Onye Ogbuo Ọwara Ọsọ Akụgbuola Otu Nwaanyị n'Ọnịtsha

Aug 13, 2020 - 20:52
Jan 28, 2021 - 20:53
 0
Onye Ogbuo Ọwara Ọsọ Akụgbuola Otu Nwaanyị n'Ọnịtsha

By Izunna Okafor

Ọ bụ nnọọ ihe ịgba anyammiri n'ụtụtụ ụbọchị Wenezdee, dịka dịka otu onye ogbuo ọwara ọsọ jiri ụgbọala kọtuo otu nwaanyị na-agara onwe ya n'Ọnịtsha.

Dịka ozi e wepụtara site n'aka onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ụlọọrụ 'Federal Road Safety Corps, FRSC' (ngalaba steeti Anambra) bụ Maazị Paschal Anigbo siri kọwaa, ya bụ ihe mberede okporo ụzọ bụ nke mere n'isi njikọ ụzọ Okpoko dị n'Ọnịtsha, na mpaghara ụzọ awara-awara ahụ siri Enugu gaa Ọnịtsha.

O mere ka a mara na ya bụ ajọ ihe mberede dapụtara n'ihi ịgba oke ọsọ, ma bụrụkwa nke mere n'elekere asatọ nke ụtụtụ oge otu onye na-anya ụgbọala jiri oke ọsọ wee kụtuo otu nwaanyị n'agara onwe ya n'ụzọ, ma jirikwa oke ọsọ fee ka nnụnụ, larie, nke na o nweghịzịkwa onye hụrụ ya anya ọzọ ma ya fọdụzie ịma ihe ọbụla banyere ya maọbụ ụgbọala ya.

Akụkọ kọrọ na ndị nọ nso oge ya bụ ihe mere gbagara ebe ahụ ozigbo ma buru nwaanyị ahụ buga ya ụlọọgwụ Toronto dị n'Ọnịtsha ahụ, bụ ebe dọkịta nọrọ wee lelechaa ya ahụ, wee kwuo na ụkwa a na-apị, na mkpụrụ adịghị ya, nke pụtara na ya bụ nwaanyị alaala mmụọ.

Ka ọ dị ugbua, a dọnyezịrị ozu nwaanyị ahụ n'ụlọ nchekwa ozu dịkwa n'otu ụlọọgwụ ahụ.

N'akụkọ dịkwa ka ibe ya, oke ihe mberede ọzọ dapụtakwara n'akụkụ otu ọdụ mmanụ ụgbọala dị n'Ihiala, n'okpuru ọchịchị ime obodo Ihiala nke steeti Anambra, na mpaghara ụzọ awara-awara ahụ siri Ihiala gaa Ọnịtsha.

Ya bụ ihe mberede okporo ụzọ bụ nke dapụtara oge ụgbọala abụọ — 'Toyota Hiace' (nwere akàrà CAL15XJ) na 'Actros Tanker' (nwere akàrà FGG176YU) kwòkọrọ isi ọnụ, ma bụrụkwa nke metụtara mmadụ iri na ise (ụmụnwnwoke isii na ụmụnwaanyị iteghete) nọ n'ime ụgbọala ahụ oge ya bụ ihe mere.

Mmadụ iri n'ime ha (ụmụnwoke anọ na ụmụwaanyị isii) nwetàra nnukwu mmerụahụ n'ụdị dị iche iche, oge ya bụ ihe mberede mere; mana o nweghị onwe ọbụla tụfuru ndụ ya.

Ndị ahụ bụzị ndị e buuru wee gaa ụlọ ahụ ike 'Our Lady of Lourdes Hospital Ihiala' maka nlekọta na inye ha ọgwụgwọ.

N'okwu ya banyere nke ahụ, onyeisi ụlọọrụ FRSC na steeti Anambra, bụ Maazị Andrew A. Kumapayi kasìri ezinụlọ onye nke ha nwụrụ obi ma kpee ka Chineke nabata mkpụrụobi nwaanyị ahụ nwụrụ anwụ ma mekwa ka o zuru ike na ndokwa. O kpekwara ka ndị nke nwetara mmerụahụ gbakerechaa nke ọma n'oge adịghị anya.

Ọ kpọkuzịkwara ndị na-anya ụgbọala ka ha kwụsị ịgba oke ọsọ, ma nye ndị ji ụkwụ aga ndụmọdụ ka ha na-esi n'ebe ahụ a rụrụ maka ndị ji ụkwụ wee na-agafe oge ọbụla, karịa ịgbafe n'etiti iro, n'ihi na ọ bụ ihe ndị ahụ na-ewetakarị ihe mberede okporo ụzọ na ọnwụ mberede.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.