtù ọrụ ahụ gọọmenti Anambra guzobere maka ịnapụtasị ala ya ndị mmadụ kpààrà na mpaghara ebe dị iche iche na steeti ahụ. Ụlọọrụ 'Anambra State Physical Planning Board', ụlọọrụ 'Operation Clean and Healthy Anambra (OCHA Brigade), nakwa ụlọọrụ nchekwa ndị ọzọ dị iche iche sonyere na ya bụ ọrụ ịlụtusi ihe ahụ.

Ya bụ otu nọrọ na nsonso wee buru ọrụ ahụ gaa Isu Anịọcha dị n'okpuru ọchịchị ime obodo 'Awka North', bụ ebe ha nọrọ wee kụtusie ụlọ na ihe ndị ọzọ dị iche iche iwu akwadoghị a rụnyere n'ebe iwu akwadoghị n'ala ụlọakwụkwọ 'Isu Aniocha Community Secondary School'. Ndị òtù ahụ bagidere na ya bụ ọrụ oge ha buru ụzọ dọchaa ndị ahụ aka na ntị banyere nke ahụ, ma makwara ha ọkwà na a ga-akụtusi ihe ndị ahụ.

Ihe karịrị akre ise n'ime ala ahụ bụ ala ụlọakwụkwọ ahụ, ma bụrụkwa nke ndị ahụ mabììrì, ree n'ụzọ iwu akwadòghị, ma na-arụzị ihe na ya aghara aghara.

N'okwu ya oge a kụtuchara ihe ndị ahụ, onyeisi ụlọọrụ 'Anambra State Physical Planning Board', bụ Maazị Chike Maduekwe mere ka a mara na ha bagidere na ya bụ ọrụ oge ha dọchara ndị ahụ aka na ntị banyere nke ahụ, ma machaara ha ọkwa ka ha wepu ihe ndị ahụ.

Oge ọ na-akatọ ma na-agbarụ ihu banyere etu ndị mmadụ si akachi ntị na-akparasị ala gọọmenti aghara-aghara na mpaghara ebe dị iche iche n'agbanyeghị ọkwa niile gọọmenti na-ama megide nke ahụ, o kwuru na gọọmenti agaghị ada mbà n'ịkụtusi ihe ndị ahụ, ruo mgbe ha napụtachara ala gọọmenti ndị mmadụ zùùrù n'ohi na mpaghara ebe dị iche iche na steeti ahụ, 

Ọ dọkwazịrị ndị na-eme ihe dị etu ahụ ka ha sepụ aka na ya n'ihi na gọọmenti steeti ahụ wàtàrà ọgọdụ ịnapụtacha ya ala niile ha kpaara.

Ọ dụkwazịrị ndị na-arụ ụlọ na ihe ndị ọzọ ka ha gbaa mbọ na-enweta ikike na nkwàdo site n'aka gọọmenti tupu ha amalite ịrụ ihe ọbụla ha na-arụ, maka ịkwa ngara m mara n'oge ikpeazụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.